Read Abù Ọma Chapter 66 Online
Read Abù Ọma Chapter 66 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Abù Ọma 66
Isi 66
1. Tikusienu Chineke nkpu ọǹù ike, uwa nile:
2. Bùanu nsọpuru aha-Ya n'abù ọma: Menu ka otuto-Ya di nsọpuru.
3. Sinu Chineke, Le ka ọlu-Gi nile si di oké egwu! N'uba nke ike-Gi ndi-iro-Gi gērube isi aghugho n'okpuru Gi.
4. Uwa nile gākpọ isi ala nye Gi, Bùku kwa Gi abù ọma; Ha gābùku aha-Gi abù ọma. Selah
5. Jenu, hu ọlu nile nke Chineke; Onye di egwu ka Ọ bu n'omume-Ya n'ebe umu madu nọ.
6. Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ: Ha nāgabiga osimirí n'ukwu-ha: Ka ayi ṅuria nime Ya n'ebe ahu.
7. O ji idi-ike-Ya achi rue mb͕e ebighi-ebi; Anya-Ya abua nēche mba nile nche: Ka ndi nēwezuga onwe-ha ghara ibuli onwe-ha elu. Selah
8. Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche, Me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya:
9. Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu, Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha.
10. N'ihi na I nwawo ayi, Chineke: I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha.
11. I mere ka ayi ma n'ọnyà; I tukwasiwo n'úkwù-ayi ibu nānyib͕u ayi.
12. I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi; Ayi bàra n'ọku na nime miri; I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè.
13. M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi, M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi,
14. Nke eb͕ub͕ere-ọnum abua ji saghepu, Nke ọnum kwu-kwa-ra, mb͕e nkpà dirim.
15. Ọtutu àjà-nsure-ọku, bú anu nwere abuba, ka m'gēsurere Gi, Ha na ihe-nsure-ọku nke nēsì ísì utọ nke ebulu; M'gāchu oke-ehi n'àjà, ha na nkpi. Selah
16. Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwu Chineke, M'gākọ kwa akukọ bayere ihe O meworo nkpuru-obim.
17. Ya ka m'jiri ọnum kpọkue, Nbuli-elu di kwa n'okpuru irem.
18. Ọ buru na ọ bu ajọ ihe ka m'leworo anya nime obim, Onye-nwe-ayi agaghi-anu olum:
19. N'ezie Chineke anuwo olum; Ọ ṅawo nti olu ekerem.
20. Onye agọziri agọzi ka Chineke bu, Onye nēwezugaghi ekperem, O sighi kwa n'ebe m'no wezuga ebere-Ya.
About Abù Ọma Chapter 66
Read Abù Ọma Chapter 66 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Abù Ọma
Chapter: 66
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Abù Ọma Chapter 66 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Abù Ọma Chapter 66?
Abù Ọma Chapter 66 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 66 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Abù Ọma
- Abù Ọma Chapter 3
- Abù Ọma Chapter 146
- Abù Ọma Chapter 10
- Abù Ọma Chapter 47
- Abù Ọma Chapter 112
- Abù Ọma Chapter 98
- Abù Ọma Chapter 92
Explore More from Agba Ochie
- Ezikiel Chapter 19
- Abù Ọma Chapter 67
- Abù Ọma Chapter 21
- Ezikiel Chapter 2
- Joshua Chapter 1
- Nehemaia Chapter 9
- I. Ndi-Eze Chapter 6