Read Jenesis Chapter 39 Online
Read Jenesis Chapter 39 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jenesis in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jenesis and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Jenesis 39
Isi 39
1. Ma emere ka Josef ridata n'Ijipt: Potifa, onye nējere Fero ozi, onye-isi nke ndi-ob͕ū, bú nwoke Ijipt, we b͕a ya n'aka ndi Ishmael, ndi mere ya ka ọ ridata n'ebe ahu.
2. Jehova we nọyere Josef, ọ we buru nwoke ihe nāgara nke-ọma; ọ nọ n'ulo onye-nwe-ya, bú onye Ijipt ahu.
3. Onye-nwe-ya we hu na Jehova nọyere ya, ọ hu kwa na ihe nile nke ya nēme, Jehova nēme ka ọ ga nke-ọma n'aka-ya.
4. Josef we huta amara n'iru ya, we jere ya ozi: ọ me ya onye nēlekọta ulo-ya anya, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyere n'aka-ya.
5. O rue, site na mb͕e o mere ya onye-nlekọta n'ulo-ya na onye nēlekọta ihe nile ọ nwere, na Jehova gọziri ulo onye Ijipt ahu n'ihi Josef; ngọzi Jehova we dikwasi ihe nile o nwere, n'ulo na n'ọhia.
6. O we rapu ihe nile o nwere n'aka Josef; ọ maghi kwa ihe ọ bula di n'aka ya, ma-ọbughi nání nri nke ya onwe-ya nēri. Josef makwara mma n'aru, ma kwa mma ile anya.
7. O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na nwunye nke onye-nwe-ya weliri anya-ya abua lekwasi Josef, si, Ka mu na gi dina.
8. Ma ọ juru, si nwunye nke onye-nwe-ya, Le, onye-nwem amaghi ihe di n'akam n'ulo, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyeworo n'akam;
9. ọ dighi uku n'ulo a kari mu onwem; o b͕ochighi kwa ihe ọ bula n'ebe m'nọ ma-ọbughi nání gi, n'ihi na gi onwe-gi bu nwunye-ya: m'gēsi kwa aṅa me oké ihe ọjọ nka, mehie megide Chineke?
10. O rue, mb͕e ọ nāgwa Josef okwu kwa-ubọchi, na ọ geghi ya nti, idina nso ya, ma-ọbu inọyere ya.
11. O rue, dika ubọchi ahu, na ọ bara n'ulo ije ozi-ya; ma ọ dighi onye n'etiti ndikom nke ulo ahu nọ n'ebe ahu n'ulo.
12. Nwayi ahu we jide ya n'uwe-ya, si, Ka mu na gi dina; o we rapu uwe-ya n'aka-ya, b͕alaga, pua n'èzí.
13. O rue, mb͕e nwayi ahu huru na ọ rapururi uwe-ya n'aka-ya, b͕apu n'èzí,
14. na ọ kpọrọ ndikom ulo-ya, gwa ha okwu, si, Lenu, o mewo ka nwoke. Hibru bakute ayi ikwa ayi emò; ọ bakuterem idina-yerem, m'we kpọ nkpu n'oké olu:
15. o rue, mb͕e ọ nuru na ewelirim olum kpọ nkpu, na ọ rapuru uwe-ya n'ebe m'nọ, b͕alaga, pua n'èzí.
16. Nwayi ahu we debe uwe-ya n'ebe ọ nọ, rue mb͕e onye-nwe-ya batara n'ulo-ya.
17. Ọ we gwa ya dika okwu ndia si di, si, Orù Hibru ahu, nke i meworo ka ọ bakute ayi, bakuterem ikwam emò:
18. ma o rue, mb͕e m'weliri olum kpọ nkpu, na ọ rapuru uwe-ya n'ebe m'nọ, b͕apu n'ezí.
19. O rue, mb͕e onye-nwe-ya nuru okwu nile nke nwunye-ya, nke ọ gwara ya, si, Dika ihe ndia si di ka orù-gi merem; na iwe-ya di ọku.
20. Onye-nwe Josef we kuru ya, tiye ya n'ulo-nkpọrọ, bú ebe ndi-nkpọrọ nke eze Ijipt nọ n'ab͕u: o we nọ n'ebe ahu n'ulo-nkpọrọ.
21. Ma Jehova nọyere Josef, me ka ebere-Ya rue ya aru, O nye ya amara n'iru onye-isi ulo-nkpọrọ ahu.
22. Onye-isi ulo-nkpọrọ ahu we tiye n'aka Josef ndi-nkpọrọ nile ndi nọ n'ulo-nkpọrọ ahu; ihe ọ bula ha nēme kwa n'ebe ahu, ya onwe-ya bu onye nēme ya.
23. Ọ dighi ihe ọ bula onye-isi ulo-nkpọrọ ahu nāhu nke di n'aka-ya, n'ihi na Jehova nọyere ya; ihe nke ya onwe-ya nēme, Jehova mere ka ọ ga nke-ọma.
About Jenesis Chapter 39
Read Jenesis Chapter 39 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jenesis in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Jenesis
Chapter: 39
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jenesis. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Jenesis Chapter 39 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Jenesis Chapter 39?
Jenesis Chapter 39 is part of the Book of Jenesis in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Jenesis Chapter 39 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Eklisiastis Chapter 2
Explore More from Jenesis
- Jenesis Chapter 7
- Jenesis Chapter 25
- Jenesis Chapter 37
- Jenesis Chapter 36
- Jenesis Chapter 17
- Jenesis Chapter 35
- Jenesis Chapter 38