Read Abù Ọma Chapter 145 Online
Read Abù Ọma Chapter 145 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Abù Ọma 145
Isi 145
1. M'gēme Gi ka I di elu, Chinekem, bú Eze; M'gāgọzi kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.
2. Kwa-ubọchi ka m'gāgọzi Gi; M'gēto kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.
3. Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku; Ọ dighi kwa ngwuputa-ala diri idi-uku-Ya.
4. Otù ọb͕ọ gāja ọlu-Gi nile na nti ọb͕ọ ọzọ, We gosi idi-ike-Gi nile.
5. N'ima-nma nke nsọpuru nke ebube-Gi, Na n'oké ọlu-Gi nile, ka m'gātughari uche.
6. Ọ bu kwa ike nke ọlu-Gi nile di egwu ka ha gēkwuputa; Ọ bu kwa idi-uku-Gi ka m'gākọ akukọ-ya.
7. Ncheta nke iba-uba nke idi-nma-Gi ka ha ga-ekwukwa, Ọ bu kwa ezi omume-Gi ka ha gēti nkpu ọṅù bayere ya.
8. Onye di amara na onye nwere obi-ebere ka Jehova bu; Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ebere.
9. Jehova di nma n'ebe ihe nile ekère èkè di; Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n'ọlu-Ya nile.
10. Ọlu-Gi nile nēkele Gi, Jehova; Ndi-ebere-Gi nāgozi kwa Gi.
11. Nsọpuru nke ala-eze-Gi ka ha nēkwuputa, Ọ bu idi-ike Gi ka ha nēkwu okwu bayere ya;
12. Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile, Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya.
13. Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọchichi-Gi di kwa n'ọb͕ọ nile.
14. Jehova nākwagide ndi nile nāda ada, O nēkuli kwa ndi nile nēruda n'ala.
15. Anya ihe nile nēle anya Gi; Gi onwe-gi nēnye kwa ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.
16. I nāsaghe aka-Gi, I nēwere kwa ihe di ihe ọ bula di ndu utọ me ka afọ ju ya.
17. Onye ezi omume ka Jehova bu n'uzọ-Ya nile, Ọ di kwa ebere n'ọlu-Ya nile.
18. Jehova di nso ndi nile nākpọku Ya, Bú ndi nile nākpọku Ya n'ezi-okwu.
19. Ihe di ndi nātu egwu Ya utọ ka Ọ gēme; Ọ bu kwa ntiku-ha ka Ọ gānu, we zọputa ha.
20. Jehova nēdebe ndi nile nāhu Ya n'anya; Ma ndi nile nēmebi iwu ka Ọ gēkpochapu.
21. Otuto Jehova ka ọnum gēkwu; Ka anu-aru nile gọzi kwa aha nsọ Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.
About Abù Ọma Chapter 145
Read Abù Ọma Chapter 145 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Abù Ọma
Chapter: 145
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Abù Ọma Chapter 145 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Abù Ọma Chapter 145?
Abù Ọma Chapter 145 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 145 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Abù Ọma
- Abù Ọma Chapter 146
- Abù Ọma Chapter 10
- Abù Ọma Chapter 3
- Abù Ọma Chapter 98
- Abù Ọma Chapter 47
- Abù Ọma Chapter 112
- Abù Ọma Chapter 92
Explore More from Agba Ochie
- Eklisiastis Chapter 12
- Abù Ọma Chapter 96
- Job Chapter 22
- Ilu Chapter 2
- Hosea Chapter 1
- Ilu Chapter 31
- Ilu Chapter 9