Read Abù Ọma Chapter 33 Online
Read Abù Ọma Chapter 33 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Abù Ọma 33
Isi 33
1. Tienu nkpu ọṅù nime Jehova, unu ndi ezi omume: N'ebe ndi ziri ezi nọ otuto mara nma.
2. Werenu ubọ-akwara kele Jehova: Werenu une nke akwara iri bùkue Ya abù ọma.
3. Bùkueune Ya abù ọhu; Werenu iti-nkpu me ka ọkpukpọ-ubọ di nma.
4. N'ihi na okwu Jehova ziri ezi; Anālu kwa ọlu-Ya nile n'ikwesi-ntukwasi-obi.
5. Ọ nāhu ezi omume na ezi ikpé n'anya: Uwa juputara n'ebere jehova.
6. Okwu Jehova ka ejiri me elu-igwe; Eji-kwa-ra iku-ume nke ọnu-Ya me usu-ha nile.
7. Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe: Ọ nētiye ob͕u-miri n'ulo-àkù di iche iche.
8. Ka uwa nile tua egwu Jehova: Ka ndi nile ndi bi n'elu-uwa dum madu bi tua ujọ Ya.
9. N'ihi na Ya onwe-ya kwuru okwu, o we di; Ya onwe-ya nyere iwu, o we guzo.
10. Jehova emebiwo ndum-ọdu mba nile: Ọ siwo èchìchè nile nke ndi di iche iche, É-è.
11. Ndum-ọdu Jehova nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi, Èchìchè nile nke obi-Ya rue ọb͕ọ nile.
12. Mba ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú mba ahu nke Jehova bu Chineke-ya; Bú ndi ahu Ọ rọputara iburu Ya ihe-nketa.
13. Jehova siri n'elu-igwe legide anya; Ọ huwo umu madu nile;
14. Ọ siwo n'ọnọdu ebe-obibi-Ya Lekwasi ndi nile bi n'uwa anya;
15. Bú Onye ahu Nke nākpu obi ha nile n'otù, Nke nāghọta kwa ọlu nile nke ha nile.
16. Ọ dighi eze anēji uba nke usu-ndi-agha-ya zọputa: Adighi-eji kwa ike riri nne naputa dike.
17. Nání ihe-nrafu ka inyinya bu iji zọputa madu: Ọ dighi-eji kwa ike-ya riri nne me ka madu wepuga onwe-ya.
18. Le, anya Jehova di n'aru ndi nātu egwu Ya, Bú n'aru ndi nēchere ebere-Ya;
19. Inaputa nkpuru-obi-ha n'ọnwu, Na idebe ha ndu n'oké unwu.
20. Nkpuru-obi-ayi echerewo Jehova: Iye-aka-ayi na ọta-ayi ka Ọ bu.
21. N'ihi na ọ bu nime Ya ka obi-ayi nāṅuri ọṅu, N'ihi na ọ bu aha nsọ Ya ka ayi tukwasiworo obi.
22. Jehova, ka ebere-Gi dikwasi ayi, Dika ayi chereworo Gi.
About Abù Ọma Chapter 33
Read Abù Ọma Chapter 33 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Abù Ọma
Chapter: 33
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Abù Ọma Chapter 33 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Abù Ọma Chapter 33?
Abù Ọma Chapter 33 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 33 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Abù Ọma
- Abù Ọma Chapter 10
- Abù Ọma Chapter 3
- Abù Ọma Chapter 146
- Abù Ọma Chapter 98
- Abù Ọma Chapter 112
- Abù Ọma Chapter 80
- Abù Ọma Chapter 64
Explore More from Agba Ochie
- I. Samuel Chapter 24
- Deuteronomi Chapter 2
- Aisaia Chapter 24
- Daniel Chapter 6
- Job Chapter 12
- I. Ndi-Eze Chapter 12
- I. Ihe Emere Chapter 12