Abù Ọma Chapter 139

For English

Read Abù Ọma Chapter 139 Online

Read Abù Ọma Chapter 139 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Abù Ọma 139

Isi 139

1. Jehova, I gwuputawo ala obim, I we maram.

2. Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm, I nāghọta èchìchèm nile site n'ebe di anya.

3. Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka, Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma.

4. N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem, Ma, le, Jehova, I machasiwo ya.

5. N'azu na n'iru ka I nọchigideworom, we tukwasi ọbu-aka-Gi n'arum.

6. Ọmuma-ihe di otú a dikaririm ebube; Ọ dika elu, apughm iru ya.

7. Òle ebe m'gālanari Mọ-Gi? Ma-ọbu òle ebe m'gēsi n'iru Gi b͕alaga?

8. Ọ buru na arigom n'elu-igwe, n'ebe ahu ka I nọ: Ọ buru kwa na ab͕asam utem n'ala-mọ, le, I nọ n'ebe ahu.

9. Ọ buru na achirim nkù nke ututu, Biri n'akuku dikarisiri anya nke oké osimiri,

10. Ọbuná n'ebe ahu ka aka-Gi gēdurum, Aka-nri-gi gējidekwam.

11. M'we si, N'ezie, ọchichiri gēkpuchim; Ma abali ghọrọ ìhè buruburum.

12. Ọbuná ọchichiri adighi-ab͕achiri Gi; Ma abali nēnye ìhè dika ehihie: Dika ọchichiri si di, otú a ka ìhè di n'anya-Gi

13. N'ihi na Gi onwe-gi enwetawo akurum abua: I nākpam n'afọ nnem dika esi ákpa ákwà.

14. M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu: Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di; Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma.

15. Ọkpukpum ezopughi n'anya-Gi, Mb͕e emerem na nzuzo, Mb͕e adurum nke-ọma, dika onye-ọ̀kà-ọdudu-ákwà si adu, n'ebe nile di ala nke uwa.

16. Anya-Gi abua huru arum mb͕e o kēzughi okè, Ọ bu kwa n'akwukwọ-Gi ka edere ihe nile dim n'aru, Nke akpuru kwa-ubọchi, Mb͕e ọ dighi otù ihe di nime ha.

17. Le ka èchìchè-Gi nile si di oké ọnu-ahia n'anyam, Chineke! Le ka ọnu-ọgugu nile ha si di uku ri nne!

18. Ọ buru na aguam ha ọnu, ha bara uba kari ájá: Mb͕e m'tetaworo, mu na I nānọgide.

19. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I b͕ue onye nēmebi iwu, Chineke: Ya mere, unu ndi-ọbara, sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu.

20. Ha bu ndi nēkwu okwu megide Gi nime nzube ọjọ, Ndi ebuliworo nye ihe-efu ka ndi-iro-Gi bu.

21. Ọ̀ bughi ndi nākpọ Gi asì, jehova, ka m'nākpọ asì? Ọ̀ bughi kwa ndi nēbili imegide Gi ka m'nāsọ oyi?

22. Ọ bu ikpọ-asì nke zuru okè ka m'ji kpọ ha asì: Ndi-iro ka ha burum.

23. Gwuputa ala obim, Chineke, we mara obim: Nānwam, we mara iche-uchem nile:

24. Hu kwa ma ọ di uzọ ọ bula nēweta ihe-nb͕u di nimem, Durukwam n'uzọ ebighi-ebi.

About Abù Ọma Chapter 139

Read Abù Ọma Chapter 139 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Abù Ọma
Chapter: 139
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Abù Ọma Chapter 139 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Abù Ọma Chapter 139?

Abù Ọma Chapter 139 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 139 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Abù Ọma

  1. Abù Ọma Chapter 10
  2. Abù Ọma Chapter 3
  3. Abù Ọma Chapter 146
  4. Abù Ọma Chapter 98
  5. Abù Ọma Chapter 112
  6. Abù Ọma Chapter 147
  7. Abù Ọma Chapter 80

Explore More from Agba Ochie

  1. Abù Ọma Chapter 45
  2. Aisaia Chapter 14
  3. Abù Ọma Chapter 46
  4. Abù Ọma Chapter 12
  5. Ezikiel Chapter 41
  6. Jeremaia Chapter 21
  7. Levitikọs Chapter 19

Related Chapters & Readings

  1. Aisaia Chapter 19
  2. I. Ihe Emere Chapter 15
  3. Job Chapter 8
  4. Mak Chapter 9
  5. Joshua Chapter 6
  6. Aisaia Chapter 29
  7. I. Ndi-Eze Chapter 19
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *