Read Emos Chapter 4 Online
Read Emos Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Emos in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Emos and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Emos 4
Isi 4
1. Nurunu okwu a, unu nne-ehi nke Beshan, ndi nọ n'ugwu Sameria, ndi nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, ndi nāzọpia umu-ob͕eye, ndi nāsi ndi-nwe-ha, Wetanu, ka ayi ṅua.
2. Onye-nwe-ayi Jehova ejiwo idi-nsọ-Ya ṅua iyi, si, na le, ubọchi nābiakwasi unu, mb͕e agāchiri nkò bupu unu, chiri kwa nkò azù bupu ndi-unu fọduru.
3. Ọ bu kwa ntipú-mb͕idi di iche iche ka unu gēsi pua, nwanyi ọ bula na ncherita-iru ya; unu gātubà onwe-unu na Hamon; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
4. Bianu na Bet-el, jehie; bianu na Gilgal, me ka njehie ba uba; chibata-kwa-nu ihe-àjà-unu kwa-ututu, chibata ihe nile bu otù uzọ n'uzọ iri unu kwa ubọchi atọ;
5. sure-kwa-nu àjà-ekele dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ site n'achicha ekoro eko, kpọsa-kwa-nu onyinye-afọ-ofufo di iche iche, me ka anuru ihe bayere ha: n'ihi na ihe di otú a ka unu huworo n'anya, umu Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
6. Mu onwem kwa, enyewom unu ezé nwuru enwu n'obodo nile unu, na ukọ nri n'ebe nile unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu jehova puta.
7. Ọzọ kwa, Mu onwem eb͕ochiworo unu oké miri-ozuzo, mb͕e ọnwa atọ fọduru iru mb͕e owuwe-ihe-ubi: eme-kwa-ram ka o zokwasi otù obodo, ma adighm-eme ka o zokwasi obodo ọzọ: otù òkè ala-ubi ka o nēzokwasi, ma òkè ala-ubi ahu nke ọ nādighi-ezokwasi nākpọnwu akpọnwu.
8. Obodo abua ma-ọbu atọ ewe ṅagharia rue otù obodo iṅu miri, ma ha adighi-aṅuju afọ: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
9. Ejirim nchakpọ, ji kwa ọmuma-ebù, tib͕ue unu: ka ha rà, bú ubi-unu ab͕ara ogige, na ubi-vine-unu, na osisi fig unu, na osisi olive unu, palmer-worm nērichapu ha: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
10. Ezitewom ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu n'uzọ o si eme n'Ijipt: eb͕uwom umu-okorọbia-unu na mma-agha, ha na inyinya nile unu adọtara n'agha; M'we me ka ísì ọjọ nke ọmuma-ulo-ikwū-unu rigota ọbuná n'imi-unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
11. Akwatuwom ufọdu n'etiti unu, dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra, unu we di ka ọlọkọ-ọku alọputara n'orire-ọku: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
12. N'ihi nka ka M'gēme gi otú a, gi Israel: ebe ọ bu nka ka M'gēme gi, jikere izute Chineke-gi, gi Israel.
13. N'ihi na, le, Onye nākpu ugwu nile, Nke nēkè kwa ifufe, Nke nēgosi kwa madu ihe bu ntughari-uche-ya, Onye nēme chi-ọbubọ ka ọ b͕a oké ọchichiri, Nke nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke uwa; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bu aha-Ya.
About Emos Chapter 4
Read Emos Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Emos in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Emos
Chapter: 4
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Emos. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Emos Chapter 4 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Emos Chapter 4?
Emos Chapter 4 is part of the Book of Emos in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Emos Chapter 4 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Emos Chapter 1
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Eklisiastis Chapter 2