Job Chapter 19

For English

Read Job Chapter 19 Online

Read Job Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Job 19

Isi 19

1. Job we za, si,

2. Rùe ole mb͕e unu gēme ka nkpuru-obim rue újú? Rùe ole mb͕e unu gēwere okwu zọpiam?

3. Ub͕ò iri ndia ka unu nēme ka ihere mem: Ihere adighi-eme unu na unu nēmejọm.

4. Ọzọ kwa, ọ bu ezie na emehiewom n'amaghi-ama, Ma n'ebe m'nọ ka nmehiem m'mehiere n'amaghi-ama di.

5. Ọ buru na ọ bu ezie na ọ bu imegidem ka unu nēme onwe-unu uku, Ọ buru kwa na unu ewere ita-utam som ru uka:

6. Maranu ub͕u a na Chineke merem ka m'bagọ ab͕agọ, Na O siwo-kwa-ram ọnyà-Ya buruburu.

7. Le, anameti nkpu, si, Ihe-ike! ma adighi-azam: Anametiku Chineke, ma ikpé adighi.

8. Ọ b͕achiwo okporo-uzọm, m'gaghi-agabiga kwa, N'uzọm nile ka Ọ nēdokwasi kwa ọchichiri.

9. O yipuwo nsọpurum n'arum dika uwe, We wezuga okpu-eze n'isim.

10. Ọ nākwatum buruburu, m'we la: O we ropu olile-anyam dika osisi.

11. O me ka iwe-Ya di ọku imegidem, Ọ guaram Onwe-ya dika ndi nēmegide Ya.

12. Usu-Ya nile ndi nāpunara madu ihe nābiakọta, tulie uzọ-ha imegidem, Ma kwa ulo-ikwū-ha buruburu ulo-ikwūm.

13. O mewo ka umu-nnem nọpurum n'ebe di anya, Ndi maworom we ghọ nání ndi ala ọzọ n'ebe m'nọ.

14. Ndi-ab͕ata-obim akwusiwo, Ndi m'mara echezọwokwam.

15. Ndi nọ n'ulom dika ọbìa na ndi-orum nwayi nāgum n'onye ala ọzọ: Onye anāmataghi ka m'ghọworo n'anya-ha.

16. Akpọwom arùm òkù, ma ọ dighi-azam, Anameji ọnum riọ ya aririọ-amara.

17. Iku-umem aghọwo iku-ume onye nābughi di-ya n'ebe nwunyem nọ, Ariọwokwam umu afọ nnem aririọ-amara.

18. Ọbuná umu nāṅu ara ajuwom; Ọ buru na ebiliem, ha we nēkwugidem.

19. Ndi-ìzum nile nākpọm ihe-árú: Ndi ahu m'huru n'anya echighariwo imegidem.

20. Ọkpukpum nārapara n'akpukpọ-arum na n'anu-arum, M'we were akpukpọ ezém wepuga onwem.

21. Merenum amara, merenum amara, unu onwe-unu, bú ndi-eyìm; N'ihi na aka Chineke emetuwom n'aru.

22. N'ìhi gini ka unu nāchum dika Chineke? N'ìhi gini ka anu-arum adighi-eju unu afọ?

23. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ede okwum nile n'akwukwọ ub͕u a! Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na akà ha n'akwukwo!

24. Ma asi na eji pen ígwè na òpù Ka ha n'oké nkume rue mb͕e ebighi-ebi!

25. Ma mu onwem amawo na Onye-nb͕aputam di ndu, Na O gēbili kwa ọtọ n'elu ájá n'ikpe-azu:

26. Mb͕e emebisi-kwa-ra akpukpọ-arum nka, Ọ bu na m'gēsi n'anu-arum hu Chineke:

27. Onye mu onwem gāhuru onwem, Anyam abua gāhu kwa Ya, Ọ bughi kwa onye ala ọzọ. Akurum abua agwusiwo n'imem.

28. Ọ buru na unu asi, Àyi gēsi aṅa chu ya? Ma achọtawo nkpọrọgwu okwu nimem;

29. Tuanu ujọ n'iru mma-agha: N'ihi na ọnuma nēweta ahuhu-ajọ-omume nile nke mma-agha, Ka unu we mara na ikpé di.

About Job Chapter 19

Read Job Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Job
Chapter: 19
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Job Chapter 19 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Job Chapter 19?

Job Chapter 19 is part of the Book of Job in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Job Chapter 19 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Esta Chapter 7
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Job

  1. Job Chapter 28
  2. Job Chapter 11
  3. Job Chapter 27
  4. Job Chapter 17
  5. Job Chapter 3
  6. Jób Chapter 26
  7. Job Chapter 4

Related Chapters & Readings

  1. Ndi-Ikpe Chapter 15
  2. Nkpugh Chapter 13
  3. Ndi-Ikpe Chapter 1
  4. Taitọs Chapter 2
  5. Job Chapter 29
  6. I. Ihe Emere Chapter 22
  7. Ndi-Ikpe Chapter 12
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *