Abù Ọma Chapter 118

For English

Read Abù Ọma Chapter 118 Online

Read Abù Ọma Chapter 118 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Abù Ọma 118

Isi 118

1. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2. Biko, ka Israel si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

3. Biko, ka ulo Eron si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

4. Biko, ka ndi nātu egwu Jehova si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

5. M'siri na nkpàm kpọkue Ja; Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara.

6. Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu: Gini ka madu gēmem?

7. Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka: Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì.

8. Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi madu obi.

9. Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi ndi amara aha-ha obi.

10. Mba nile ab͕awom buruburu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.

11. Ha ab͕awom buruburu; e, ha ab͕awom buruburu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.

12. Ha ab͕awom buruburu dika aṅu; emenyuwo ha dika ọku ogwu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.

13. I nudawom enuda ka m'we da: Ma Jehova yerem aka.

14. Ikem na abù ọmam ka Ja bu: Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa.

15. Olu nke iti-nkpu-ọṅù na nzọputa di n'ulo-ikwū nile nke ndi ezi-omume: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.

16. Ebuliwo aka-nri Jehova elu: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.

17. M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu, M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja.

18. Ja adọwom aka na nti nke-uku: Ma ọ bughi n'aka ọnwu ka O nyeworom.

19. Megherenum ọnu-uzọ-ama nile nke ezi omume: M'gābà nime ha, m'gēkele Ja.

20. Nka bu ọnu-uzọ-ama Jehova nwere; Ndi ezi omume gābà nime ya.

21. M'gēkele Gi, n'ihi na I zawom, I we ghọrọm nzọputa.

22. Nkume nke ndi nēwu ulo juru Aghọwo isi nkuku ulo.

23. Ọ bu n'aka Jehova ka nka sitere; Nke ahu bu oké ọlu n'anya-ayi.

24. Nka bu ubọchi Jehova meworo; Ayi gētegari egwú ọṅù, ṅuri kwa ọṅu nime ya.

25. Biko, Jehova, zọputa, biko: Biko, Jehova, me ka ihe nāgara ayi nke-ọma, biko.

26. Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Jehova: Ayi esiwo n'ulo Jehova gọzie unu.

27. Chineke ka Jehova bu, Ọ nyewo kwa ayi ìhè: Chiri udọ̀ ke àjà-ememe, durue ya na mpi nile nke ebe-ichu-àjà.

28. Chinekem ka I bu, m'gēkele kwa Gi: Chinekem ka I bu, m'gēbuli Gi elu.

29. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

About Abù Ọma Chapter 118

Read Abù Ọma Chapter 118 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Abù Ọma
Chapter: 118
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Abù Ọma Chapter 118 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Abù Ọma Chapter 118?

Abù Ọma Chapter 118 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 118 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Abù Ọma

  1. Abù Ọma Chapter 3
  2. Abù Ọma Chapter 146
  3. Abù Ọma Chapter 10
  4. Abù Ọma Chapter 98
  5. Abù Ọma Chapter 92
  6. Abù Ọma Chapter 47
  7. Abù Ọma Chapter 112

Explore More from Agba Ochie

  1. Ọnu-Ọgugu Chapter 28
  2. Jeremaia Chapter 42
  3. Job Chapter 33
  4. Jenesis Chapter 33
  5. I. Samuel Chapter 7
  6. II. Samuel Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 45

Related Chapters & Readings

  1. I. Ihe Emere Chapter 11
  2. Luk Chapter 14
  3. Nehemaia Chapter 12
  4. I. Ndi Tesalọnaika Chapter 3
  5. I. Ihe Emere Chapter 15
  6. Ezra Chapter 5
  7. Abù Ọma Chapter 119
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *