Read Abù Ọma Chapter 105 Online
Read Abù Ọma Chapter 105 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Abù Ọma 105
Isi 105
1. Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya; Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.
2. Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma; Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.
3. Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya: Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.
4. Nāchọnu Jehova na ike-Ya; Chọnu iru-Ya mb͕e nile.
5. Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo; Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;
6. Unu nkpuru Abraham, bú orù-Ya, Umu Jekob, ndi-Ya arọputara.
7. Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi: N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di.
8. O chetawo ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu;
9. Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara, Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak;
10. O we me ka o guzoro Jebok ibu ukpuru, Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi:
11. Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean, Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa:
12. Mb͕e ha bu ndikom ole-na-ole, E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;
13. Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ, Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ.
14. Ọ kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha; O we bara ndi-eze nba n'ihi ha;
15. Si, Unu emetula ndim etere manu aka, Unu emejọ-kwa-la ndi-amumam.
16. O we kpọ oké unwu ka ọ biakwasi ala ahu; Nkpa-n'aka nile, bú achicha, ka Ọ kpajiri.
17. O zìri otù nwoke iga n'iru ha; Erere Josef ka ọ buru orù:
18. Ha were ab͕u kesie ukwu-ya abua ike; Nkpuru-obi-ya bàra n'ígwè:
19. Rue mb͕e okwu-Ya rère; Okwu-ọnu Jehova nuchara ya.
20. Eze ziri ozi, we tọpu ya; Bú onye nāchi ndi di iche iche, o we tupu ya n'ulo-nkpọrọ.
21. O mere ya ka ọ buru onye-nwe ulo-ya, Na onye nāchi ihe nile o nwetara:
22. Ike ndi-isi-ya ab͕u dika nkpuru-obi-ya chọrọ, Na ime ka ndi-okenye-ya mara ihe.
23. Israel we bata nime Ijipt; Ọzọ, Jekob nọrọ dika ọbìa n'ala Ham.
24. O we me ka ndi-Ya mia nkpuru nke-uku; O we me ka ha nwe ume kari ndi nākpab͕u ha.
25. Ọ b͕anwere obi-ha ikpọ ndi-Ya asì, Ib͕agide ndi-orù-Ya ìzù ọjọ.
26. O zigara Moses, bú orù-Ya, Na Eron onye Ọ rọputara.
27. Ha doro n'etiti ha ihe iriba-ama-Ya nile, Do kwa ihe-ebube di iche iche n'ala Ham.
28. O zìri ọchichiri, we me ka ọ b͕achie; Ha anupughi kwa isi n'okpuru okwu-Ya nile.
29. Ọ b͕anwere miri-ha ka ha ghọ ọbara, We me ka azù-ha nwua.
30. Ala-ha nuputara awọ, N'ime-ulo nile nke ndi-eze-ha.
31. O kwuru okwu, odudu we bia, Na anwu ntà n'ókè-ala-ha nile.
32. O mere oké miri-ozuzo-ha ka ha ghọ ákú-miri-ígwé, Na ọku nēnwu enwu n'ala-ha.
33. O we tie osisi vine nile ha na osisi fig nile ha ihe; Tiji kwa osisi nke ókè-ala-ha.
34. O kwuru okwu, igurube we da, Ha na umu-igurube nādighi ọnu-ọgugu,
35. Ha we richapu ihe-ọkukú ọ bula di n'ala-ha, Richapu kwa nkpuru nke ala-ubi-ha.
36. O tib͕u-kwa-ra umu nile eburu uzọ mu n'ala-ha, Bú nkpuru mbu nke ume-ha nile.
37. O we me ka ha puta chiri ọla-ọcha na ọla-edo: Ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ n'etiti ebo-Ya nile.
38. Ijipt ṅuriri mb͕e ha putara; N'ihi na oké egwu-ha dakwasiri ha.
39. Ọ b͕asara igwe-oji ibu ihe-nkpuchi; Na ọku inye ìhè n'abali.
40. Ha riọrọ, O we me ka nnunu quail bia, O were kwa nri nke elu-igwe me ka afọ ju ha.
41. O meghere oké nkume, miri we rùputa; Ha nērù n'ala ọkpọ-nku dika osimiri.
42. N'ihi na O chetara okwu nsọ Ya, Na Abraham, bú orù-Ya.
43. O we me ka ndi-Ya ji obi-utọ puta, Me kwa ndi Ọ rọputaworo ka ha ji iti-nkpu-ọṅù puta.
44. O we nye ha ala nile nke mba Kenean nile; Ọ bu kwa ihe ndi ọzọ di iche iche dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inwe ka ha nwetara:
45. Ka ha we debe ukpuru-Ya nile, Riba kwa iwu-Ya nile ama. Tonu Ja.
About Abù Ọma Chapter 105
Read Abù Ọma Chapter 105 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Abù Ọma
Chapter: 105
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Abù Ọma Chapter 105 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Abù Ọma Chapter 105?
Abù Ọma Chapter 105 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 105 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Abù Ọma
- Abù Ọma Chapter 3
- Abù Ọma Chapter 10
- Abù Ọma Chapter 146
- Abù Ọma Chapter 47
- Abù Ọma Chapter 112
- Abù Ọma Chapter 98
- Abù Ọma Chapter 92
Explore More from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 54
- II. Samuel Chapter 23
- II. Ihe Emere Chapter 10
- Daniel Chapter 5
- Ọpupu Chapter 27
- Ọnu-Ọgugu Chapter 4
- Abù Ọma Chapter 108