Abù Ọma Chapter 109

For English

Read Abù Ọma Chapter 109 Online

Read Abù Ọma Chapter 109 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Abù Ọma 109

Isi 109

1. Chineke nke otutom, ab͕ala nkiti;

2. N'ihi na ọnu onye nēmebi iwu na ọnu aghughọ ka ha sagheworo megidem: Ha ewerewo ire okwu-ugha gwam okwu.

3. Ha ewerewo kwa okwu ikpọ-asì b͕am buruburu, We busom agha n'efu.

4. N'ọnọdu ihu-n'anya m'huru ha ha nēmegidem: Ma mu onwem nọ nēkpe ekpere.

5. Ha we tukwasim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Na ikpọ-asì n'ọnọdu ihu-n'anyam.

6. Me ka onye nēmebi iwu lekọta ya: Ka onye-nmegide guzo kwa n'aka-nri-ya.

7. Mb͕e anēkpe ya ikpe, ya puta ìhè na ọ bu onye ikpe mara; Ka ekpere-ya ghọ kwa nmehie.

8. Ka ubọchi-ya di ole-na-ole; Ka onye ọzọ nara ya ihe-nlekọta-ya.

9. Ka umu-ya buru umu-nb͕ei, Ka nwunye-ya buru nwayi di-ya nwuru.

10. Ka umu-ya nāṅaghari kwa mb͕e nile nāriọ kwa aririọ; Ka ha si kwa na nkponkpọ-ebe-ha nile nāchọ ihe-oriri-ha n'ebe di anya.

11. Ka onye-nbinye siri ihe nile o nwere ọnyà; Ka ndi ala ọzọ luta ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inweta n'agha.

12. Ekwela ka o nwe onye nọ nēmere ya ebere; Ekwe-kwa-la ka onye ọ bula di nke nēmere umu-nb͕ei-ya amara.

13. Ka eriri-umu-ya diri nbipu; N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha.

14. Ka echetara Jehova ajọ omume nna-ya-hà; Ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie nne-ya.

15. Ka ha di n'iru Jehova mb͕e nile, Ka O we bipu ncheta-ha n'uwa.

16. N'ihi na o chetaghi ime ebere, O we sob͕ue nwoke ewedara n'ala na ob͕eye, Na onye obi-ya mebiri emebi, ime ka ha nwua.

17. Ọ hu-kwa-ra nkọcha n'anya, o we biakute ya; Ngọzi atọghi kwa ya utọ, o we di anya n'ebe ọ nọ.

18. O yiri-kwa-ra nkọcha dika uwe-nwuda-ya, O we ba nime ya dika miri, Ba kwa n'ọkpukpu-ya nile dika manu.

19. Ya diri ya ka uwe oji kpuchi onwe-ya, Ya buru kwa akpukpọ-úkwù o ji ke úkwù mb͕e nile.

20. Nka bu ugwọ-ọlu nke ndi nēmegidem, nke nēsi n'aka Jehova bia, Ọ bu kwa ugwọ-ọlu nke ndi nēkwu ihe ọjọ megide nkpuru-obim.

21. Ma Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye-nwe-ayi, kwe ka mu na I mekọ n'ihi aha-Gi: N'ihi na ebere-Gi di nma, naputam.

22. N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu, Adupuwo kwa nkpuru-obim nimem.

23. Dika onyinyo mb͕e ọ nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu, otú a ka m'laworo: Arurupuwom dika igurube.

24. Ikperè-ukwum abua asuwo ngọngọ site n'obubu-ọnu; Anu-arum nāta aru nēnweghi abuba.

25. Mu onwem, aghọwo-kwa-ram ha ihe-ita-uta: Mb͕e ha nāhum ha nēfufe isi-ha.

26. Yerem aka, Jehova, Chinekem; Zọputam dika ebere-Gi si di:

27. Ka ha mara kwa na aka-Gi ka nka bu; Gi onwe-gi, Jehova, emewo ya.

28. Ndi ahu gākọcha, ma Gi onwe-gi nāgọzi: Ha ebiliwo, ihere we me ha, ma orù-Gi gāṅuri.

29. Ndi nēmegidem gēyiri ọnọdu-ihere dika uwe, Ha gēwere kwa ihere-ha kpuchie onwe-ha dika uwe-nwuda.

30. M'gēwere ọnum kele Jehova nke-uku; E, n'etiti ọtutu madu ka m'gēto Ya.

31. N'ihi na O gēguzo n'aka-nri nke ob͕eye, Izọputa ya n'aka ndi nēkpe nkpuru-obi-ya ikpe.

About Abù Ọma Chapter 109

Read Abù Ọma Chapter 109 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Abù Ọma
Chapter: 109
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Abù Ọma Chapter 109 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Abù Ọma Chapter 109?

Abù Ọma Chapter 109 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 109 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Abù Ọma

  1. Abù Ọma Chapter 3
  2. Abù Ọma Chapter 146
  3. Abù Ọma Chapter 10
  4. Abù Ọma Chapter 98
  5. Abù Ọma Chapter 92
  6. Abù Ọma Chapter 47
  7. Abù Ọma Chapter 112

Explore More from Agba Ochie

  1. I. Samuel Chapter 13
  2. Ezikiel Chapter 1
  3. Hagai Chapter 2
  4. Levitikọs Chapter 13
  5. Malakai Chapter 3
  6. I. Samuel Chapter 4
  7. Job Chapter 24

Related Chapters & Readings

  1. I. Ndi Tesalọnaika Chapter 1
  2. Emos Chapter 1
  3. Malakai Chapter 4
  4. Aisaia Chapter 34
  5. Jemes Chapter 5
  6. II. Samuel Chapter 18
  7. Abù Nke Abù Chapter 4
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *