Read Abù Ọma Chapter 102 Online
Read Abù Ọma Chapter 102 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Abù Ọma 102
Isi 102
1. Jehova, nuru ekperem, Ka ntikum ru kwa Gi nti.
2. Ezonarilam iru-Gi n'ubọchi ahuhu m'nāhu: Tọ nti-Gi n'ala n'ebe m'nọ; N'ubọchi m'nākpọku Gi zam ngwa ngwa.
3. N'ihi na ubọchim nile agwusiwo n'anwuru-ọku, Erechapuwo kwa ọkpukpum nile dika ọlọkọ-ọku.
4. Etib͕uwo obim dika ihe akuru n'ala, o we kpọnwua; N'ihi na echezọwom iri nrim.
5. Site n'olu ize-umem Ọkpukpum araparawo n'anu-arum.
6. Eyirim okwolo nke ọzara; Aghọwom ihe dika okwukwu nke nkpọnkpọ ebe.
7. Amuruwom anya, we ghọ Ihe dika nnunu ntà nke nání ya nọ n'elu-ulo.
8. Ogologo ubọchi nile ka ndi-irom nātam uta; Ndi nāwi ara imegidem ejiwom ṅua iyi.
9. N'ihi na eriwom ntu dika nri, Were kwa ikwa-ákwá gwakọta ihe-ọṅuṅum.
10. Site n'iwe-Gi na ọnuma-Gi: N'ihi na I buliwom elu, we tufuem.
11. Ubọchim nile di ka onyinyo nke nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu; Mu onwem nākpọnwu kwa dika ihe akuru n'ala.
12. Ma Gi onwe-gi, Jehova, nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi; Ncheta-Gi nādiru kwa ọb͕ọ nile.
13. Gi onwe-gi gēbili, nwe obi-ebere n'aru Zaion: N'ihi na mb͕e eruwo imere ya amara, n'ihi na mb͕e akara àkà abiawo.
14. N'ihi na nkume-ya nile nātọ ndi-orù-Gi utọ, Ha nēme-kwa-ra ájá-ya amara.
15. Mba nile gātu kwa egwu aha Jehova, Eze nile nke uwa gātu kwa egwu ebube-Gi:
16. N'ihi na Jehova ewuwo Zaion, O mewo Onwe-ya ka ahú Ya nime ebube-ya.
17. O chewo ekpere nke onye nēnweghi ihe iru, O ledaghi kwa ekpere-ha anya.
18. Agēde nka n'akwukwọ nye ọb͕ọ nēso n'azu: Ọzọ, otù ndi nke agēkè gēto Ja.
19. N'ihi na O siwo n'ebe di elu nke ebe nsọ Ya lepu anya; Jehova esitewo n'elu-igwe legide uwa anya;
20. Inu ize-ume nke onye-nkpọrọ; Itọpu ndi nāghaghi inwu anwu;
21. Ka ha we kọ akukọ aha Jehova nime Zaion, Kọ kwa akukọ otuto-Ya nime Jerusalem;
22. Mb͕e ndi nile di iche iche gāchikọta onwe-ha n'otù, Ha na ala-eze nile, ifè Jehova òfùfè.
23. O wedawo ikem n'uzọ; O bilatawo ubọchim nile.
24. Asirim, Chinekem, emela ka m'la n'elu n'etiti ubọchim nile: N'ọb͕ọ nile ka arọ-gi nādigide.
25. Na mb͕e ochie ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa; Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa.
26. Ha onwe-ha gāla n'iyì, ma Gi onwe-gi nēguzogide: Ha nile gāka kwa nká dika uwe; Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāb͕anwe ha, agāb͕anwe kwa ha:
27. Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile, Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu
28. Umu nke ndi-orù-Gi gēbigide, Nkpuru-ha gēguzosi ike n'iru Gi.
About Abù Ọma Chapter 102
Read Abù Ọma Chapter 102 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Abù Ọma
Chapter: 102
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Abù Ọma Chapter 102 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Abù Ọma Chapter 102?
Abù Ọma Chapter 102 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 102 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Abù Ọma
- Abù Ọma Chapter 10
- Abù Ọma Chapter 3
- Abù Ọma Chapter 146
- Abù Ọma Chapter 98
- Abù Ọma Chapter 112
- Abù Ọma Chapter 147
- Abù Ọma Chapter 80
Explore More from Agba Ochie
- Job Chapter 24
- Job Chapter 8
- Abù Ọma Chapter 106
- Zekaraia Chapter 8
- Jenesis Chapter 35
- Aisaia Chapter 5
- Jeremaia Chapter 34