Read Abù Ọma Chapter 135 Online
Read Abù Ọma Chapter 135 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Abù Ọma 135
Isi 135
1. Tonu Ja. Tonu aha Jehova; Tonu Ya, ndi-orù Jehova:
2. Ndi nēguzo n'ulo Jehova, N'ogige nile nke ulo Chineke-ayi.
3. Tonu Ja; n'ihi na Jehova di nma: Bùkuenu aha-Ya abù ọma; n'ihi na ọ di utọ.
4. N'ihi na Jekob ka Ja rọputaworo nye Onwe-ya, Ọ rọputara Israel ka ọ buru ihe nke aka Ya.
5. N'ihi na mu onwem amawo na Jehova di uku, Onye-nwe-ayi di kwa elu kari chi nile.
6. Ihe nile nke tọrọ Jehova utọ, nke ahu ka O meworo, N'elu-igwe, na n'uwa, na n'oké osimiri nile, na ob͕u-miri nile.
7. Ọ bu Onye nēme ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà; Ọ bu Onye nēme ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta.
8. Onye tib͕uru umu eburu uzọ mu n'ala Ijipt, Ma ọ bu madu ma-ọbu anu-ulo.
9. O zitere ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n'etiti gi, Ijipt, N'aru Fero, na n'aru ndi-orù-ya nile.
10. Onye tib͕uru ọtutu mba, B͕u kwa ndi-eze di ike;
11. Bú Saihon eze ndi-Amorait, Na Og eze Beshan, Na ala-eze nile nke Kenean:
12. Ọ we nye ala-ha ibu ihe-nketa, Iburu Israel, bú ndi-Ya, ihe-nketa.
13. Jehova, aha-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi; Jehova, ncheta-Gi nādiru ọb͕ọ nile.
14. N'ihi na Jehova gēkpe ndi-Ya ikpe, Chèghari kwa uche-Ya bayere ndi-orù-Ya.
15. Arusi nile nke mba nile bu ọla-ọcha na ọla-edo, Ọlu aka madu.
16. Ha nwere ọnu ma ha adighi-ekwu okwu; Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ;
17. Ha nwere nti abua, ma ha adighi-aṅa nti; Ọ dighi kwa iku-ume di n'ọnu-ha.
18. Ndi nēme ha gādi ka ha; E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.
19. Ulo Israel, gọzienu Jehova: Ulo Eron, gọzienu Jehova:
20. Ulo Livai, gọzienu Jehova: Unu ndi nātu egwu Jehova, gọzienu Jehova.
21. Onye agọziri agọzi ha Jehova bu site na Zaion, Onye bi na Jerusalem. Tonu Ja.
About Abù Ọma Chapter 135
Read Abù Ọma Chapter 135 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Abù Ọma
Chapter: 135
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Abù Ọma Chapter 135 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Abù Ọma Chapter 135?
Abù Ọma Chapter 135 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 135 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Abù Ọma
- Abù Ọma Chapter 10
- Abù Ọma Chapter 3
- Abù Ọma Chapter 146
- Abù Ọma Chapter 98
- Abù Ọma Chapter 112
- Abù Ọma Chapter 147
- Abù Ọma Chapter 80
Explore More from Agba Ochie
- Abù Ọma Chapter 149
- Abù Ọma Chapter 27
- I. Samuel Chapter 8
- Nehum Chapter 1
- Ọpupu Chapter 13
- II. Ihe Emere Chapter 11
- Jeremaia Chapter 34