Abù Ọma Chapter 106

For English

Read Abù Ọma Chapter 106 Online

Read Abù Ọma Chapter 106 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Abù Ọma 106

Isi 106

1. Tonu Ja. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2. Ònye gākọ akukọ idi-ike nile nke Jehova? Ònye gēme ka anuru otuto-Ya nile?

3. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe ikpé bu, Ha na onye nēme ezi omume na mb͕e nile.

4. Chetam, Jehova, were ka ihe ndi-gi si atọ Gi utọ chetam; Were nzọputa-Gi letam:

5. Ka m'we lekwasi ọdi-nma nke ndi I rọputaworo, Ka m'we ṅuria n'ọṅù mba-Gi, Ka m'we soro ihe-nketa-Gi nya isi.

6. Ayi esowo nna-ayi-hà mehie, Ayi emewo ajọ omume, ayi emebiwo iwu.

7. Nna-ayi-hà enweghi uche ighọta oké ọlu-Gi nile n'Ijipt; Ha echetaghi iba-uba nke ebere-Gi nile; Ha we nupu isi n'akuku oké osimiri, bú n'Oké Osimiri Uhie.

8. Ma Ọ zọputara ha n'ihi aha-Ya, Ime ka amara idi-ike-Ya.

9. O we basiere Oké Osimiri Uhue nba, o we tasia: O we me ka ha nēje ije n'ob͕u-miri-ya nile dika ọ bu ọzara.

10. O we zọputa ha n'aka onye nākpọ ha asì, B͕aputa kwa ha n'aka onye-iro-ha.

11. Miri we kpuchie ndi nākpab͕u ha: Ọ dighi otù onye nime ha fọduru.

12. Ha we kwere okwu-Ya nile; Ha nābù abù otuto-Ya.

13. Ha chezọrọ ọlu-Ya nile ngwa ngwa; Ha echeghi ndum-ọdu-Ya:

14. Ha we chọ ajọ ọchichọ n'ọzara, We nwa Chineke n'ala tọb͕ọrọ n'efu.

15. O we nye ha ihe ha riọrọ; Ma O zitere aru-ọtita na nkpuru-obi-ha.

16. Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova.

17. Ala nēmeghe, we loda Detan, Kpuchi kwa nzukọ Abairam.

18. Ọku we nēre n'etiti nzukọ-ha; Ire-ọku nērepia ndi nēmebi iwu.

19. Ha nēme nwa-ehi na Horeb, We kpọ isi ala nye ihe awuru awu.

20. Ha we b͕anwe nsọpuru-ha N'ihe-atù nke ehi nāta ihe akuru n'ala.

21. Ha chezọrọ Chineke, bú Onye-nzọputa-ha, Onye nēmeri ihe uku di iche iche n'Ijipt;

22. Oké ọlu di iche iche n'ala Ham, Na ihe di egwu di iche iche n'akuku Oké Osimiri Uhie.

23. O we si na O gēkpochapu ha, Ma ọ buru na Moses, bú onye Ọ rọputaworo, eguzoghi na ntiwa ahu n'iru Ya, Ime ka ọnuma-Ya si n'ibibi ha laghachi.

24. Ọzọ, ha juru ala anāchọsi ike, Ha ekweghi okwu-Ya;

25. Ha we tamu n'ulo-ikwū nile ha, Ha egeghi nti n'olu Jehova.

26. O we welie aka-Ya elu n'ebe ha nọ, Ime ka ha da n'ọzara:

27. Na ime ka nkpuru-ha da n'etiti mba nile, Na ichusa ha n'ala nile.

28. Ha kekọta-kwa-ra onwe-ha n'aru Beal-peoa, We rie àjà nile nke ihe nwuru anwu.

29. Ha we were omume nile ha kpasue Ya iwe: Ihe-otiti we dakwasi ha.

30. Finehas wee guzo ọtọ, me ihe ekpere n'ikpe: Ewe b͕ochi ihe-otiti ahu.

31. Ewe guara ya nka n'ezi omume, Rue ọb͕ọ nile rua mb͕e ebighi-ebi.

32. Ha kpasu-kwa-ra Ya iwe na miri Meriba, O we jọrọ Moses njọ n'ihi ha:

33. N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru Mọ-Ya, O we were eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua kwue okwu efu.

34. Ha ekpochapughi ndi di iche iche ahu, Dika Jehova siri ha;

35. Ma ha gwakọtara onwe-ha na mba nile nke ala ahu, We muta ọlu nile ha:

36. Ha we fè arusi nile ha òfùfè; Arusi ahu we ghọrọ ha ọnyà:

37. Ọzọ, ha were umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom chuara ndi-mọ ọjọ àjà,

38. We wusi ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ, bú ọbara nke umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom, Ndi ha were chuara arusi nile nke Kenean àjà; Ewe were ọbara merua ala ahu.

39. Ewe were ọlu nile ha me ka ha buru ihe ruru árú, Ha we nākwa iko n'omume nile ha.

40. Iwe Jehova we di ọku n'aru ndi-Ya, O we kpọ ihe-nketa-Ya ihe-árú.

41. O we nye ha n'aka mba di iche iche; Ndi nākpọ ha asì we nāchi ha.

42. Ndi-iro-ha meb͕u-kwa-ra ha, Ewe me ka ha ruru ala n'okpuru aka-ha.

43. Ọtutu mb͕e ka Ọ nanaputa ha; Ma ha onwe-ha nānupu isi n'okpuru Chineke na ndum-ọdu-ha, Ewe kwada ha n'ajọ omume-ha.

44. O we lekwasi ahuhu diri ha anya, Mb͕e Ọ nuru iti-nkpu-ha:

45. O we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya nye ha, We chègharia dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.

46. O we me ha ka enwe obi-ebere nile n'aru ha N'iru ndi nile ndi nādọta ha n'agha.

47. Zọputa ayi, Jehova, bú Chineke-ayi, Chikọputa kwa ayi n'etiti mba nile Ikele aha nsọ Gi, Na inya isi n'otuto-Gi.

48. Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Ka ndi Israel nile si kwa, Amen. Tonu Ja.

About Abù Ọma Chapter 106

Read Abù Ọma Chapter 106 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Abù Ọma
Chapter: 106
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Abù Ọma Chapter 106 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Abù Ọma Chapter 106?

Abù Ọma Chapter 106 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 106 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Abù Ọma

  1. Abù Ọma Chapter 10
  2. Abù Ọma Chapter 3
  3. Abù Ọma Chapter 146
  4. Abù Ọma Chapter 98
  5. Abù Ọma Chapter 112
  6. Abù Ọma Chapter 147
  7. Abù Ọma Chapter 80

Explore More from Agba Ochie

  1. Nehemaia Chapter 5
  2. Jenesis Chapter 11
  3. Ọpupu Chapter 36
  4. Ọpupu Chapter 29
  5. Zekaraia Chapter 4
  6. Emos Chapter 1
  7. II. Ihe Emere Chapter 23

Related Chapters & Readings

  1. Ezikiel Chapter 22
  2. Luk Chapter 24
  3. Esta Chapter 2
  4. Matiu Chapter 17
  5. Ezikiel Chapter 15
  6. Hosea Chapter 9
  7. Abù Ọma Chapter 102
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *