Read Abù Ọma Chapter 88 Online
Read Abù Ọma Chapter 88 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Abù Ọma 88
Isi 88
1. Jehova, Chineke nke nzọputam, N'ehihie ka m'tiworo nkpu, n'abali kwa, n'iru Gi:
2. Kwe ka ekperem bata n'iru Gi; Tọ nti-Gi n'ala n'iti-nkpum:
3. N'ihi na afọ ihe ọjọ di iche iche ejuwo nkpuru-obim, Ndum abiaruwo kwa nso ala-mọ.
4. Aguwom na ndi nārida n'olùlù; Aghọwom onye di ka nwoke nēnweghi ike:
5. Anọm n'etiti ndi nwuru anwu, buru onye nwere onwe-ya, Dika ndi eb͕uru eb͕u ndi nēdina n'ílì, Ndi I nēchetaghi ọzọ; Ndi ahu bu kwa ndi ebipuworo n'aka-Gi.
6. I tọb͕ọwom n'olùlù dichasi ala, N'ebe di iche iche b͕ara ọchichiri, nime miri di omimi.
7. Ọnuma-Gi akwagidewom, I werewo kwa ebili-miri-Gi nile wedam n'ala. Selah
8. I mewo ka ndi m'mara nke-ọma nọm n'ebe di anya; I mewom ka m'ghọrọ ha ihe-árú: Abum onye eb͕ochiworo, adighm-apu kwa n'èzí.
9. Anyam adalawo n'isi site na nweda-n'ala: Jehova, akpọkuwom I kwa-ubọchi, Ab͕asawom ọbu-akam abua n'ebe I nọ.
10. Ọ̀ bu ndi nwuru anwu ka I gāluru oké ọlu? Ndi nādighi ndu, hà gēbili kele Gi? Selah
11. Àgākọ akukọ ebere-Gi n'ílì? Àgākọ akukọ ikwesi-ntukwasi-obi-Gi n'ebe-ila-n'iyì?
12. Àgāmara oké ọlu-Gi n'ọchichiri? Àgāma kwa ezi omume-Gi n'ala nchezọ-ihe?
13. Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tikuworo, Jehova, Ọ bu kwa n'ututu ka ekperem gēje izute Gi.
14. Jehova, n'ìhi gini ka I nāju nkpuru-obim? N'ìhi gini ka I nēzonarim iru-Gi?
15. Onye ewedara n'ala na onye nēkubi ume ka m'bu site na nwata: Eburuwom oké ujọ Gi nile, obim nālọ miri.
16. Iwe-Gi di ọku agabigawo n'isim; Ihe-egwu-Gi nile ekpochapusiwom.
17. Ha dim buruburu dika miri ogologo ubọchi nile; Ha ab͕awom buruburu n'otù.
18. I mewo ka onye nāhum n'anya na eyìm nọm n'ebe di anya, Ndi m'mara nke-ọma ka ọchichiri bu.
About Abù Ọma Chapter 88
Read Abù Ọma Chapter 88 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Abù Ọma
Chapter: 88
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Abù Ọma Chapter 88 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Abù Ọma Chapter 88?
Abù Ọma Chapter 88 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 88 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Abù Ọma
- Abù Ọma Chapter 10
- Abù Ọma Chapter 3
- Abù Ọma Chapter 146
- Abù Ọma Chapter 98
- Abù Ọma Chapter 112
- Abù Ọma Chapter 147
- Abù Ọma Chapter 80
Explore More from Agba Ochie
- Ọpupu Chapter 18
- Job Chapter 13
- Abù-Ákwá Chapter 5
- Abù Ọma Chapter 150
- Zekaraia Chapter 12
- Ọpupu Chapter 37
- Ezikiel Chapter 33