Read Job Chapter 22 Online
Read Job Chapter 22 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Job 22
Isi 22
1. Elifaz, bú onye Timan, we za, si,
2. Ọ̀ bu Chineke ka madu nābara n'ihe? É-è, kama onye nwere uche nābara onwe-ya n'ihe.
3. Ọ̀ nātọ Onye puru ime ihe nile utọ na i bu onye ezi omume? Ma-ọbu ọ̀ bu urù n'ebe Ọ nọ na i nēme ka uzọ-gi nile zue okè?
4. Ọ̀ bu egwu-gi kpatara O ji bara gi nba, We so gi ba n'ikpé?
5. Ìhe ọjọ gi abaghi uba? Ọ dighi kwa nsọtu diri ajọ omume-gi.
6. N'ihi na i narawo nwa-nne-gi ihe-ibe n'efu, Uwe nile nke ndi b͕a ọtọ ka i nēyipu kwa.
7. I dighi-eme ka onye nāda #mbà ṅua miri, I nēb͕ochi kwa nri n'ebe onye-agu nọ.
8. Ma nwoke nke ogwe-aka-ya di ike, ọ bu ya nwe uwa; Onye anāhu iru-ọma nēbi kwa nime ya.
9. I zipuwo ndinyom di-ha nwuru n'aka efu, Anānyaji kwa ogwe-aka nke umu-nb͕ei.
10. N'ihi ya ib͕udu di gi buruburu, Oké egwu mberede nāma kwa gi jijiji,
11. Ma-ọbu ọchichiri, nke i nādighi-ahu anya, Na njubiga miri nēkpuchi gi.
12. Chìneke anọghi n'ebe di elu nke elu-igwe? Le kwa idi-elu kpakpando, na ha di elu!
13. I we si, Gini ka Chineke mara? Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe?
14. Igwe-oji b͕ara ọchichiri nāburu Ya ebe-nzuzo, Ọ dighi-ahu kwa uzọ; Ọ bu kwa buruburu elu-igwe ka Ọ nējeghari.
15. Ì gēdebe uzọ ochie, Nke ndikom nēme ajọ ihe zọkwasiworo ukwu?
16. Bú ndi apunara, ma mb͕e-ha akērughi, Ndi awusiri ntọ-ala-ha dika osimiri:
17. Ndi nāsi Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi: Ọzọ, Gini ka Onye puru ime ihe nile gēmere ha?
18. Ma Ya onwe-ya mejuru ulo nile ha n'ezi ihe: Ma ndum-ọdu ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.
19. Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria; Onye nēmeghi ihe ọjọ nāchì kwa ha ọchì:
20. Si, N'ezie ezopuwo ha n'uwa, bú ndi nēbili imegide ayi, Ọku eripiawo kwa ihe-ha fọduru.
21. Biko, mara Ya nke-ọma, we nọ n'udo: Nime ihe ndia ka ọdi-nma gābiakute gi.
22. Biko, nara iwu n'ọnu-Ya, Do kwa okwu-Ya nile n'obi-gi.
23. Ọ buru na i laghachikute Onye puru ime ihe nile, agēwuli gi elu dika ulo; I gēme ka ajọ omume di anya n'ebe ulo-ikwū-gi nile di.
24. Tọb͕ọ kwa àkù-gi n'elu ájá, Na ọla-edo Ofia n'etiti nkume miri-iyi;
25. Onye puru ime ihe nile gābu kwa àkù-gi, Ọla-ọcha di oké ọnu-ahia ka Ọ gābu-kwa-ra gi.
26. N'ihi na mb͕e ahu ihe nke onye puru ime ihe nile gātọ gi utọ, I gēwelite-kwa-ra Chineke iru-gi.
27. I gāriọ Ya aririọ, Ọ gānu kwa gi; I gākwughachi kwa nkwa-gi nile.
28. I gēkwubì kwa okwu, ewe me ka o guzosiere gi ike; Ìhè gāmukwasi kwa uzọ-gi nile.
29. Mb͕e ha gēme ka i di ala, i gāsi, Nweli-elu di; Onye anya-ya ruru ala ka Ọ gāzọputa kwa.
30. Ọ gēme ka onye nābughi onye nēmeghi ihe ọjọ wepuga onwe-ya: E, o werewo idi-ọcha nke ọbu-aka-gi abua wepuga onwe-ya.
About Job Chapter 22
Read Job Chapter 22 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Job
Chapter: 22
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Job Chapter 22 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Job Chapter 22?
Job Chapter 22 is part of the Book of Job in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Job Chapter 22 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5