Read Aisaia Chapter 21 Online
Read Aisaia Chapter 21 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Aisaia and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Aisaia 21
Isi 21
1. Ibu eboro ọzara nke oké osimiri. Dika oké ifufe nke di nime Negeb nēfebiga, n'ọzara ka o siworo bia, site n'ala di egwu.
2. Ọhù siri ike ka egosiworom; onye-nghọb͕u nāghọb͕u, onye nāpunara madu ihe nāpunara madu ihe. Rigo, gi Ilam; nọchigide n'agha, gi Midia; ize-ume-ya nile ka M'meworo ka ọ kwusi.
3. N'ihi nka ka úkwùm juputara na nb͕ali; aru-ufu ka m'nwezuru, dika aru-ufu nile nke nwayi ime nēme: ab͕agọrọm ab͕agọ, m'we ghara inu ihe; amaram jijiji, m'we ghara ihu uzọ.
4. Obim akpafuwo, oké ọma-jijiji emewo ka m'tua egwu nke-uku: chi-ojiji nke dim ezi nma ka o meworo ka ọ ghọrọm ima-jijiji.
5. Ha nēdozi table, che nche, rie ihe, ṅua ihe-ọṅuṅu: bilienu, ndi-isi, tenu ọta manu.
6. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Je, guzo onye-nche: ihe ọ gāhu ka ọ gēgosi:
7. ma ọ buru na ọ hu usu madu, ndi-inyinya nēje abua abua, usu inyinya-ibu, usu camel, ọ gāṅa nti nāṅasi nti ike nke-uku.
8. O we kpọ dika ọdum: si, Onye-nwe-ayi, n'elu ulo-nche ka mu onwem nēguzo mb͕e nile n'ehihie, na nchem ka anēme ka mu onwem guzo n'abali nile:
9. ma, le, ub͕u a ka usu madu nābia, ndi-inyinya nēje abua abua. O we za, si, Ọ dawo, Babilon adawo; ọzọ, arusi nile apiri api nke chi-ya nile ka etipiaruworo ala.
10. Gi ihe-nzọcham, na nwa nke ebe-nzọcha-ọkam: ihe m'nuworo n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ka m'gosiworo unu.
11. Ibu eboro Duma. Mu ka otù onye nākpọ òkù site na Sia, si, Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n'abali? Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n'abali?
12. Onye-nche siri, Ututu abiawo, ma abali abiawo kwa: ọ buru na unu gāju ase, juanu ase: laghachinu, bia.
13. Ibu ebero Arebia. N'oké ọhia di n'Arebia ka unu gānọ ọnọdu-abali, unu usu-ije nile nke ndi Dedan.
14. Izute onye akpiri nākpọ nku kutanu miri; unu ndi bi n'ala Tima, werenu nri kwesiri ya zute onye nāwaghari.
15. N'ihi na n'iru ọtutu mma-agha ka ha siri wagharia, n'iru mma-agha amiputara amiputa, na n'iru uta azọrọ ukwu ikwe ya, na n'iru ibu di arọ́ agha bu.
16. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Tutu otù arọ agwu, dika arọ onye egoro ọlu si di, nsọpuru nile nke Kida gāgwusi:
17. ndi fọduru n'ọnu-ọgugu ndi-uta, bú ndi-dike nke umu Kida, ewe di ole-na-ole: n'ihi na Jehova, bú Chineke nke Israel, ekwuwo ya.
About Aisaia Chapter 21
Read Aisaia Chapter 21 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Aisaia
Chapter: 21
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Aisaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Aisaia Chapter 21 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Aisaia Chapter 21?
Aisaia Chapter 21 is part of the Book of Aisaia in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Aisaia Chapter 21 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
Explore More from Aisaia
- Aisaia Chapter 20
- Aisaia Chapter 54
- Aisaia Chapter 36
- Aisaia Chapter 25
- Aisaia Chapter 9
- Aisaia Chapter 33
- Aisaia Chapter 45