Read Abù Ọma Chapter 50 Online
Read Abù Ọma Chapter 50 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Abù Ọma 50
Isi 50
1. Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo, We kpọ uwa site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya.
2. Site na Zaion, bú ebe mazuru nma, Ka Chineke nwuputaworo ka ìhè.
3. Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti: Ọku nēripia n'iru Ya, Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku.
4. Ọ nākpọ elu-igwe nke di n'elu òkù, Nākpọ kwa uwa, ka O we kpe ndi-Ya ikpe:
5. Chikọtaranum ndi-eberem; Bú ndi Mu na ha b͕ara ndu n'elu àjà.
6. Elu-igwe nēgosi kwa ezi omume-Ya; N'ihi na Chineke onwe-ya nēkpe ikpe. Selah
7. Nuru, ndim, M'gēkwu kwa; Nuru, Israel, M'gāb͕a kwa àmà megide gi: Chineke, bú Chineke-gi, ka M'bu.
8. Ọ bughi n'ihi àjà-gi nile ka M'nābara gi nba; Àjà-nsure-ọku-gi nile di kwa n'irum mb͕e nile.
9. M'gaghi-anara oke-ehi n'ulo-gi, M'gaghi-anara nkpi ọ bula n'ogige-ewu-na-aturu-gi.
10. N'ihi na Mu nwe anu-ọhia ọ bula nke oké ọhia, Ya na anu nile n'elu nnù ugwu abua na ọgu iri.
11. Amawom anu-ufe ọ bula nke ugwu nile: Anu nile nke nēnughari n'ọhia di kwa n'akam.
12. Ọ buru na agu aguam, M'gaghi-agwa gi: N'ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya.
13. M'gēri anu oke-ehi? Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m'gāṅu?
14. Chuara Chineke ekele dika àjà; Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere:
15. Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u; M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.
16. Ma ndi nēmebi iwu ka Chineke gwara okwu, si, Òle ọlu-gi di ya n'ikọ ukpurum nile? Òle ọlu-gi di kwa ya na i būruwo ọb͕ub͕a-ndum n'ọnu-gi?
17. Ebe gi onwe-gi kpọworo idọ-aka-na-nti asì, We tufue okwum nile n'azu gi.
18. Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ, Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.
19. I rarawo ọnu-gi nye n'ikwu ihe ọjọ, Ire-gi nējikọta kwa aghughọ.
20. I nānọdu ala, nwa-nne-gi ka i nēkwu okwu megide; Nwa nke nne-gi muru ka i nēbo ebubo ugha.
21. Ihe ndia ka i meworo, M'we b͕a nkiti; I chère na adizum ka i di: M'gābara gi nba, do kwa ya n'usoro n'anya-gi.
22. Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke, Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu:
23. Onye nāchu ekele dika àjà nāsọpurum; Ọ bu kwa onye nēdozi uzọ-ya Ka m'gēme ka ọ hu nzọputa Chineke.
About Abù Ọma Chapter 50
Read Abù Ọma Chapter 50 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Abù Ọma
Chapter: 50
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Abù Ọma Chapter 50 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Abù Ọma Chapter 50?
Abù Ọma Chapter 50 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 50 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Abù Ọma
- Abù Ọma Chapter 3
- Abù Ọma Chapter 146
- Abù Ọma Chapter 10
- Abù Ọma Chapter 47
- Abù Ọma Chapter 112
- Abù Ọma Chapter 98
- Abù Ọma Chapter 92
Explore More from Agba Ochie
- Ilu Chapter 15
- Aisaia Chapter 1
- Eklisiastis Chapter 3
- Nehemaia Chapter 1
- I. Samuel Chapter 20
- Ezikiel Chapter 45
- I. Samuel Chapter 15