Read Aisaia Chapter 23 Online
Read Aisaia Chapter 23 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Aisaia and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Aisaia 23
Isi 23
1. Ibu eboro Taia. Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish; n'ihi na ebibiwo ya, ulo we ghara idi ya, uzọ-nbata ghara kwa idi ya: esiwo n'ala Kitim kpughere ha ya.
2. Derenu du, unu ndi bi n'ala di oké osimiri buruburu; gi onye ndi-ahia Zaidon, bú ndi nāgabiga oké osimiri, mejuworo ihe.
3. N'elu ọtutu miri ka nkpuru-ọghigha Shaihoa, nke bu owuwe-ihe-ubi nke Nail, bu ihe-omume-ya; o we ghọ urù-ahia nke mba di iche iche.
4. Ka ihere me gi, Zaidon: n'ihi na oké osimiri ekwuwo, bú ebe siri ike nke oké osimiri, si, Ime emeghm, amuputakwaghm nwa, emekwaghm ka umu-okorọbia toputa, emekwaghm ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke tozue okè.
5. Mb͕e anuru ihe a n'Ijipt, ihe anuru bayere Taia gēme ka ha b͕alie.
6. Gabiganu rue Tashish; kwasienu ákwá ike, unu ndi bi n'ala di oké osimiri buruburu.
7. Ọ̀ bu nka ka anēme unu, gi obodo nāṅuri ọṅu, nke mb͕e gara aga ya sitere n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, onye ukwu-ya abua nēdu ya-ri je n'ebe di anya inọ dika ọbìa?
8. Ònye zubeworo nka megide Taia, bú obodo nke nēkpube ndi ọzọ okpu-eze, nke ndi-ahia-ya bu ndi-isi, nke ndi-ọzu-ahia-ya bu ndi-nsọpuru nke uwa?
9. Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo ya, ime ka npako nke ima-nma nile ghara idi nsọ, ime ka elelìa ndi-nsọpuru nile nke uwa.
10. Rùbiga n'etiti ala-gi dika Nail, gi ada Tashish; ihe-ike-n'úkwù adighi kwa ọzọ.
11. Aka-Ya ka O setiworo n'elu oké osimiri, O mewo ka ala-eze di iche iche ma jijiji: Jehova enyewo iwu bayere Kenean, ikpochapu ebe siri ike ya nile.
12. O we si, I gaghi-aṅuri kwa Ọṅu-agha ọzọ, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke anēmeb͕u, bú ada Zaidon: bilie, gabiga rue Kitim; ọbuná n'ebe ahu ọ dighi izu-ike i gēnwe.
13. Le, ala ndi Kaldea; ndi nka adighi; Asiria edoziworo ya anu-ọhia nile nke biri n'ala kpọrọ nku: ha mere ka ulo-nche-ya nile guzosie ike, ha tikpọrọ ulo-elu-ya nile; o mere ya ka ọ ghọ ebe dara ada.
14. Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish: n'ihi na ebibiwo ebe siri ike unu.
15. Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agēchezọ Taia ọgu arọ atọ na iri, dika ubọchi nile nke otù eze si di: mb͕e ọgu arọ atọ na iri ahu gwusiri ọ gādiri Taia dika abù nwanyi nākwa iko.
16. Were ubọ-akwara, jegharia n'obodo buruburu, gi nwanyi nākwa iko nke echezọrọ echezọ; kpọ ya nke-ọma, bùa ọtutu abù, ka ewe cheta gi.
17. Ọ gēru kwa, mb͕e ọgu arọ atọ na iri gwusiri, na Jehova gēleta Taia, o we lata n'onyinye-ikwa-iko-ya, ya na ala-eze nile nke uwa nke di n'elu uwa ewe kwa iko.
18. Urù-ahia-ya na onyinye-ikwa-iko-ya gāghọ kwa ihe nsọ Jehova nwere: agaghi-edebe ya n'ulo-àkù, agaghi-ebukọba kwa ya; n'ihi na ndi bi n'iru Jehova gēnwe urù-ahia-ya, iriju afọ, na inwe ákwà-nb͕okwasi nādigide adigide.
About Aisaia Chapter 23
Read Aisaia Chapter 23 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Aisaia
Chapter: 23
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Aisaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
- 📱 Hindi Android Bible App
- 📱 Hindi Christian Songs from waytochurch
- 📖 Read on Malayalam Christian Songs – madely
Continue Reading the Bible
Continue reading Aisaia Chapter 23 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Aisaia Chapter 23?
Aisaia Chapter 23 is part of the Book of Aisaia in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Aisaia Chapter 23 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from Aisaia
- Aisaia Chapter 47
- Aisaia Chapter 32
- Aisaia Chapter 58
- Aisaia Chapter 31
- Aisaia Chapter 27
- Aisaia Chapter 30
- Aisaia Chapter 64