Abù Ọma Chapter 55

For English

Read Abù Ọma Chapter 55 Online

Read Abù Ọma Chapter 55 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Abù Ọma 55

Isi 55

1. Ge nti n'ekperem, Chineke; Ezonari-kwa-la Onwe-gi n'aririọ-amaram.

2. Ṅam nti, zam: Anamalù ulù na ntughari-obim, nāsu kwa oké ude;

3. N'ihi olu onye-iro, N'ihi nkpab͕u nke onye nēmebi iwu; N'ihi na ha nēme ka ajọ ihe me nkpatu megidem, Ọ bu kwa n'iwe ka ha nākpọm asì.

4. O nēb͕usi nkpuru-obim nb͕u ike nimem: Oké ujọ nile nke ọnwu adakwasiwo-kwam.

5. Egwu na ima-jijiji nābiarum aru, Oké ọma-jijiji ekpuchiwokwam.

6. M'we si, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem nkù dika nduru! M'gēfela, we nọdu du.

7. Le, m'gēferu ebe di anya, Nọ ọnọdu-abali n'ọzara. Selah

8. M'gēwere ọsọsọ si n'ifufe siri ike na n'oké ifufe Biarue ebe-nb͕apu dirim.

9. Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha: N'ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n'obodo.

10. N'ehihie na abali ka ha nāb͕a ya buruburu n'elu mb͕idi-ya nile: Ma ajọ ihe ma nmeb͕u di n'etiti ya.

11. Ihe-ila-n'iyì di iche iche di n'etiti ya: Nzọb͕u na aghughọ adighi-esi kwa n'amá-ya nile.

12. N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta; M'gānagide kwa ya: Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem; M'gēzonari kwa ya onwem:

13. Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra, Eyìm, na onye m'mara nke-ọma.

14. Ayi nāb͕akọri ìzù utọ, N'ulo Chineke ka ayi nējeghari n'etiti ìgwè madu.

15. Ka ọnwu biakwasi ha na mberede, Ka ha ridarue ala-mọ na ndu: N'ihi na ihe ọjọ nile di n'ebe ha nọ dika ọbìa, n'etiti ha.

16. Ma mu onwem, Chineke ka m'gākpọku; Jehova gāzọputakwam.

17. Anyasi, na ututu, na etiti-ehihie, ka m'gātughari uche, su kwa oké ude: Ọ gānu kwa olum.

18. Ọ b͕aputawo nkpuru-obim me ka ọ ba n'udo, ka ha ghara ibiarum nso: N'ihi na ha bara uba, bú ndi mu na ha nālu ọ̀gù.

19. Chineke gānu olum, weda kwa ha n'ala, Bú Onye nānọdu ka eze site na mb͕e ochie. Selah Ha bu ndi nēnweghi nb͕anwe, Ha adighi-atu kwa egwu Chineke.

20. O setiwo aka-ya abua imegide ndi ya na ha nọ n'udo: O mewo ọb͕ub͕a-ndu-ya ka ọ ghara idi nsọ.

21. Ha bu okwu ire-utọ, bú okwu ọnu-ya nke di ka miri-ara raru araru, Ma nání agha ka obi-ya bu: Okwu-ya nile di nrò kari manu, Ma okwu ahu bu mma-agha amiputara amiputa.

22. Tukwasi Jehova ihe O nyeworo gi dika ibu, Ya onwe-ya gānagide kwa gi: Ọ gaghi-ekwe ka ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi

23. Ma Gi onwe-gi, Chineke, gēme ka ha rida n'olùlù nbibi: Ndi bu ndi-ọbara na ndi-aghughọ agaghi-adiru nkera ubọchi-ha; Ma mu onwem gātukwasi obi na Gi.

About Abù Ọma Chapter 55

Read Abù Ọma Chapter 55 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Abù Ọma
Chapter: 55
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Abù Ọma Chapter 55 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Abù Ọma Chapter 55?

Abù Ọma Chapter 55 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 55 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Abù Ọma

  1. Abù Ọma Chapter 3
  2. Abù Ọma Chapter 146
  3. Abù Ọma Chapter 10
  4. Abù Ọma Chapter 98
  5. Abù Ọma Chapter 92
  6. Abù Ọma Chapter 47
  7. Abù Ọma Chapter 112

Explore More from Agba Ochie

  1. Jeremaia Chapter 42
  2. Ọpupu Chapter 11
  3. Ọpupu Chapter 32
  4. Abù Ọma Chapter 113
  5. Abù Ọma Chapter 140
  6. Aisaia Chapter 10
  7. I. Ndi-Eze Chapter 14

Related Chapters & Readings

  1. Ọnu-Ọgugu Chapter 28
  2. Ọpupu Chapter 30
  3. I. Ndi Kọrint Chapter 7
  4. Jeremaia Chapter 32
  5. I. Samuel Chapter 12
  6. Abù Ọma Chapter 34
  7. Jeremaia Chapter 33
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *