Abù Ọma Chapter 107

For English

Read Abù Ọma Chapter 107 Online

Read Abù Ọma Chapter 107 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Abù Ọma 107

Isi 107

1. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2. Ka ndi Jehova b͕aputaworo nāsi otú a, Bú ndi Ọ b͕aputaworo n'aka onye-nkpab͕u;

3. O si-kwa-ra n'ala nile chikọputa ha, Site n'Iru-anyanwu na site n'Ọdida-anyanwu, Site n'Ugwu na site n'oké osimiri.

4. Ha fughariri n'ọzara n'uzọ nke bu nání ala tọb͕ọrọ n'efu; Ọ dighi obodo obibi ha chọtara.

5. Ndi agu nāgu na ndi akpiri nākpọ nku ka ha bu, Nkpuru-obi-ha adighi-enwe ike nime ha.

6. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we naputa ha n'aka nkpà-ha nile.

7. O me-kwa-ra ka ha zọ ije n'uzọ ziri ezi, Ijeru obodo obibi.

8. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

9. N'ihi na O mewo ka afọ ju nkpuru-obi nāchọsi ihe ike, Ọ bu kwa nkpuru-obi agu nāgu ka O nyejuworo ezi ihe.

10. Ndi nānọdu n'ọchichiri na onyinyo ọnwu, Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n'ala na ígwè;

11. N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru okwu Chineke, Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu:

12. O we me ka obi-ha ruru ala n'idọb͕u onwe-ha n'ọlu; Ha suru ngọngọ, ọ dighi kwa onye nēyere ha aka.

13. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we zọputa ha n'aka nkpà-ha nile.

14. O nēme ka ha si n'ọchichiri na onyinyo ọnwu puta, Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha.

15. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

16. N'ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla, B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè.

17. Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche neweda onwe-ha n'ala Site n'uzọ njehie-ha na site n'ajọ omume nile ha.

18. Ihe-oriri nile ọ bula ka nkpuru-obi-ha nākpọ ihe-árú; Ha we biarue nso ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu.

19. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we zọputa ha na nkpà-ha nile.

20. O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma, O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha.

21. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

22. Ka ha chu kwa àjà nile nke ekele, Were kwa iti-nkpu-ọṅù kọ akukọ ọlu-Ya nile.

23. Ndi nārida n'oké osimiri n'ub͕o, Bú ndi nēje ozi n'ọtutu miri;

24. Ndi ahu ahuwo ọlu nile nke Jehova, Na oké ọlu-Ya nile nime miri nke miri emi.

25. N'ihi na Ọ nēkwu okwu, O we me ka oké ifufe guzo ọtọ, Nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu.

26. Ha nārigoru elu-igwe, ha nāridaru ob͕u-miri nile: Nkpuru-obi-ha nālọ miri site n'ọnọdu ọjọ ha.

27. Ha nādaghari, nāṅaghari kwa dika onye ṅubigaworo manya ókè, Amam-ihe-ha nile nāla kwa n'iyì.

28. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, Ọ we me ka ha puta na nkpà-ha nile.

29. Ọ nēme ka oké ifufe guzo n'idere du, Nmali-miri-ya nile we b͕a nkiti.

30. Ha we ṅuria, n'ihi na ha nādaju; O we durue ha n'ótú nātọ ha utọ.

31. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

32. Ka ha me kwa Ya ka Ọ di elu nime nkpọkọta ndi-Ya, Ka ha to kwa Ya nime nnọkọ ndi-okenye.

33. O nēme ka osimiri ghọ ọzara, O nēme kwa ebe miri nāsuputa ka ha ghọ ala kpọro nku;

34. Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú, Site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme.

35. Ọ nēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri, Ọ nēme kwa ka ala nke kpọrọ nku ghọ ebe miri nāsuputa.

36. O we me ka ndi agu nāgu biri n'ebe ahu, Ha we dozie obodo obibi;

37. Gha nkpuru n'ubi, kua ubi-vine di iche iche, Nweta nkepuru nke ihe-ọmume.

38. Ọ nāgọzi kwa ha, ha we ba uba nke-uku; Ọ dighi-eme kwa ka anu-ulo-ha bilata.

39. Ọzọ, ha nēbilata, we ruda n'ala, Site na nmeb͕u, na ihe ọjọ, na iru-újú.

40. Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha, We me ka ha kpafue nebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe uzọ nādighi.

41. Ọzọ, Ọ nēme ka ob͕eye si na nweda-n'ala nọ n'ebe di elu, Ọ nēme kwa ka ọ ghọ ab͕uru dika ìgwè ewu na aturu.

42. Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria; Ma ajọ omume nile ekpuchiwo ọnu-ya.

43. Onye ọ bula nke mara ihe gāriba kwa ihe ndia ama, Ha gātukwasi kwa uche n'ebere nile nke Jehova.

About Abù Ọma Chapter 107

Read Abù Ọma Chapter 107 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Abù Ọma
Chapter: 107
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Abù Ọma Chapter 107 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Abù Ọma Chapter 107?

Abù Ọma Chapter 107 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 107 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Abù Ọma

  1. Abù Ọma Chapter 146
  2. Abù Ọma Chapter 10
  3. Abù Ọma Chapter 3
  4. Abù Ọma Chapter 98
  5. Abù Ọma Chapter 47
  6. Abù Ọma Chapter 112
  7. Abù Ọma Chapter 92

Explore More from Agba Ochie

  1. Jeremaia Chapter 40
  2. Abù Ọma Chapter 147
  3. Jenesis Chapter 25
  4. Aisaia Chapter 21
  5. Abù Ọma Chapter 146
  6. Daniel Chapter 12
  7. Abù Ọma Chapter 145

Related Chapters & Readings

  1. Maika Chapter 3
  2. I. Ihe Emere Chapter 4
  3. Jeremaia Chapter 18
  4. Ezra Chapter 3
  5. Maika Chapter 5
  6. I. Samuel Chapter 30
  7. Ọnu-Ọgugu Chapter 9
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *