Abù Ọma Chapter 71

For English

Read Abù Ọma Chapter 71 Online

Read Abù Ọma Chapter 71 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Abù Ọma 71

Isi 71

1. Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo: Ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi.

2. N'ezi omume-Gi naputam, me ka m'b͕apu: Tọrọm nti-Gi n'ala, zọputam.

3. Ghọrọm oké nkume nke ebe-obibi, nke m'gābà nime ya mb͕e nile I nyewo iwu izọputam; N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu.

4. Chinekem, me ka m'b͕apu n'aka onye nēmebi iwu, N'ọbu-aka nke onye nēme ajọ omume nke nēme kwa ihe-ike.

5. N'ihi na Gi onwe-gi bu olile-anyam, Onye-nwe-ayi Jehova: Gi bu ntukwasi-obim site na nwata.

6. N'elu Gi ka m'dabeworo site n'afọ nnem: Gi onwe-gi bu onye weputaworom n'afọ nnem: Na Gi ka otutom gādi mb͕e nile.

7. Aghọworom ọtutu madu ihe-ebube; Ma Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm di ike.

8. Ọnum gējuputa n'otuto-Gi, Ogologo ubọchi nile ka ọ gējuputa kwa n'ima-nma-Gi.

9. Etufulam na mb͕e agadi; Mb͕e ikem gwusiri arapulam.

10. N'ihi na ndi-irom ekwuwo okwu bayerem; Ọzọ, ndi nēche nkpuru-obim nche ab͕aritawo ìzù,

11. Si, Chineke arapuwo ya: Chuanu ya, jide ya; n'ihi na ọ dighi onye-nnaputa di.

12. Chineke, anọlam ebe di anya: Chinekem, bia ọsọsọ iyerem aka.

13. Ka ihere me ha, ka eme kwa ka ha gwusia, bú ndi nēmegide nkpuru-obim; Ka ewere ita-uta na ọnọdu-ihere kpuchie ndi nāchọ imem ihe ọjọ.

14. Ma mu onwem, mb͕e nile ka m'ganēche Gi, We tukwasi otuto n'otuto-gi nile

15. Ọnum gākọ akukọ bayere ezi omume-Gi, Ogologo ubọchi nile ka ọ gākọ akukọ bayere nzọputa-Gi; N'ihi na amaghm ọnu-ọgugu nile ha.

16. M'gēji idi-ike nile nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, bia: M'gēhota ezi omume-Gi, nání nke Gi.

17. Chineke, I zíwom ihe site na nwata; Ọ bu kwa rue ub͕u a ka m'nēgosi oké ọlu-Gi nile.

18. Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke; Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.

19. Ọzọ, ezi omume-Gi, Chineke, nādiru ebe di elu; Gi Onye meworo ihe uku di iche iche, Chineke, ònye di ka Gi?

20. Gi, Onye meworo ka ayi hu ọtutu nkpab͕u nke jọ-kwa-ra njọ, I gēme ka ayi di kwa ndu ọzọ, Me kwa ka ayi si n'ob͕u-miri nile nke uwa rigoputa ọzọ.

21. Me ka idi-ukum bakari uba, Gi chighari kwa kasiem obi.

22. Mu onwem gēji kwa une kele Gi, Bú ezi-okwu-Gi, Chinekem: M'gēji ubọ-akwara bùkue Gi abù ọma, Gi Onye Nsọ nke Israel.

23. Eb͕ub͕ere-ọnum abua gēti nkpu ọṅù mb͕e m'nābùku Gi abù ọma; Nkpuru-obim, nke I b͕aputaworo, gēti kwa nkpu ọṅù.

24. Ọzọ, irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi ogologo ubọchi nile: N'ihi na ihere emewo ha, n'ihi na ha nwere iru-ihere, bú ndi nāchọ imem ihe ọjọ.

About Abù Ọma Chapter 71

Read Abù Ọma Chapter 71 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Abù Ọma
Chapter: 71
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Abù Ọma Chapter 71 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Abù Ọma Chapter 71?

Abù Ọma Chapter 71 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 71 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Abù Ọma

  1. Abù Ọma Chapter 3
  2. Abù Ọma Chapter 146
  3. Abù Ọma Chapter 10
  4. Abù Ọma Chapter 98
  5. Abù Ọma Chapter 47
  6. Abù Ọma Chapter 112
  7. Abù Ọma Chapter 101

Explore More from Agba Ochie

  1. Ezikiel Chapter 44
  2. Deuteronomi Chapter 18
  3. Ndi-Ikpe Chapter 17
  4. Eklisiastis Chapter 11
  5. Abù Nke Abù Chapter 8
  6. Ezikiel Chapter 28
  7. I. Samuel Chapter 8

Related Chapters & Readings

  1. Jenesis Chapter 20
  2. Emos Chapter 3
  3. Ndi-Hibru Chapter 6
  4. Abù Ọma Chapter 121
  5. I. Timọti Chapter 2
  6. II. Ndi Kọrint Chapter 12
  7. I. Ndi Kọrint Chapter 4
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *