Read Abù Ọma Chapter 77 Online
Read Abù Ọma Chapter 77 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Abù Ọma 77
Isi 77
1. Olum ka m'nēji etiku Chineke, m'gēti kwa nkpu; Olum ka m'nēji etiku Chineke, Ọ gāṅakwam nti.
2. N'ubọchi nkpab͕um Onye-nwe-ayi ka m'chọrọ: Akam setiri eseti n'abali, o sinwukwaghi; Nkpuru-obim juru ka akasie ya.
3. M'gēcheta Chineke, su kwa ude nke-uku: M'gātughari uchem, ọzọ, mọm adighi-enwe ike. Selah
4. I jidere ndi-nche nke anyam abua: Ọ b͕aram ghari, m'we ghara ikwu okwu.
5. Echèrem èchìchè bayere ubọchi nile nke mb͕e ochie, Bú arọ nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga, si,
6. M'gēcheta abù m'nābù n'ikpọ ubọ-akwara n'abali: M'gēso obim tughari uche; Mọm we chọsie ike, si,
7. Ọ̀ bu rue mb͕e nile ebighi-ebi ka Onye-nwe-ayi gāju aju? Ọ̀ bu na ihem agaghi-atọ kwa Ya utọ ọzọ?
8. Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya gwuchapuworo? Ọ̀ gwusiwo, bú okwu-Ya, rue ọb͕ọ nile?
9. Ọ̀ chezọwo ime amara, bú Chineke? Ò kpuchitawo obi-ebere-Ya nile n'iwe? Selah
10. M'we si, Ọriam ka nka bu; Ma m'gēcheta arọ nile nke aka-nri nke Onye kachasi ihe nile elu.
11. M'gēhota omume nile nke Ja; N'ihi na m'gēcheta oké ọlu-Gi nile site na mb͕e ochie.
12. M'gātughari kwa uche n'ọlu-Gi nile, Ọ bu kwa n'omume-Gi nile ka m'gātughari obi.
13. Chineke, n'idi-nsọ ka uzọ-Gi di: Ònye bu chi uku dika Chineke?
14. Gi onwe-gi bu Chineke Nke nālu oké ọlu: I mewo ka amara ike-Gi n'etiti ndi nile di iche iche.
15. I jiwo ogwe-aka-gi b͕aputa ndi-Gi, Bú umu Jekob na Josef. Selah
16. Miri huru Gi, Chineke; Miri huru Gi, o nēb͕u ha nb͕u: Ọzọ, ob͕u-miri nile mara jijiji.
17. Igwe-oji nile wupuru miri; Mbara-ígwé mere ka olu-ha da udà: Ọzọ, àkú-gi nile nēfeghari.
18. Olu nke éb͕è-elu-igwe-Gi di n'ifufe nēfeghari buruburu; Àmùmà nyere elu-uwa dum madu bi ìhè: Ala mere nkpatu ma kwa jijiji.
19. N'oké osimiri ka uzọ-Gi di, Uzọ-ije-Gi nile di kwa n'ọtutu miri, Amaghi kwa nzọ-ukwu-Gi nile.
20. I duru ndi-Gi dika ìgwè ewu na aturu, Site n'aka Moses na Eron.
About Abù Ọma Chapter 77
Read Abù Ọma Chapter 77 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Abù Ọma
Chapter: 77
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Abù Ọma Chapter 77 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Abù Ọma Chapter 77?
Abù Ọma Chapter 77 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 77 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Abù Ọma
- Abù Ọma Chapter 10
- Abù Ọma Chapter 3
- Abù Ọma Chapter 146
- Abù Ọma Chapter 98
- Abù Ọma Chapter 112
- Abù Ọma Chapter 147
- Abù Ọma Chapter 80
Explore More from Agba Ochie
- Jenesis Chapter 11
- Jeremaia Chapter 10
- Emos Chapter 1
- Abù Ọma Chapter 130
- Jeremaia Chapter 11
- Levitikọs Chapter 24
- Jenesis Chapter 39