Abù Ọma Chapter 35

For English

Read Abù Ọma Chapter 35 Online

Read Abù Ọma Chapter 35 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Abù Ọma 35

Isi 35

1. Jehova, luso ha ọ̀gù, bú ndi nālusom ọ̀gù: Buso ha agha, bú ndi nēbusom agha.

2. Jide ọta na ọta uku, Bilie iyerem aka.

3. Seputa kwa ube na anyu-ike-agha izute ndi nāchum: Si nkpuru-obim, Nzọputa-gi ka M'bu.

4. Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike: Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem.

5. Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha.

6. Ka uzọ-ha b͕a ọchichiri, ka ọ buru kwa ebe nālo nālọ, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nāchu ha.

7. N'ihi na ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha zoberem olùlù nke ub͕u-ha, Ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha gwuru olùlù nye nkpuru-obim.

8. Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi; Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya: Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya.

9. Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova: Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya.

10. Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi? Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya, I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike.

11. Ndi-àmà nke ihe-ike nēbili; Ihe nke m'nāmaghi ka ha nājum.

12. Ha nākwughachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa.

13. Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe: Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu; Ekperem nālaghachikute kwa obim.

14. Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri: Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe.

15. Ma mb͕e m'nāru ukwu ha ṅuriri ọṅu, chikọta onwe-ha: Ha chikọtara onwe-ha imegidem, nētib͕um mb͕e m'nāmaghi; Ha dọkaram, ha eguzoghi kwa du:

16. Dika ndi emeruru emeru n'etiti ndi nāchì ọchì n'ihi ob͕e-achicha, Otú a ka ha takwasirim ikekere-ezé.

17. Onye-nwe-ayi, #mb͕e ole ka I ganēle anya? Si na ntikpọ nile ha weghachi nkpuru-obim, Si n'aka umu-ọdum weghachi nkpuru-obi m'nwere nání ya.

18. M'gēkele Gi n'etiti nkpọkọta bara uba: N'etiti otù ndi nwere ume ka m'gēto Gi.

19. Ekwela ka ndi-irom, bú ndi-okwu-ugha, ṅuam ọǹu: Ekwela ka ndi nākpọm asì mb͕e m'nēmeghi ihe b͕ue iku-anya.

20. N'ihi na ọ bughi okwu udo ka ha nēkwu: Ma ha nēchèputa okwu di iche iche nke aghughọ nile imegide ndi nọ jū n'ala.

21. Ha we me ka ọnu-ha sa mbara imegidem; Ha siri, Ehe, ehe, anya-ayi ahuwo ya.

22. I huwo ya, Jehova; ab͕ala nkiti: Onye-nwe-ayi, anọlam n'ebe di anya.

23. Kpọte Onwe-gi, kpetara ikpe m, Chinekem na Onye-nwem, tetara okwu-ikpem.

24. Kpem ikpe dika ezi omume-Gi si di, Jehova, bú Chinekem; Ekwe-kwa-la ka ha ǹuam ọǹu.

25. Ekwela ka ha si n'obi-ha, Ehe, nka bu ọchichọ nkpuru-obi-ayi: Ekwela ka ha si, Ayi elodawo ya.

26. Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, bú ndi na-aṅuri ọǹu n'ihe ọjọ nādakwasim: Ka ha yiri ihere na ọnọdu-ihere dika uwe, bú ndi nēme onwe-ha ka ha di uku imegidem.

27. Ka ha tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa ọṅu, bú ndi ezi omumem nātọ utọ: Ka ha nāsi kwa mb͕e nile, Jehova di uku, Onye udo orù-Ya nātọ Ya utọ.

28. Irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi, Baye-kwa-ra otuto-Gi ogologo ubọchi nile.

About Abù Ọma Chapter 35

Read Abù Ọma Chapter 35 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Abù Ọma
Chapter: 35
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Abù Ọma Chapter 35 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Abù Ọma Chapter 35?

Abù Ọma Chapter 35 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 35 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Abù Ọma

  1. Abù Ọma Chapter 146
  2. Abù Ọma Chapter 47
  3. Abù Ọma Chapter 98
  4. Abù Ọma Chapter 92
  5. Abù Ọma Chapter 64
  6. Abù Ọma Chapter 10
  7. Abù Ọma Chapter 3

Explore More from Agba Ochie

  1. Jona Chapter 1
  2. I. Samuel Chapter 22
  3. Abù Ọma Chapter 148
  4. Deuteronomi Chapter 7
  5. Aisaia Chapter 27
  6. Ọpupu Chapter 11
  7. Abù Ọma Chapter 53

Related Chapters & Readings

  1. Jenesis Chapter 20
  2. Abù Ọma Chapter 130
  3. Abù Ọma Chapter 6
  4. Luk Chapter 24
  5. Nkpugh Chapter 12
  6. Nkpugh Chapter 15
  7. Ọpupu Chapter 33
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *