Read Aisaia Chapter 37 Online
Read Aisaia Chapter 37 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Aisaia and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Aisaia 37
Isi 37
1. O rue, mb͕e eze, bú Hezekaia, nuru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, were ákwà-nkpe kpuchie onwe-ya, ba n'ulo Jehova.
2. Ọ we zìe Elaiakim, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ na ndi okenye ndi-nchu-àjà, ndi wereworo ákwà-nkpe kpuchie onwe-ha, o we zìe ha jekuru Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma.
3. Ha we si ya, Otú a ka Hezekaia siri, Ubọchi ahuhu na iba-nba na nlelì-anya ka ubọchi ta bu: n'ihi na umu abiaruwo ebe-nmuputa, ma ike adighi imu ha.
4. Eleghi anya Jehova, bú Chineke-gi, gānu okwu nile nke Rabshake, onye eze Asiria, bú onye-nwe-ya, ziteworo ita Chineke di ndu uta, eleghi anya Ọ gābara okwu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nuworo nba: gi buli kwa ekpere-gi n'ihi ndi fọduru ndi ahutaworo.
5. Ndi-orù eze, bú Hezekaia, we biakute Aisaia.
6. Aisaia we si ha, Otú a ka unu gāsi onye-nwe-unu, Otú a ka Jehova siri, Atula egwu n'ihi okwu nile nke i nuworo, nke ndi nējere eze Asiria ozi jiri kwulum.
7. Le, M'nētiye otù mọ nime ya, ọ gānu kwa akukọ, laghachi n'ala-ya; m'gēme kwa ka ọ da site na mma-agha n'ala-ya.
8. Rabshake we laghachi, huta eze Asiria ka ọ nēbuso Libna agha: n'ihi na O nuru na o siwo na Lekish bulie ije.
9. Ọ we nu ihe bayere Tiahaka, bú eze Etiopia, si, Ọ putawo ibuso gi agha. O we nu, zìe ndi-ozi jekuru Hezekaia, si,
10. Otú a ka unu gāgwa Hezekaia bú eze Juda, okwu, si, Ekwela ka Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nātukwasi obi, rafue gi, si, Agaghi-enye Jerusalem n'aka eze Asiria.
11. Le, gi onwe-gi anuwo ihe ndi-eze Asiria meworo ala nile, n'iwezuga ha ka ebibie ha: àgānaputa kwa gi onwe-gi?
12. chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Eden, ndi nọ na Telasa?
13. Òle ebe eze Hemat di, na eze Apad, na eze obodo Sefavaim na Hina na Iva?
14. Hezekaia we nata akwukwọ n'aka ndi-ozi ahu, gua ya: Hezekaia we rigorue ulo Jehova, b͕asa ya n'iru Jehova.
15. Hezekaia we kpe ekpere n'iru Jehova, si,
16. Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, Onye nēbi n'etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa.
17. Jehova, tọ nti-Gi n'ala, nu; Jehova, saghe anya-Gi abua, hu: nu kwa okwu nile nke Senakerib, nke zitere madu ita Chineke di ndu uta.
18. N'ezi-okwu, Jehova, ndi-eze Asiria emewo ka ala nile na ala-ha tọb͕ọrọ n'efu,
19. ha etiyewo kwa chi nile ha n'ọku: n'ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n'iyì.
20. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, zọputa ayi n'aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi.
21. Aisaia nwa Emoz we zigara Hezekaia ozi, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ekpere nke i kpeworom bayere Senakerib, bú eze Asiria, anuwom ya.
22. Nka bu okwu nke Jehova kwuworo bayere ya: Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Zaion elelìwo gi anya, chìnye gi ihere n'iru; ada Jerusalem efufewo isi n'azu gi.
23. Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel.
24. I siri n'aka ndi-orù-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu nile, rue akuku ime nile nke Lebanon; m'gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m'gābà kwa n'ebe di elu nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya.
25. Mu onwem egwuwo olùlù-miri, ṅua miri, m'gēwere kwa ọbu-ukwu nke nzọli-ukwum me ka osimiri Nail nile nke Ijipt tasia.
26. Ì nughi na ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka M'meworo ya, na ọ bu site n'ubọchi mb͕e ochie ka M'kpuworo ya? ugbu a emewom ka ọ biarue, na i gābu onye gākwada obodo ewusiri ike ka ha we ghọ obo tọb͕ọrọ n'efu.
27. Ndi bi nime ha we ghọ ndi aka-ha di nkpunkpu, ha turu ujọ, ihere we me ha; ha ghọrọ ihe-ọkukú nke ubi, na akwukwọ ahihia ndu, na ahihia nke elu-ulo, na ubi ọka tutu o tolite.
28. Ma amowom nnọdu-gi, na ọpupu-gi, na nbata-gi, na otú i nākpali onwe-gi imegidem.
29. N'ihi na i nākpali onwe-gi imegidem, na n'ihi na npako-gi arigowo ba na ntim abua, M'gētiye kwa nb͕a-aka-imim n'imi-gi, na bridle nkem n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua, me ka i laghachi n'uzọ ahu nke i siri bia.
30. Ma nka gāburu gi ihe-iriba-ama: unu gēri n'arọ a ihe nēpú n'onwe-ya, na n'arọ nke-abua ihe si na nke ahu pue; ma n'arọ nke-otọ ghanu nkpuru, we kwa ihe ubi, ku kwa vine n'ubi-vine, ri kwa nkpuru-ha.
31. Ndi b͕apuru ab͕apu nke ulo Juda ndi fọduru gāb͕agide kwa nkpọrọgwu n'ala n'okpuru ọzọ, mi kwa nkpuru n'elu.
32. N'ihi na ọ bu na Jerusalem ka ndi fọduru afọdu gēsi puta, ndi b͕apuru ab͕apu gāputa kwa n'ugwu Zaion: ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.
33. N'ihi ya ka Jehova kwuru okwu bayere eze Asiria otú a, si, Ọ gaghi-abà n'obodo a, ọ gaghi-ab͕a otù àkú n'ebe ahu, ọ gaghi-ewere kwa ọta bia n'iru ya, ọ gaghi-awukọta kwa ihe-ntukọba imegide ya.
34. N'uzọ o siri bia, n'uzọ ahu ka ọ gālaghachi, ọ gaghi-abà kwa n'obodo a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
35. M'gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n'ihi Onwem, na n'ihi Devid, bú orùm.
36. Mọ-ozi nke Jehova we pua, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ, na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.
37. Senakerib, bú eze Asiria, we bulie ije, je, laghachi, biri na Nineve.
38. O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n'ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n'ala Ararat. Isa-hadon, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.
About Aisaia Chapter 37
Read Aisaia Chapter 37 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Aisaia
Chapter: 37
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Aisaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Aisaia Chapter 37 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Aisaia Chapter 37?
Aisaia Chapter 37 is part of the Book of Aisaia in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Aisaia Chapter 37 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from Aisaia
- Aisaia Chapter 57
- Aisaia Chapter 29
- Aisaia Chapter 43
- Aisaia Chapter 35
- Aisaia Chapter 45
- Aisaia Chapter 55
- Aisaia Chapter 50