Read Jọn Chapter 21 Online
Read Jọn Chapter 21 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jọn and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Jọn 21
Isi 21
1. Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus mere Onwe-ya ka Ọ puta ìhè ọzọ nye ndi nēso uzọ-Ya n'oké osimiri Taibirias; ma O mere Onwe-ya ka Ọ puta ìhè otú a.
2. Saimon Pita, na Tomas anākpọ Didimọs, na Nataniel, bú onye Kena nke Galili, na umu nke Zebedi, na madu abua ọzọ nime ndi nēso uzọ-Ya, nọkọrọ n'otù ebe.
3. Saimon Pita si ha, Anamaga ib͕u azù. Ha si ya, Ayi onwe-ayi gēso kwa gi je. Ha puru, ba n'ub͕ọ-ha; ma n'abali ahu ha egbughi ihe ọ bula.
4. Ma mb͕e chi nābọ ub͕u a, Jisus guzoro n'ótú: otú ọ di, ndi nēso uzọ-Ya amataghi na ọ bu Jisus.
5. Ya mere Jisus si ha, Umu-ntakiri, ùnu ji ihe-oriri ọ bula? Ha zara Ya, si, É-è.
6. O we si ha, Wuyenu ihe unu ji eb͕u azù n'akuku aka-nri nke ub͕ọ, unu gāhu kwa. Ya mere ha wuyere ya, ma ub͕u a ha enweghi ike idọ ya n'ihi ọtutu azù di ya.
7. Ya mere onye ahu nke nēso uzọ-Ya onye Jisus huru n'anya siri Pita, Ọ bu Onye-nwe-ayi. Ya mere mb͕e Saimon Pita nuru na ọ bu Onye-nwe-ayi, o b͕okwasi uwe uku ya (n'ihi na ọ b͕ara ọtọ), we tubà onwe-ya nime oké osimiri.
8. Ma ndi ọzọ ndi nēso uzọ Jisus biara n'ub͕ọ ntà ha (n'ihi na ha anọghi n'ebe di anya n'ala, kama ihe ra ka ọgu cubit iri), nādọ ihe ha ji eb͕u azù nke azù juru nime ya.
9. Ya mere mb͕e ha ridara n'ala, ha hu ọku icheku n'ebe ahu, na azù atukwasiri ya, na ob͕e achicha.
10. Jisus si ha, Wetanu ufọdu nime azù unu b͕uru ub͕u a.
11. Ya mere Saimon Pita rigoro, dọrọ ihe ha ji eb͕u azù bia n'ala, nke oké azù juru nime ya, ọgu azù asa na iri na atọ: ma ọ bu ezie na azù di ọtutu otú a, ma ihe ha ji eb͕u azù adọkaghi.
12. Jisus si ha, Bianu, rie nri-ututu. Ma ọ dighi onye ọ bula nime ndi nēso uzọ-Ya nwere anya-ike iju Ya, si, Gì onwe-gi bu onye? n'ihi na ha matara na ọ bu Onye-nwe-ayi.
13. Jisus bia, were achicha ahu, nye ha, azù ahu kwa otú ahu.
14. Nka mere ya ub͕ò atọ emere ka Jisus puta ìhè nye ndi nēso uzọ-Ya, mb͕e emesiri ka O si na ndi nwuru anwu bilie.
15. Ya mere mb͕e ha risiri nri-ututu-ha, Jisus si Saimon Pita, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya kari ndia? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nēnye umu-aturum nri.
16. Ọ si ya ọzọ nke ub͕ò abua, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nāzù aturum.
17. Ọ si ya nke ub͕ò atọ, Saimon, nwa Jọn, àbum eyì-gi? O wutara Pita na Ọ siri ya nke ub͕ò atọ, Àbum eyì-gi? O we si Ya, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi matara ihe nile; Gi onwe-gi mara na I bu eyìm. Jisus si ya, Nēnye aturum nri.
18. N'ezie, n'ezie, asim i, Mb͕e i di n'okorọbia, i nēke onwe-gi ihe-ọkiké n'úkwù, nējeghari kwa ebe i nāchọ: ma mb͕e i gēme agadi, i gēseti aka-gi abua, onye ọzọ gēke gi ihe-ọkiké n'úkwù, būru kwa gi ga ebe i nāchọghi.
19. Ma nka ka O kwuru, nēgosi aha ọnwu ọ gēji nye Chineke otuto. Mb͕e O kwusiri nka, Ọ si ya, Som.
20. Pita we chigharia, hu onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Jisus huru n'anya, ka o nēso; onye nādabere kwa n'obi-Ya na nri-anyasi ahu, si, Onye-nwe-ayi, ònye bu onye ahu nke nārara Gi nye?
21. Ya mere Pita, mb͕e ọ huru ya, ọ si Jisus, Onye-nwe-ayi, ma onye a, gini gēme ya?
22. Jisus si ya, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M'gābia, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ? gi onwe-gi som.
23. Ya mere okwu a putara n'etiti umu-nna nime Kraist, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya agaghi-anwu: ma Jisus asighi ya, na ọ gaghi-anwu; kama, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M'gābia, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ?
24. Nka bu onye ahu nēso uzọ Jisus nke nāb͕ara ihe ndia àmà, nke de-kwa-ra ihe ndia n'akwukwọ: ayi mata-kwa-ra na àmà-ya bu ezie.
25. Ma ọtutu ihe ọzọ nke Jisus mere di kwa, nke, ma ọ buru na edere ha n'akwukwọ n'otù n'otù, ọ dim ka ọbuná uwa onwe-ya agaghi-anagide akwukwọ agēde.
About Jọn Chapter 21
Read Jọn Chapter 21 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Jọn
Chapter: 21
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jọn. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Jọn Chapter 21 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Jọn Chapter 21?
Jọn Chapter 21 is part of the Book of Jọn in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Jọn Chapter 21 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6