Read Ezra Chapter 1 Online
Read Ezra Chapter 1 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ezra in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ezra and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ezra 1
Isi 1
1. Ma n'arọ mbu nke Sairọs, bú eze Peasia, ka okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia we rè, Jehova kpọtere mọ nke Sairọs, bú eze Peasia, o we kwusa n'ala-eze-ya nile, ọzọ kwa, o tiyere ya n'odide-akwukwọ, si,
2. Otú a ka Sairọs, bú eze Peasia, siri, Ala-eze nile nke uwa ka Jehova, bú Chineke elu-igwe, nyeworom; Ya onwe-ya me-kwa-ram ka m'buru onye-nlekọta n'iwuru Ya ulo nime Jerusalem, nke di na Juda.
3. Ònye nọ n'etiti unu site na ndi-Ya nile? ka Chineke-ya nọyere ya, ya rigoru kwa Jerusalem, wue ulo Jehova, bú Chineke Israel, (Ya onwe-ya bu Chineke,) nke di na Jerusalem.
4. Ma onye ọ bula nke fọduru afọdu, site n'ebe nile ebe onye ahu nọ dika ọbìa, ka ndikom nke ebe-ya were ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo, ya na onyinye-afọ-ofufo-ha nke diri ulo Chineke nke di na Jerusalem, yere ya aka.
5. Ndi-isi ulo nke ndi bu nna Juda na Benjamin, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, bú onye ọ bula Chineke kpọtere mọ-ya, we bilie irigo iwu ulo Jehova nke di na Jerusalem.
6. Ndi nile nke nọ ha buruburu we were ihe ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo na ihe di oké ọnu-ahia, nāgughi ihe nile enyere n'afọ-ofufo, me ka aka-ha di ike.
7. Eze, bú Sairọs, chiputa-kwa-ra ihe ulo Jehova, nke Nebukadneza chipuru na Jerusalem tiye n'ulo ndi-chi-ya:
8. Sairọs, bú eze Peasia, we chiputa ha site n'aka Mitredat, bú odozi-àkù, gua ha nye Sheshbaza, bú onye-isi Juda.
9. Nka bu kwa ọnu-ọgugu-ha: orú ọkwa ọla-edo na iri, na nnù ọkwa ọla-ọcha abua na ọgu iri, na orú mma na iteghete;
10. orú ọkwa ntà ọla-edo na iri, na nnù ọkwa ntà ọla-ọcha na iri nke-abua di iche, na nnù ihe ọzọ abua na ọgu iri.
11. Ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha di nnù iri-na-atọ na ọgu iri. Ha nile ka, Sheshbaza chigotara, mb͕e ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ siri na Babilon rigorue Jerusalem.
About Ezra Chapter 1
Read Ezra Chapter 1 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ezra in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ezra
Chapter: 1
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ezra. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ezra Chapter 1 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ezra Chapter 1?
Ezra Chapter 1 is part of the Book of Ezra in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ezra Chapter 1 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5