Read Job Chapter 3 Online
Read Job Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Job 3
Isi 3
1. Mb͕e ihe a gasiri, Job saghere ọnu-ya, kọcha ubọchi-ya.
2. Job we za, si:
3. Ka ubọchi nke amurum nime ya la n'iyì, Ya na abali ahu nke siri, Aturu ime nwa-nwoke.
4. Ka ubọchi ahu ghọ ọchichiri; Ka Chineke ghara isi n'elu ju ase ya, Ka ìhè ghara kwa imukwasi ya.
5. Ka ọchichiri na onyinyo ọnwu b͕aputa ya; Ka igwe-oji biri n'elu ya; Ka ihe nile nke nēme ka ubọchi b͕a ọchichiri me ka ọ tua egwu nke-uku.
6. Abali ahu, ka oké ọchichiri jide ya: Ka ọ ghara iṅuri ọṅu n'etiti ubọchi nile nke arọ; Ka ọ ghara ibata n'ọnu-ọgugu ọnwa.
7. Le, ka abali ahu ghọ nwayi-àgà; Ka iti-nkpu-ọṅù ghara ibà nime ya.
8. Ka ha bua ya ọnu, bú ndi nābu ubọchi ọnu, Ndi nọ na njikere ikpọte leviathan.
9. Ka kpakpando nile nke emumechi-ya b͕a ọchichiri: Ka ọ le anya ìhè, ìhè adighi kwa; Ka ọ ghara ile mbuboro-anya nke chi-ọbubọ anya:
10. N'ihi na o mechighi ọnu-uzọ afọ nke m'si nime ya puta, O zopughi kwa ọnọdu ọjọ n'anyam.
11. N'ìhi gini ka m'nēsighi n'àkpà-nwa nwua? N'ìhi gini ka m'nāputaghi n'afọ kubìe ume?
12. Gini mere ikperè abua di n'irum inaram? Ma-ọbu ara, ka m'we ṅua?
13. N'ihi na ub͕u a ka m'gēdinawori di jū M'gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim:
14. Mu na ndi-eze na ndi-ndum-ọdu nke uwa, Ndi nēwuru onwe-ha nkpọnkpọ ebe;
15. Ma-ọbu mu na ndi-isi ndi nwere ọla-edo, Ndi nēmeju ulo-ha n'ọla-ọcha:
16. Ma-ọbu gini mere m'nādighi ka nwa amukworo amukwo nke ezoworo ezo; Dika umu ọhu nke nāhughi ìhè?
17. N'ebe ahu ka ndi nēmebi iwu rapuworo ime nkpatu; Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi ike gwuru nēzu ike.
18. N'ebe ahu ka ndi-nkpọrọ nānọkọ jū; Ha anughi olu ndi nāchi ha n'ihe-ike.
19. Onye ntà na onye uku nọ n'ebe ahu, ha abua; Orù apuwo kwa n'aka onye-nwe-ya nwere onwe-ya.
20. N'ìhi gini ka O nēnye onye nọ n'ọnọdu ọjọ ìhè? N'ìhi gini kwa ka O nēnye ndi nkpuru-obi-ha di ilu ndu?
21. Ndi nēchere ọnwu, ma ọ dighi-abia; Ha nēgwu kwa ala-ya kari àkù zoro ezo;
22. Ndi nāṅuri rue otite-egwú-ọṅù, Obi nātọ kwa ha utọ mb͕e ha chọtara ílì.
23. N'ìhi gini ka O nēnye nwoke nke ezoworo uzọ-ya ìhè, Bú onye Chineke b͕ochiwo-kwa-ra ya?
24. N'ihi na ọ bu tutu eriem nrim ka ize-umem nābia, Anāwusi kwa ọb͕ub͕ọ-ujam nile dika miri.
25. N'ihi na oké egwu ka m'turu, o we biakwasim, Ihe nke m'turu ujọ biakute-kwa-ram.
26. Anọghm n'udo, anọghkwam jū, ezughkwam ike; Ma ime-nkpatu biara.
About Job Chapter 3
Read Job Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Job
Chapter: 3
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Job Chapter 3 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Job Chapter 3?
Job Chapter 3 is part of the Book of Job in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Job Chapter 3 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5