Abù Ọma Chapter 18

For English

Read Abù Ọma Chapter 18 Online

Read Abù Ọma Chapter 18 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Abù Ọma 18

Isi 18

1. Anamahu Gi n'anya nke-uku, Jehova, bú ikem.

2. Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu; Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum.

3. Onye anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova: Ewe zọputam n'aka ndi-irom.

4. Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu, Miri-iyi nile nke ihe jọb͕uru onwe-ya nēme kwa ka m'tua egwu.

5. Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu: Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum.

6. Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam, Ọ bu Chinekem ka m'nētiku: O nēsi n'ulo uku Ya nu olum, Nkpu m'tikuru Ya we ba na nti-Ya abua.

7. Ala we me nkpatu ma kwa jijiji, Ntọ-ala nile nke ugwu nile nāma kwa jijiji, Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.

8. Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya, Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia: Afunwuru icheku site na ya.

9. O rulata-kwa-ara elu-igwe, rida; Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua.

10. O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we felie: O we fesie ike n'elu nkù ìfùfè.

11. Ọ nēdo ọchichiri ka ọ buru ebe-nzuzo-Ya, ka ọ buru ulo-ntu-Ya nke di Ya buruburu; Bú ọchichiri miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.

12. Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya igwe-oji-Ya nile nke b͕ara ochichiri gabigara, Akú-miri-ígwé na icheku ọku.

13. Jehova we ma éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe, Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa ka olu-Ya da; Ákú-miri-ígwé na icheku ọku.

14. O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa; Ọtutu àmùmà kwa, O we chusa ha.

15. Ewe hu ebe nile miri si erù, Anēkpughe kwa ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi, Site n'ibasi-nba-ike-Gi, Jehova, Site nume nke iku-ume nke imi-Gi.

16. O si n'elu zìe, kurum, Dọputam n'ọtutu miri.

17. Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike, Na n'aka ndi nākpọm asì, n'ihi na ha nwere ume karim.

18. Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam: Ma Jehova burum ihe-ndabere.

19. O we me ka m'puta rue ebe sara mbara; Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ.

20. Jehova nēnyeghachim dika ezi omumem si di; Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka O nēmeghachim ọzọ.

21. N'ihi na edebewom uzọ nile nke Jehova, Emebighikwa m iwu n'ipu n'aka Chinekem.

22. N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum, Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga ha n'ebe m'nọ.

23. M'we zue okè n'ebe Ọ nọ, Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajo omumem.

24. Jehova we meghachim dika ezi omumem si di, Dika idi-ọcha akam abua n'anya-Ya si di.

25. N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere; N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;

26. N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha; Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi onye-nb͕á.

27. N'ihi na Gi onwe-gi gāzọputa ndi ewedara n'ala; Ma anya npako, I gēme ka ha di ala.

28. N'ihi na Gi onwe-gi gāmuye oriọnam: Jehova, bú Chinekem, nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.

29. N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe; Anamesite kwa na Chinekem wubiga mb͕idi.

30. Chineke, uzọ-Ya zuru okè: Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha; Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.

31. N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova? Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?

32. Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké, Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè.

33. O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele: N'elu ebem di elu ka O nēguzokwam.

34. O nēzi akam abua ibu agha; Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.

35. I nyewokwam ọta nzọputa-Gi: Aka-nri-Gi nākwagidekwam, Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.

36. I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum, Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.

37. Anamachu ndi-irom, we rue ha aru: Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.

38. Anam akwatu kwa ha, ha apughi kwa ibili ọzọ: Ha nāda n'okpuru ukwum abua.

39. I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha: I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.

40. Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.

41. Ha nēti nkpu ka eyere ha aka, ma ọ dighi onye nāzọputa ha: Ha nētiku Jehova, ma Ọ zaghi ha.

42. Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe: Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha.

43. I nēme ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim; I nēdom onye-isi mba nile ọzọ Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.

44. Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti: Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum.

45. Ndi ala ọzọ nāta aru, Ma jijiji, si n'ebe-nmechibido-ha puta.

46. Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa; Chineke nke nzọputam di kwa elu:

47. Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀, We duru ndi di iche iche bia n'okpurum.

48. Ọ nēme ka m'baputa n'aka ndi-irom: I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem: I nānaputam n'aka madu nēme ihe-ike.

49. N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba nile, Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.

50. Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku; Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere, Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere, rue mb͕e ebighi-ebi.

About Abù Ọma Chapter 18

Read Abù Ọma Chapter 18 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Abù Ọma
Chapter: 18
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Abù Ọma Chapter 18 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Abù Ọma Chapter 18?

Abù Ọma Chapter 18 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 18 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Abù Ọma

  1. Abù Ọma Chapter 3
  2. Abù Ọma Chapter 146
  3. Abù Ọma Chapter 10
  4. Abù Ọma Chapter 98
  5. Abù Ọma Chapter 92
  6. Abù Ọma Chapter 47
  7. Abù Ọma Chapter 112

Explore More from Agba Ochie

  1. Zekaraia Chapter 1
  2. Jenesis Chapter 13
  3. Job Chapter 22
  4. II. Samuel Chapter 10
  5. Ọpupu Chapter 21
  6. Abù Ọma Chapter 29
  7. I. Ndi-Eze Chapter 13

Related Chapters & Readings

  1. Jeremaia Chapter 3
  2. Maika Chapter 6
  3. Ọpupu Chapter 36
  4. Jeremaia Chapter 6
  5. Jeremaia Chapter 15
  6. Abù Ọma Chapter 66
  7. Ezikiel Chapter 37
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *