Read Ndi-Ikpe Chapter 14 Online
Read Ndi-Ikpe Chapter 14 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Ikpe in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi-Ikpe and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ndi-Ikpe 14
Isi 14
1. Samson we ridarue Timna, hu otù nwayi nime Timna sitere n'umu-ndinyom ndi Filistia.
2. O we rigota, gosi nna-ya, gosi kwa nne-ya, si, Ahuwom otù nwayi nime Timna sitere n'umu-ndinyom ndi Filistia: ma ub͕u a, lutaram ya na nwunye.
3. Nna-ya na nne-ya we si ya, Ọ̀ dighi nwayi di n'etiti umu-ndinyom umu-nne-gi, ma-ọbu n'etiti ndim nile, na gi onwe-gi nēje iluru nwunye sitere na ndi Filistia, bú ndi anēbìghi úgwù? Samson we si nna-ya, Lutaram ya; n'ihi na ya onwe-ya ziri ezi n'anyam.
4. Ma nna-ya na nne-ya amaghi na ọ bu Jehova ka o sitere n'aka; n'ihi na uzọ Ọ gēsi megide ndi Filistia ka ya onwe-ya nāchọ. Ma na mb͕e ahu ndi Filistia nāchi Israel.
5. Samson we rida, ya na nna-ya na nne-ya, rue Timna, ha we biarue ubi-vine Timna: ma, le, nwa-ọdum tozuru etozu nāb͕ọ uja izute ya.
6. Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we dọwa ya dika ọ gādọwa nwa-ewu, ma ọ dighi ihe o ji n'aka-ya: ma o gosighi nna-ya, o gosighi kwa nne-ya, ihe o mere.
7. Ọ we rida, gwa nwanyi ahu okwu; o ziri ezi n'anya Samson.
8. Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, o we jeghachi ikuru ya, o we wezuga onwe-ya ihu ozu ọdum ahu: ma, le, ìgwè aṅu di n'ozu ọdum ahu, na manu-aṅu.
9. O we rara manu-aṅu ahu n'ọbu-aka-ya abua, we nēje, nāracha ya ka ọ nēje, o we jekuru nna-ya, jekuru kwa nne-ya, nye ha, ha we racha: ma o gosighi ha na ọ bu n'ozu ọdum ka o siri rara manu-aṅu ahu.
10. Nna-ya we ridakuru nwayi ahu: Samson we me oké oriri n'ebe ahu; n'ihi na otú a ka umu-okorọbia nēme.
11. O rue, mb͕e ha huru ya, na ha chitara orú eyì na iri ka ha nọyere ya.
12. Samson we si ha, Biko, ka m'luere unu ilu: ọ buru na unu egosim ya nke-ọma n'ubọchi asa nke oké oriri a, ọ buru na unu achọta ya, m'gēnye kwa unu orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri:
13. ma ọ buru na unu apughi igosim ya, unu onwe-unu gēnyekwan orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri. Ha we si ya, Lue ilu-gi, ka ayi we nu ya.
14. O we si ha, N'aru onye nēri eri ka ihe-oriri si puta, N'aru ihe di ike ka ihe-utọ si puta kwa. Ma ha apughi igosi ilu ahu n'ubọchi atọ.
15. O rue, n'ubọchi nke-asa, na ha siri nwunye Samson, Rà di-gi ọnu, ka o we gosi ayi ilu ahu, ka ayi we ghara isure gi na ulo nna-gi n'ọku: ọ̀ bu inapu ayi ihe nile ayi nwere ka unu kpọrọ ayi? ọ̀ bughi otú a?
16. Nwunye Samson we kwakwasi ya ákwá, si, Nání asì ka i nākpọm, i hughkwam n'anya: i luworo umu ndim ilu, ma mu ka i nēgosighi ya. Ọ si ya, Le, nnam na nnem ka m'nēgosighi ya, ọ̀ bu kwa gi ka m'gēgosi ya?
17. O we nākwasi ya ákwá n'ubọchi asa ahu, nke oké oriri-ha diruru: o rue, n'ubọchi nke-asa, na o gosiri ya, n'ihi na ọ kpagidesiri ya ike: o we gosi umu ndi-ya ilu ahu.
18. Ndikom obdo ahu we si ya n'ubọchi nke-asa tutu anyanwu ada, Gini di utọ kari manu-aṅu? ma-ọbu gini di ike kari ọdum? O we si ha, Ọ buru na unu ejighi nwa-ab͕ọghọ-ehim dọ ihe eji gwu ala-ubi, Unu agaghi-achọtawori ilum.
19. Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we ridarue Ashkelon, tib͕ue orú ndikom na iri n'etiti ha, chiri ihe-ha ọ lutara, nye ndi gosiworo ilu ahu uwe nb͕anwe. Iwe-ya we di ọku, o we rigorue ulo nna-ya.
20. Nwunye Samson we ghọrọ nwoke-ibe Samson nwunye, bú nwoke nke Samson buru ya eyì.
About Ndi-Ikpe Chapter 14
Read Ndi-Ikpe Chapter 14 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Ikpe in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ndi-Ikpe
Chapter: 14
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi-Ikpe. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ndi-Ikpe Chapter 14 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ndi-Ikpe Chapter 14?
Ndi-Ikpe Chapter 14 is part of the Book of Ndi-Ikpe in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ndi-Ikpe Chapter 14 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
Explore More from ndi-ikpe
- Ndi-Ikpe Chapter 2
- Ndi-Ikpe Chapter 9
- Ndi-Ikpe Chapter 6
- Ndi-Ikpe Chapter 7
- Ndi-Ikpe Chapter 5
- Ndi-Ikpe Chapter 8
- Ndi-Ikpe Chapter 16