Read Ọnu-Ọgugu Chapter 19 Online
Read Ọnu-Ọgugu Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ọnu-Ọgugu and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ọnu-Ọgugu 19
Isi 19
1. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
2. Nka bu ukpuru nke iwu ahu nke Jehova nyeworo n'iwu, si, Gwa umu Israel okwu, ka ha wetara gi nwa-ab͕ọghọ-ehi nācha uhie uhie nke zuru okè, nke ọlu nādighi n.aru-ya, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ya:
3. unu gēnye ya Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ọ gēme ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, otù onye gēb͕u ya n'iru ya:
4. Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, fesa ufọdu nime ọbara-ya na ncherita-iru ulo-ikwū nzute ub͕ò asa:
5. otù onye gēsure kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu ọku n'anya-ya; akpukpọ-ya, na anu-ya, na ọbara-ya, tiyere nsi-ya, ka o gēsure ọku:
6. onye-nchu-àjà gēwere kwa osisi cedar, na hyssop, na ogho uhie, tubà ya n'etiti nsure-ọku nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu.
7. onye-nchu-àjà gāsu kwa uwe-ya, sa kwa anu-aru-ya na miri, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū, onye-nchu-àjà gāru kwa árú rue anyasi.
8. Onye ahu nke nēsure ya ọku gāsu kwa uwe-ya na miri, sa kwa anu-aru-ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
9. Nwoke nke di ọcha gāchikọta ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu, do ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū n'ebe di ọcha, ọ gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ndebe ibu miri nke idi-na-nsọ: àjà-nmehie ka ọ bu.
10. Onye ahu nke nāchikọta ntu nwa-ab͕ọghọ-ehi gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: ọ gābu-kwa-ra umu Israel, buru kwa ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, ukpuru ebighi-ebi.
11. Onye nēmetu ozu nwuru anwu nke madu ọ bula aru gāru árú ubọchi asa:
12. onye ahu gēwere ya wepu nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, n'ubọchi nke-asa ọ gādi kwa ọcha: ma ọ buru na o wepughi nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, ọ gaghi-adi kwa ọcha n'ubọchi nke-asa.
13. Onye ọ bula nke nēmetu onye nwuru anwu aru, bú ozu madu nke nwuru anwu, ma o wepughi nmehie-ya, ebe obibi Jehova ka ọ nēmeru; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'Israel n'ihi na awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka ọ gābu; ọrurú-ya nādikwasi ya rue ub͕u a.
14. Nka bu iwu mb͕e madu nwuru n'ulo-ikwū: onye ọ bula nke nāba n.ulo-ikwū ahu, na onye ọ bula nke nọ n'ulo-ikwū ahu, gāru árú ubọchi asa.
15. Ihe ọ bula nke ghere oghe, nke nēnweghi ihe-nkpuchi eriri eji kechi elu-ya, ihe ruru árú ka ọ bu.
16. Onye ọ bula nke nēmetu onye eji mma-agha b͕u, ma-ọbu onye nwuru anwu, ma-ọbu ọkpukpu madu, ma-ọbu ílì, aru, n'ọhia sara iru, ọ gāru árú ubọchi asa.
17. Ha gēwere kwa ufọdu nime ntu nsure-ọku àjà-nmehie ahu bayere onye ahu ruru árú, agētiye kwa miri nērù erù n'elu ya nime ihe:
18. nwoke nke di ọcha gēwere kwa hyssop, sue ya na miri ahu, fesa ya n'ulo-ikwū ahu, na n'ihe-ya nile, na n'aru ndi nọ n'ebe ahu, na n'aru onye ahu nke metuworo ọkpukpu ahu, maọbu onye eb͕uru eb͕u ahu, ma-ọbu onye nwuru anwu ahu, maọbu ílì ahu, aru:
19. onye ahu nke di ọcha gēfesa kwa onye ahu ruru árú n'ubọchi nke-atọ, na n'ubọchi nke-asa: ọ gēwepu kwa nmehie-ya n'ubọchi nke-asa; ọ gāsu kwa uwe-ya, sa kwa aru-ya na miri, di ọcha n'anyasi.
20. Ma nwoke nke ruru árú, ma ọ dighi-ewepu nmehie-ya, agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti nkpọkọta Israel, n'ihi na ọ bu nsọ Jehova ka ọ meruworo: awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka o bu.
21. Ọ gābu-kwa-ra ha ukpuru ebighi-ebi; onye nēfesa miri nke idi-na-nsọ ahu gāsu kwa uwe-ya; onye nēmetu miri nke idi-na-nsọ ahu aru gāru kwa árú rue anyasi.
22. Ihe ọ bula onye ruru árú nēmetu aru gāru árú; madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi.
About Ọnu-Ọgugu Chapter 19
Read Ọnu-Ọgugu Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ọnu-Ọgugu
Chapter: 19
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ọnu-Ọgugu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ọnu-Ọgugu Chapter 19 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ọnu-Ọgugu Chapter 19?
Ọnu-Ọgugu Chapter 19 is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ọnu-Ọgugu Chapter 19 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from ọnu ọgugu
- Ọnu-Ọgugu Chapter 22
- Ọnu-Ọgugu Chapter 29
- Ọnu-Ọgugu Chapter 20
- Ọnu-Ọgugu Chapter 8
- Ọnu-Ọgugu Chapter 30
- Ọnu-Ọgugu Chapter 17
- Ọnu-Ọgugu Chapter 16