Read Abù Ọma Chapter 72 Online
Read Abù Ọma Chapter 72 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Abù Ọma 72
Isi 72
1. Chineke, nye eze ikpé-Gi nile, Nye kwa nwa eze ezi omume-Gi.
2. O gēji ezi omume kpe ndi-Gi ikpe, O gēji kwa ikpe ziri ezi kpe ndi-Gi ewedara n'ala.
3. Ugwu nile gēbutere ndi-Gi udo, Ugwu ntà kwa, n'ezi omume.
4. Ọ gēkpe ndi ewedara n'ala n'etiti ndi-Gi ikpe, Ọ gēnye umu nke ob͕eye nzọputa, Zọpia kwa onye-nmeb͕u.
5. Ha ganātu egwu Gi ogologo mb͕e anyanwu gādigide, Na n'iru ọnwa, rue ọb͕ọ nile.
6. Ọ gārida dika miri-ozuzo si ezokwasi n'ọzara asuru asu: Dika oké miri-ozuzo nke nēdè ala.
7. Onye ezi omume gāma akwukwọ n'ubọchi nile ya dika osisi ndu; Ọtutu udo gādi kwa rue mb͕e ọnwa agaghi-adi.
8. Ya nwe kwa ike n'aru madu site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, Site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.
9. Ndi bi n'ala kpọrọ nku gēruru ala n'iru ya; Ọzọ, ndi-iro-ya gāracha ájá.
10. Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma: Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.
11. E, eze nile gākpọ isi ala nye ya: Mba nile gēfè ya òfùfè.
12. N'ihi na ọ gānaputa ob͕eye mb͕e o nētiku ya; Ọ gānaputa kwa onye ewedara n'ala mb͕e ọ dighi onye nēyere ya aka.
13. Ọ gēmere onye nēnweghi ike na ob͕eye ebere, Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-ob͕eye ka ọ gāzọputa.
14. Ọ gēsi n'aka nzọb͕u na n'aka ime-ihe-ike b͕aputa nkpuru-obi-ha; Ọbara-ha gādi kwa oké ọnu-ahia n'anya-ya.
15. Ya di kwa ndu! agēnye kwa ya ufọdu n'ọla-edo Sheba: Agēkpe kwa ekpere bayere ya mb͕e nile; Ogologo ubọchi nile ka agāgọzi ya.
16. Ka ọtutu ọka di n'ala n'elu ugwu nile; Nkpuru-ya ganēme nkpatu dika Lebanon: Madu gēsi kwa n'obodo wa okoko-osisi dika ihe akuru n'ala.
17. Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi; N'iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù: Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya: Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma.
18. Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke, bu, bú Chineke nke Israel, Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche:
19. Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi; Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya. Amen, na Amen.
20. Ekpere nke Devid nwa Jesi agwuwo.
About Abù Ọma Chapter 72
Read Abù Ọma Chapter 72 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Abù Ọma
Chapter: 72
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Abù Ọma Chapter 72 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Abù Ọma Chapter 72?
Abù Ọma Chapter 72 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 72 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Abù Ọma
- Abù Ọma Chapter 3
- Abù Ọma Chapter 10
- Abù Ọma Chapter 146
- Abù Ọma Chapter 47
- Abù Ọma Chapter 112
- Abù Ọma Chapter 98
- Abù Ọma Chapter 92
Explore More from Agba Ochie
- Jeremaia Chapter 26
- Ilu Chapter 13
- Jeremaia Chapter 18
- Nehemaia Chapter 8
- Hosea Chapter 6
- Ọpupu Chapter 25
- Jeremaia Chapter 37