I. Samuel Chapter 26

For English

Read I. Samuel Chapter 26 Online

Read I. Samuel Chapter 26 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Samuel in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of I. Samuel and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

I. Samuel 26

Isi 26

1. Ndi Zif we biakute Sọl rue Gibea, si, Devid, ọ̀ dighi-ezo onwe-ya n'ugwu ntà Hakila, nke di n'iru ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu?

2. Sọl we bilie, rida rue ọzara Zif, ya na nnù ndikom asa na ọgu iri, ndi arọputara nke Israel, ichọ Devid n'ọzara Zif.

3. Sọl we ma ulo-ikwū-ya n'ugwu ntà Hakila, nke di n'iru ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu, n'akuku uzọ. Ma Devid nānọdu n'ọzara, ọ hu na Sọl abiawo, nēso ya n'azu rue ọzara.

4. Devid we ziga ndi-nledo, mara na Sọl abiawo n'ebe o dozisiri onwe-ya.

5. Devid we bilie, biarue ebe Sọl mara ulo-ikwū-ya: Devid we hu ebe ahu, bú ebe Sọl nēdina, ya na Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya: ma Sọl nēdina n'ebe anēdebe ub͕ọ-ala, ndi Israel nānọ kwa n'ulo-ikwū buruburu ya.

6. Devid we za, si Ahimelek, bú onye Het, si kwa Abishai nwa Zeruaia, bú nwa-nne Joab, si, Ònye gēsorom ridakuru Sọl, rue ọmuma-ulo-ikwū? Abishai we si, Mu onwem gēsoro gi rida.

7. Devid na Abishai we biakute ndi Israel n'abali: ma, le, Sọl nēdina n'ura n'ebe anēdebe ub͕ọ-ala, atugide-kwa-ra ube-ya n'ala n'akuku isi-ya: Abnea na ndi Israel nēdina kwa ya buruburu.

8. Abishai we si Devid, Chineke emechibidowo onye-iro-gi nye n'aka-gi ta: ma ub͕u a, biko, ka m'were ube tugide ya n'ala otù ub͕ò, m'gaghi-atu kwa ya nke ub͕ò abua.

9. Devid we si Abishai, Ebibila ya: n'ihi na ònye ka ikpe nāmaghi n'iseti aka-ya megide onye Jehova etere manu?

10. Devid we si, Jehova nādi ndu, Jehova aghaghi itib͕u ya; ma-ọbu ubọchi-ya gābiaru, o we nwua; ma-ọbu na ọ gārida n'agha, ewe kpochapu ya.

11. Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú iseti akam megide onye Jehova etere manu: ma ub͕u a, biko, were ube di n'akuku isi-ya, na ite miri, ka ayi la.

12. Devid we were ube na ite miri site n'akuku isi Sọl; ha we la, ma ọ dighi onye nāhu ha, ọ dighi kwa onye mara, ọ dighi kwa onye nēteta: n'ihi na ha nile nāraru ura; n'ihi na oké ura nke Jehova dakwasiri ha.

13. Devid we gabiga n'ofè ọzọ, guzo n'elu ugwu n'ebe di anya; ebe-mbara n'etiti ha riri nne:

14. Devid we kpọ ndi Israel òkù, kpọ kwa Abnea nwa Nea, si, Ì zaghi, Abnea? Abnea we za, si, Ònye ka i bu nke nākpọ eze òkù?

15. Devid we si Abnea, Ọ̀ bughi nwoke ka i bu? ònye di kwa ka gi n'Israel? n'ìhi gini kwa ka i nēdebeghi onye-nwe-gi, bú eze, nke-ọma? n'ihi na otù onye nime ndi Israel batara ibibi eze, bú onye-nwe-gi.

16. Ọ dighi nma, bú ihe a nke i meworo. Jehova nādi ndu, ndi kwesiri ọnwu ka unu bu, n'ihi na unu edebeghi onye-nwe-unu nke-ọma, bú onye Jehova etere manu. Ma ub͕u a, le ebe ube eze di, na ite miri nke di n'akuku isi-ya.

17. Sọl we mata olu Devid, si, Ọ̀ bu olu-gi bú nka, nwam Devid? Devid we si, Ọ bu olum, onye-nwem, eze.

18. Ọ si kwa, N'ìhi gini kwa ka onye-nwem nāchu orù-ya n'azu? n'ihi na gini ka m'mere? ìhe ọjọ gini di kwa n'akam?

19. Ma ub͕u a, biko, ka onye-nwem, bú eze, nuru okwu nile nke orù-ya. Ọ buru na Jehova arafuwo gi imegidem, Ya nu ísì utọ nke onyinye-inata-iru-ọma: ma ọ buru umu madu, ndi anābu ọnu ka ha bu n'iru Jehova; n'ihi na ha achupuwom ta n'irapara n'aru ihe-nketa Jehova, si, Je, fè chi ọzọ òfùfè.

20. Ma ub͕u a, ka ọbaram ghara ida n'ala pua n'iru Jehova: n'ihi na eze Israel aputawo ichọ otù igwu, dika mb͕e madu nāchu ntá ọkwa n'ugwu.

21. Sọl we si, Emehiewom: lata, nwam Devid: n'ihi na m'gaghi-emejọ gi ọzọ, n'ihi na ndum di oké ọnu-ahia n'anya-gi ta: le, emewom ihe-nzuzu, me kwa ihe nke-uku ri nne n'amaghi-ama.

22. Devid we za, si, Le, ube-gi, eze! ka otù onye nime umu-okorọbia feta kwa, were ya.

23. Jehova gēnyeghachi kwa nwoke ọ bula ezi omume-ya na ikwesi-ntukwasi-obi-ya: ebe Jehova nyeworo gi n'akam ta, ma ekweghm iseti akam imegide onye Jehova etere manu.

24. Ma, le, dika ndu-gi di uku ta n'anyam, ka ndum di uku otú a n'anya Jehova, ka Ọ naputakwam na nkpab͕u nile.

25. Sọl we si Devid, Onye agọziri agọzi ka i bu, nwam Devid: i gēme kwa ihe nke-uku, nwe kwa ike nke-uku. Devid we je n'uzọ-ya, ma Sọl laghachiri n'ebe-ya.

About I. Samuel Chapter 26

Read I. Samuel Chapter 26 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Samuel in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: I. Samuel
Chapter: 26
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading I. Samuel. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading I. Samuel Chapter 26 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is I. Samuel Chapter 26?

I. Samuel Chapter 26 is part of the Book of I. Samuel in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete I. Samuel Chapter 26 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from i Samuel

  1. I. Samuel Chapter 17
  2. I. Samuel Chapter 20
  3. I Samuel Chapter 14
  4. I. Samuel Chapter 15
  5. I Samuel Chapter 17
  6. I. Samuel Chapter 30
  7. I Samuel Chapter 15

Related Chapters & Readings

  1. Maika Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 3
  3. Ndi Galetia Chapter 6
  4. Jeremaia Chapter 47
  5. Ọpupu Chapter 23
  6. II. Ndi-Eze Chapter 4
  7. Abù Ọma Chapter 148
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *