Abù Ọma Chapter 44

For English

Read Abù Ọma Chapter 44 Online

Read Abù Ọma Chapter 44 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Abù Ọma 44

Isi 44

1. Chineke, ayi ewerewo nti-ayi nu, nna-ayi-hà akọworo ayi, Ọlu I luru n'ubọchi-ha, n'ubọchi mb͕e ochie.

2. Gi onwe-gi jiri aka-gi napu mba ọzọ di iche iche ala-ha, we kua ha dika osisi nime ya; I nēmejọ ndi nile di iche iche, we me ka nna-ayi-hà wasa alaka.

3. N'ihi na ọ bughi mma-agha-ha ka ha ji nweta ala ahu, Ogwe-aka-ha azọputaghi kwa ha: Kama ọ bu aka-nri-Gi, na ogwe-aka-Gi, na ìhè nke iru-Gi, N'ihi na ihe-ha tọrọ Gi utọ.

4. Gi onwe-gi bu Ezem, Chineke: Nye nzọputa nile nke Jekob iwu.

5. Site na Gi ka ayi ga-akwatu ndi nākpab͕u ayi: Site n'aha-Gi ka ayi gāzọkwasi ndi nēbili imegide ayi ukwu.

6. N'ihi na ọ bughi utam ka m'nātukwasi obi, Mma-agham adighi-azọputakwam.

7. Kama ọ bu Gi zọputaworo ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi, I mewo kwa ka ihere me ndi nākpọ ayi asì.

8. Chineke ka ayi jiworo nya isi ogologo ubọchi nile, Ọ bu kwa aha-gi ka ayi gēkele rue mb͕e ebighi-ebi. Selah

9. Ma ub͕u a I juwo ayi aju, we tiye ayi n'ọnọdu-ihere; I dighi-eso kwa usu-ndi-agha-ayi pua ije agha.

10. I nēme ka ayi si n'iru onye-nkpab͕u laghachi azu: Ọzọ, ndi nākpọ ayi asì nāpunara ayì ihe nye onwe-ha.

11. I nēme ayi ka ayi di ka ìgwè aturu agēri eri; N'etiti mba nile ka I fesawo-kwa-ra ayi.

12. I nēre ndi-Gi ma I naraghi ihe-ọnu-ahia, I meghi ka àkù-Gi ba uba site n'ọnu-ahia-ha.

13. I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta, Ka ayi ghọrọ ndi di ayi buruburu ihe-ọchì na ihe-ikwa-emò.

14. I nēme ayi ilu n'etiti mba nile, Nfufe-isi n'etiti ndi nile di iche iche.

15. Ogologo ubọchi nile ka onodu-iherem di n'irum, Ihere irum ekpuchiwokwam,

16. N'ihi olu ita-uta na onye-nkwulu; N'ihi onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀.

17. Ihe nile a abiakwasiwo ayi; ma ayi echezọghi Gi, Ayi ekwughi kwa okwu-ugha n'ọb͕ub͕a-ndu-Gi

18. Obi-ayi alaghachighi azu, Nzọ-ukwu-ayi esighi kwa n'uzọ-Gi wezuga onwe-ha;

19. Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia, Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi.

20. Ọ buru na ayi echezọwo aha Chineke-ayi, We b͕asapuru chi ala ọzọ ọbu-aka-ayi;

21. Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a? N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi.

22. N'ezie n'ihi Gi ka eb͕uworo ayi ogologo ubọchi nile; Aguwo ayi dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u.

23. Teta, n'ìhi gini ka I nāraru ura, Onye-nwe-ayi? Teta n'ura, ajula ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi.

24. N'ìhi gini ka I nēzobe iru-Gi? N'ìhi gini ka I nēchezọ nweda-n'ala-ayi na nmeb͕u-ayi?

25. N'ihi na nkpuru-obi-ayi erudawo n'ala rue ájá: Afọ-ayi araparawo n'ala.

26. Bilie iyere ayi aka, B͕aputa kwa ayi n'ihi ebere-Gi.

About Abù Ọma Chapter 44

Read Abù Ọma Chapter 44 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Abù Ọma
Chapter: 44
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Abù Ọma Chapter 44 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Abù Ọma Chapter 44?

Abù Ọma Chapter 44 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 44 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Abù Ọma

  1. Abù Ọma Chapter 10
  2. Abù Ọma Chapter 3
  3. Abù Ọma Chapter 146
  4. Abù Ọma Chapter 98
  5. Abù Ọma Chapter 112
  6. Abù Ọma Chapter 147
  7. Abù Ọma Chapter 80

Explore More from Agba Ochie

  1. Ezikiel Chapter 28
  2. Deuteronomi Chapter 19
  3. Ọpupu Chapter 10
  4. Esta Chapter 6
  5. Ọnu-Ọgugu Chapter 10
  6. Aisaia Chapter 15
  7. II. Ndi-Eze Chapter 22

Related Chapters & Readings

  1. I. Ndi-Eze Chapter 20
  2. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 28
  3. Abù Ọma Chapter 118
  4. Eklisiastis Chapter 7
  5. Jeremaia Chapter 27
  6. II. Ndi Kọrint Chapter 7
  7. Jeremaia Chapter 24
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *