Ilu Chapter 31

For English

Read Ilu Chapter 31 Online

Read Ilu Chapter 31 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ilu 31

Isi 31

1. Okwu Lemuel, bú eze; ibu eboro ya nke nne-ya ji dọ ya aka na nti.

2. Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm? Gini kwa, nwa nke nkwa nile m'kwere?

3. Enyela ndinyom ike-gi, Enye-kwa-la ihe nēbibi ndi-eze uzọ-gi nile.

4. Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine; Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di?

5. Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ, We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n'ala.

6. Nyenu onye nāla n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine:

7. Ya ṅua, we chezọ ob͕eye ọ bu, Ghara kwa icheta ọnọdu ọjọ ya ọzọ.

8. Saghere onye-ob͕i ọnu-gi, N'okwu-ikpe nke ndi nile nāla n'iyì.

9. Saghe ọnu-gi, kpe ikpe n'ezi omume, Kpeputa kwa onye ewedara n'ala na ob͕eye.

10. Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya? N'ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku.

11. Obi di-ya atukwasiwo ya obi, Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu.

12. Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ, Ubọchi nile nke ndu-ya.

13. Ọ chọwo aji-anu na flax, We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ.

14. Ọ di ka ub͕ọ onye-ahia; Site n'ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya.

15. O nēbili kwa mb͕e abali nādi kwa, We nye ulo-ya nri, Nye kwa umu-ab͕ọghọ-ya òkè-ha.

16. O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya: Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine.

17. O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké, Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume.

18. Ọ matawo na ihe-ahia-ya di nma: Oriọna-ya adighi-anyu n'abali.

19. Aka-ya abua ka o setiworo n'osisi ikuku ogho, Ọbu-aka-ya abua ejidesiwo kwa ozele ike.

20. Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n'ala; E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru.

21. Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe; N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie.

22. Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya; Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu.

23. Onye amara n'ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu, Mb͕e ọ nānọdu n'etiti ndi-okenye ala.

24. Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya; Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia.

25. Ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya; Ọ nāchì kwa ubọchi di n'iru ọchì.

26. Ọnu-ya ka ọ sagheworo n'amam-ihe; Iwu nke ebere dikwasi kwa n'ire-ya.

27. Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma, Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri.

28. Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma; Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si:

29. Ọtutu umu-ndinyom emewo omume kwesiri ndinyom nējide onwe-ha nke-ọma, Ma gi onwe-gi kachasi ha nile.

30. Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu: Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto

31. Nyenu ya ihe sitere na nke aka-ya abua lutara; Ka ọlu-ya nile to kwa ya n'ọnu-uzọ-ama nile.

About Ilu Chapter 31

Read Ilu Chapter 31 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ilu
Chapter: 31
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ilu Chapter 31 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ilu Chapter 31?

Ilu Chapter 31 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ilu Chapter 31 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 7
  6. Esta Chapter 4
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Ilu

  1. Ilu Chapter 2
  2. Ilu Chapter 9
  3. Ilu Chapter 5
  4. Ilu Chapter 12
  5. Ilu Chapter 25
  6. Ilu Chapter 21
  7. Ilu Chapter 23

Related Chapters & Readings

  1. Ọpupu Chapter 11
  2. Jenesis Chapter 14
  3. Ọnu-Ọgugu Chapter 15
  4. Daniel Chapter 10
  5. Deuteronomi Chapter 31
  6. Maika Chapter 4
  7. II. Ndi-Eze Chapter 9
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *