Read Abù Ọma Chapter 10 Online
Read Abù Ọma Chapter 10 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Abù Ọma 10
Isi 10
1. Jehova, n'ìhi gini ka I nēguzo nēbe di anya? N'ìhi gini ka I nēzobe Onwe-gi na mb͕e nile nke nkpà?
2. Site na npako nke onye nēmebi iwu ka anāchu onye ewedara n'ala ọku ọku; Anējide ha na nzube nile nke ha chère.
3. N'ihi na onye nēmebi iwu anyawo isi n'ihe nkpuru-obi-ya nāchọsi ike, Onye nērita urù nēzighi ezi ka ọ gọziwo-kwa-ra, o lelìwo Jehova.
4. Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju. Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di.
5. Uzọ-ya nile di ike na mb͕e nile; Ikpé-Gi nile di n'ebe di elu kari èbe anya-ya gēru: Ndi nile nākpab͕u ya, ọ nāpù megide ha na nleli.
6. o siwo n'obi-ya, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum: Rue ọb͕ọ nile ọ dighi mb͕e m'gānọ n'ọdi-njọ.
7. Ọnu-ya juputara n'ọb͕ub͕a-iyi na aghughọ na mmegbu: N'okpuru ire-ya ka nmeb͕u na ajọ ihe di.
8. Ọ nānọdu n'ebe iche-anwu nke obodo ntà nile: N'ebe-nzuzo nile ka ọ nēb͕u onye nēmeghi ihe ọjọ: Anya-ya abua nēwere nzuzo nyogide onye nāhuju anya.
9. Ọ neche anwu n'ebe-nzuzo dika ọdum n'okwu-ọhia-ya: Ọ nēche anwu inwude onye ewedara n'ala: Ọ na-anwude onye ewedara n'ala, mb͕e ọ dọbatara ya n'ub͕u-ya.
10. Anāzọpia ya, ọ nāmakpu amakpu, Ndi nāhuju anya adawo kwa n'ala site n'aka ndi-ya nwere ume.
11. Ọ siwo n'obi-ya, Chineke echezọwo: O zobewo iru-Ya; ọ dighi mb͕e Ọ huru ya.
12. Bilie, Jehova; Chineke, welie aka-Gi elu: Echezọla ndi ewedara n'ala.
13. N'ìhi gini ka onye nēmebi iwu lelìworo Chineke? Ọ siwo n'obi-ya, I gaghi-aju ajuju.
14. I huwo ya; n'ihi na Gi onwe-gi nēlegide nmeb͕u na nkpasu-iwe, itiye ya n'aka-Gi: N'aka-Gi ka onye nāhuju anya nārapu onwe-ya; Onye nēyere nwa-nb͕ei aka ka I buworo.
15. Tijie ogwe-aka nke onye nēmebi iwu; Onye ọjọ kwa, I gājuta nmebi-iwu-ya rue mb͕e I gaghi-achọta ya.
16. Jehova bu Eze rue mb͕e nile ebighi-ebi: Mba nile ọzọ esiwo n'ala-Ya lapu n'iyì.
17. I nuwo ihe ndi di ume-ala n'obi nāchọsi ike, Jehova: I nēdozi obi-ha, I nēme ka nti-Gi ge:
18. Ikpe nwa-nb͕ei na onye anāzọpia azọpia ikpe, Ka madu nke sitere n'uwa we ghara ime ka madu ma kwa jijiji ọzọ.
About Abù Ọma Chapter 10
Read Abù Ọma Chapter 10 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Abù Ọma
Chapter: 10
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Abù Ọma Chapter 10 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Abù Ọma Chapter 10?
Abù Ọma Chapter 10 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 10 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Abù Ọma
- Abù Ọma Chapter 3
- Abù Ọma Chapter 146
- Abù Ọma Chapter 47
- Abù Ọma Chapter 112
- Abù Ọma Chapter 98
- Abù Ọma Chapter 92
- Abù Ọma Chapter 64
Explore More from Agba Ochie
- Ọnu-Ọgugu Chapter 20
- Ndi-Ikpe Chapter 18
- Ọpupu Chapter 26
- Abù Ọma Chapter 1
- Deuteronomi Chapter 31
- Jeremaia Chapter 7
- Levitikọs Chapter 13