Joshua Chapter 14

For English

Read Joshua Chapter 14 Online

Read Joshua Chapter 14 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Joshua in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Joshua and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Joshua 14

Isi 14

1. Ma ndi bu ihe nke umu Israel ketara n'ala Kenean, ndi Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel, mere ka ha keta;

2. n'ifè-nzà ka ihe-nketa-ha di, dika Jehova nyere iwu n'aka Moses, bayere ebo iteghete ahu, baye-kwa-ra nkera ebo ahu.

3. N'ihi na Moses nyere ihe-nketa nke ebo abua na nkera ebo ahu n'ofè Jọdan: ma o nyeghi ndi Livai ihe-nketa n'etiti ha.

4. N'ihi na umu Josef bu ebo abua, bú Manase na Efraim: ha enyeghi kwa ndi Livai òkè n'ala ahu, ma-ọbughi obodo ufọdu ibi obi, ha na ebe-ita-nri-ha nke diri anu-ulo-ha na àkù ha kpatara.

5. Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu Israel mere, ha we kè ala ahu.

6. Umu Juda we biarue nso Joshua nime Gilgal: Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, we si ya, Gi onwe-gi amawo okwu Jehova gwara Moses, bú onye nke Chineke, bayerem, baye-kwa-ra gi, nime Kedesh-banea.

7. Ọgu arọ abua ka m'b͕ara mb͕e Moses, bú orù Jehova, si na Kedesh-banea zipum iledo ala nka; m'we weghachiri ya okwu dika o si di n'obim.

8. Ma umu-nnem ndi mu na ha rigoro mereka obi lọ ndi Israel miri: ma mu onwem sozuru Jehova, bú Chinekem, n'azu.

9. Moses we ṅua iyi n'ubọchi ahu, si, Ala nke i zọkwasiri ukwu aghaghi iburu gi na umu-gi ihe-nketa rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na i sozuwo Jehova, bú Chinekem, n'azu.

10. Ma ub͕u a, le, Jehova emewo ka m'di ndu, dika O kwuru, ọgu arọ abua na ise ndia, site na mb͕e Jehova gwara Moses okwu a, mb͕e Israel jere ije n'ọzara: ma ub͕u a, le, mu onwem b͕ara ọgu arọ anọ na ise ta.

11. Rue ub͕u a m'di ike ta dika m'di n'ubọchi Moses zigaram: dika ikem si di mb͕e ahu, otú a ka ikem di kwa ub͕u a, ibu agha, na ipu apu, na ibata abata.

12. Ma ub͕u a, nyem ugwu a, nke Jehova kwuru okwu bayere ya n'ubọchi ahu; n'ihi na i nuru n'ubọchi ahu na ndi Anak nọ n'ebe ahu, na obodo di uku nke ewusiri ike: eleghi anya Jehova gānọyerem, m'gānapu kwa ha ala-ha, dika Jehova kwuru.

13. Joshua we gọzie ya; ọ we nye Keleb nwa Jefune Hebron ibu ihe-nketa.

14. N'ihi nka Hebron we ghọrọ Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, ihe-nketa, rue ta; n'ihi na o sozuru Jehova, bú Chineke Israel, n'azu.

15. Ma aha Hebron na mb͕e gara aga bu Kiriat-aba; onye dikarisiri uku n'etiti ndi Anak ka Aba ahu bu. Ala ahụ we rapu ibu agha, di jū.

About Joshua Chapter 14

Read Joshua Chapter 14 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Joshua in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Joshua
Chapter: 14
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Joshua. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Joshua Chapter 14 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Joshua Chapter 14?

Joshua Chapter 14 is part of the Book of Joshua in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Joshua Chapter 14 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from joshua

  1. Joshua Chapter 24
  2. Joshua Chapter 9
  3. Joshua Chapter 12
  4. Joshua Chapter 4
  5. Joshua Chapter 19
  6. Joshua Chapter 7
  7. Joshua Chapter 17

Related Chapters & Readings

  1. Levitikọs Chapter 21
  2. Ọnu-Ọgugu Chapter 6
  3. Abù Ọma Chapter 106
  4. Jeremaia Chapter 23
  5. Rut Chapter 1
  6. Jọn Chapter 8
  7. Joshua Chapter 8
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *