Ilu Chapter 21

For English

Read Ilu Chapter 21 Online

Read Ilu Chapter 21 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ilu 21

Isi 21

1. Iyi di iche iche nke juputara na miri ka obi eze bu n'aka Jehova: N'ebe ọ bula nke nātọ Ya utọ ka Ọ nēwezuga ya.

2. Uzọ ọ bula nke onye ọ bula ziri ezi n'anya-ya abua: Ma onye nātùzi obi nile ka Jehova bu.

3. Ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe Bu ihe Jehova nārọputa kari àjà.

4. Anya npako na obi di nganga, Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie.

5. Èchìchè nile nke onye di nkọ nēdubà nání n'urù: Ma èchìchè nile nke onye ọ bula nke nēme ngwa nēdubà nání n'ikọ-ukọ.

6. Ikpa àkù site n'ire okwu-ugha Bu otù nku-ume anēfesa n'ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwu.

7. Ipunara-madu-ihe nke ndi nēmebi iwu gēkpochapu ha; N'ihi na ha juru ime ihe ekpere n'ikpe.

8. Ihe b͕agọrọ ab͕agọ nke-uku ka uzọ onye ikpe mab͕uru ya bu: Ma onye di ọcha n'obi, ọlu-ya ziri ezi.

9. Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo, Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.

10. Nkpuru-obi nke onye nēmebi iwu nāchọsi ihe ọjọ ike: Madu-ibe-ya abughi onye imere amara n'anya-ya.

11. Mb͕e anēri onye nākwa emò nra, anēme ka onye nēnweghi uche mara ihe: Ọzọ, mb͕e anēme ka onye nke mara ihe nwe uche, ọ nānara ihe-ọmuma.

12. Onye ezi omume nēnwe uche n'imeso ulo nke onye nēmebi iwu; Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n'ihi ihe ọjọ ha.

13. Onye nēkwuchipu nti-ya n'iti-nkpu nke onye nēnweghi ike, Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya.

14. Onyinye enyere na nzuzo nādaju iwe, Iri-ngo ezobere n'uwe-obi nādaju kwa ọnuma siri ike.

15. Ọ buru onye ezi omume ọṅù ime ihe ekpere n'ikpe; Ma nbibi diri ndi nālu ajọ ihe.

16. Madu nke nēsi n'uzọ ezi uche akpafu, Nime nkpọkọta nke ndi nādighi ndu ka o gēzu ike.

17. Onye ihe kọrọ ka onye nāhu ọṅù n'anya gābu: Onye nāhu manya-vine na manu n'anya agaghi-abu ọgaranya.

18. Ihe-nb͕aputa ib͕aputa onye ezì omume ka onye nēmebi iwu bu; Ọzọ, n'ọnọdu ndi ziri ezi ka onye nāghọb͕u aghọb͕u nọ.

19. Ọ di nma inọ n'ala bú nání ọzara, Kari inọyere nwayi nēse okwu nākpasu kwa iwe.

20. Àkù anāchọsi ike na manu di n'ebe-obibi nke onye mara ihe; Ma madu nzuzu nēloda ya.

21. Onye nāb͕aso ezi omume na ebere Nāchọta ndu, na ezi omume, na nsọpuru.

22. Obodo ndi-dike ka onye nke mara ihe rigobàworo, O we me ka ike nke ikwesi-ntukwasi-obi-ya rida.

23. Onye nēdebe ọnu-ya na ire-ya Nēdebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n'ahuhu nile.

24. Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya, Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga.

25. Ọchichọ siri ike nke onye-ume-ngwu nēme ka ọ nwua; N'ihi na aka-ya abua juru ilu ọlu.

26. Ogologo ubọchi nile ka ọ chọsiworo ihe ike nke-uku: Ma onye ezi omume nēnye, ọ dighi-eb͕ochi kwa aka-ya inye ihe.

27. Àjà nke ndi nēmebi iwu bu ihe-árú: O gēsi kwa aṅa ghara ibu ihe-árú kari, mb͕e o ji nzube ọjọ weta ya?

28. Onye-àmà okwu-ugha gāla n'iyì: Ma onye nānu, rue mb͕e ebighi-ebì ka o gēkwu.

29. Onye nēmebi iwu emewo ka iru-ya sie ike: Ma onye ziri ezi, onye ahu nēdozi uzọ-ya nile.

30. Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.

31. Inyinya bu ihe anēdoziri ubọchi agha: Ma Jehova nwe nzọputa.

About Ilu Chapter 21

Read Ilu Chapter 21 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ilu
Chapter: 21
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ilu Chapter 21 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ilu Chapter 21?

Ilu Chapter 21 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ilu Chapter 21 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Eklisiastis Chapter 2

Explore More from Ilu

  1. Ilu Chapter 17
  2. Ilu Chapter 6
  3. Ilu Chapter 10
  4. Ilu Chapter 28
  5. Ilu Chapter 16
  6. Ilu Chapter 7
  7. Ilu Chapter 26

Related Chapters & Readings

  1. Aisaia Chapter 11
  2. Ọpupu Chapter 8
  3. Abù Ọma Chapter 4
  4. Abù Ọma Chapter 80
  5. I. Ihe Emere Chapter 28
  6. Emos Chapter 1
  7. II. Ihe Emere Chapter 15
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *