Abù Ọma Chapter 74

For English

Read Abù Ọma Chapter 74 Online

Read Abù Ọma Chapter 74 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Abù Ọma 74

Isi 74

1. Chineke, n'ìhi gini ka I juworo ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka iwe Gi nākwu anwuru imegide ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Gi?

2. Cheta nzukọ-Gi, nke I nwetaworo na mb͕e ochie, Nke I b͕aputaworo ibu ebo nke ihe-nketa-Gi; Cheta ugwu Zaion, ebe I biworo.

3. Zọlie ije ngwa ngwa ibiaru ebe nile etikpọrọ ebighi-ebi; Onye-iro emewo ihe ọjọ nile n'ebe nsọ.

4. Ndi nākpab͕u Gi ab͕ọwo uja n'etiti ebe-nzute-Gi; Ha edowo ihe-iriba-ama nile ha ibu ihe-iriba-ama,

5. Amara ha dika onye nēbuli anyu-ike elu nke-uku N'alùghi-ulù nke osisi.

6. Ma ub͕u a ihe-ya nile nke eb͕uru eb͕ub͕u, Ha nēwere anyu-ike ntà na otùtù di iche iche tipia ya n'otù.

7. Ha esuwo ebe nsọ Gi ọku; Ọbuná rue ala ka ha meworo ebe-obibi aha-Gi ka ọ ghara idi nsọ.

8. Ha siri n'obi-ha, Ka ayi me ha ihe-ike n'otù: Ha esurewo ebe-nzute nile nke Chineke n'ala.

9. Ayi ahughi ihe-iriba-ama nile ayi: Ọ dighi onye-amuma di ọzọ; Ọ dighi kwa onye nọ n'etiti ayi nke mara mb͕e mb͕e gēru.

10. Chineke, rùe ole mb͕e ka onye-nkpab͕u gāta uta? Onye-iro, ò gēlelì aha-Gi anya rue mb͕e ebighi-ebi?

11. N'ìhi gini ka I nēseghachi aka-Gi, bú aka-nri-Gi? Seputa ya n'obi-Gi me ka ha gwusia.

12. Ma Chineke bu Ezem site na mb͕e ochie, Nke nālu ọlu nzọputa n'etiti uwa

13. Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri: I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n'elu miri.

14. Gi onwe-gi tipiasiri isi nile nke oké agu-iyi, I nēnye ya enye iburu otù ndi ihe-oriri, bú ndi bi n'ala kpọrọ nku.

15. Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi: Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ.

16. Gi nwe ehihie, ọzọ kwa, Gi nwe abali: Gi onwe-gi edoziwo ihe nēnye ìhè na anyanwu.

17. Gi onwe-gi emewo ka ókè-ala nile nke uwa guzo ọtọ: Mb͕e okpom-ọku na mb͕e oyi, Gi onwe-gi akpuwo ha.

18. Cheta nka, na onye-iro atawo Jehova uta, Cheta kwa na otù ndi di nsọkwu eleliwo aha-Gi.

19. Enyela anu-ọhia nkpuru-obi nke ndi gi: Echezọla ndu nke ndi-Gi ewedara n'ala rue mb͕e ebighi-ebi.

20. Legide ọb͕ub͕a-ndu-Gi: N'ihi na ebe nile nke b͕ara ọchichiri nke uwa juputara n'ebe-obibi nile nke ihe-ike.

21. Ekwela ka onye anāzọpia azọpia lata n'ihere: Me ka onye ewedara n'ala na ob͕eye to aha-Gi.

22. Bilie, Chineke, kpe ọnu-Gi n'ikpe: Cheta uta anāta Gi site n'ọnu onye-nsọkwu ogologo ubọchi nile.

23. Echezọla olu ndi nākpab͕u Gi: Nkpọtu nke ndi nēbili imegide Gi nāla elu mb͕e nile.

About Abù Ọma Chapter 74

Read Abù Ọma Chapter 74 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Abù Ọma
Chapter: 74
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Abù Ọma Chapter 74 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Abù Ọma Chapter 74?

Abù Ọma Chapter 74 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 74 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Abù Ọma

  1. Abù Ọma Chapter 3
  2. Abù Ọma Chapter 146
  3. Abù Ọma Chapter 10
  4. Abù Ọma Chapter 98
  5. Abù Ọma Chapter 92
  6. Abù Ọma Chapter 47
  7. Abù Ọma Chapter 112

Explore More from Agba Ochie

  1. Abù Ọma Chapter 106
  2. Jenesis Chapter 27
  3. Abù Ọma Chapter 44
  4. II. Ihe Emere Chapter 34
  5. Job Chapter 40
  6. II. Samuel Chapter 17
  7. Abù Ọma Chapter 58

Related Chapters & Readings

  1. Matiu Chapter 15
  2. II. Ndi-Eze Chapter 25
  3. I. Ndi-Eze Chapter 4
  4. Jona Chapter 1
  5. Jenesis Chapter 26
  6. Ọnu-Ọgugu Chapter 25
  7. Hosea Chapter 1
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *