Jeremaia Chapter 37

For English

Read Jeremaia Chapter 37 Online

Read Jeremaia Chapter 37 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jeremaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jeremaia and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Jeremaia 37

Isi 37

1. Zedekaia nwa Josaia we ghọ eze n'ọnọdu Konaia nwa Jehoiakim, onye Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka ọ buru eze n'ala Juda.

2. Ma ọ geghi nti, ya onwe-ya, ma ndi-orù-ya, ma ndi ala ahu, n'okwu nile nke Jehova, nke O kwuru site n'aka Jeremaia, bú onye-amuma.

3. Zedekaia, bú eze, we zìe Jehukal nwa Shelemaia, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, jekuru Jereamia, bú onye-amuma, si, Biko, kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere.

4. Ma Jeremaia nābata nāpu kwa n'etiti ndi Israel: n'ihi na ha etiyeghi ya n'ulo-nkpọrọ.

5. Ọzọ, usu-ndi-agha Fero esiwo n'Ijipt puta: ndi Kaldea ndi nānọchigide Jerusalem n'agha we nuru akukọ-ha, ha we si n'imegide Jerusalem rigo.

6. Okwu Jehova we rue Jeremaia, bú onye-amuma, nti, si,

7. Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Otú a ka unu gāsi eze Juda, onye zìworo unu biakutem ijum ase; Le, usu-ndi-agha Fero, nke putaworo iyere unu aka, gālaghachi n'ala-ya, bú Ijipt.

8. Ndi Kaldea gābiaghachi kwa, buso obodo a agha; ha gēwere kwa ya, sure ya n'ọku.

9. Otú a ka Jehova siri: Unu arafula nkpuru-obi-unu, si, Ndi Kaldea aghaghi isi n'imegide ayi la: n'ihi na ha agaghi-ala.

10. N'ihi na ọ buru na unu etib͕usia usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea ndi nēbuso unu agha, nání ndi adupúru adupú ewe fọdu n'etiti ha, ma ha gēbili, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya, we sure obodo a n'ọku.

11. O rue, mb͕e usu-ndi-agha nke ndi Kaldea siri n'imegide Jerusalem rigo n'ihi usu-ndi-agha Fero,

12. na Jeremaia siri na Jerusalem pua ije ala Benjamin, iketa òkè-ya n'ebe ahu, n'etiti ndi Israel.

13. O rue, mb͕e ọ nọ n'ọnu-uzọ-ama Benjamin, na otù onye-nwe nlekọta nọ n'ebe ahu, onye aha-ya bu Iraija nwa Shelemaia, nwa Hananaia; o we jide Jeremaia, bú onye-amuma, si, Ndi Kaldea ka gi onwe-gi nādakuru.

14. Jeremaia we si, Ọ bu okwu-ugha; adighm-adakuru ndi Kaldea; ma o geghi ya nti: Iraija we jide Jeremaia, me ka ọ biakute ndi-isi.

15. Ndi-isi we wesa Jeremaia iwe, tie ya ihe, tiye ya n'ulo-nkpọrọ, bú ulo Jonatan ode-akwukwọ; n'ihi na ulo ahu ka ha mereri ulo-nkpọrọ.

16. Mb͕e Jeremaia batara n'ulo olùlù, na n'ime-ulo ntà ya, Jeremaia we nọdu n'ebe ahu ọtutu ubọchi;

17. eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n'ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N'aka eze Babilon ka agēnye gi.

18. Jeremaia we si eze, bú Zedekaia, Gini ka m'mehieworo megide gi, ma-ọbu megide ndi-orù-gi, ma-ọbu megide ndi nka, na unu tiyeworo mu onwem n'ulo-nkpọrọ?

19. Òle ebe kwa ka ndi-amuma-unu nọ, bú ndi buru unu amuma, si, Eze Babilon agaghi-abia imegide unu, ma-ọbu imegide ala nka?

20. Ma ub͕u a, biko, nuru, onye-nwem, eze: biko, ka aririọ-amaram da n'iru gi; eme-kwa-la ka m'laghachi n'ulo Jonatan, bú ode-akwukwọ, ka m'we ghara inwu n'ebe ahu.

21. Eze, bú Zedekaia, we nye iwu, ha we tiye Jeremaia n'ogige ulo-nche, nēnye ya otù ob͕e achicha kwa-ubọchi site n'èzí ndi-osi-ite, rue mb͕e achicha nile nke di n'obodo gwusiri. Jeremaia we nọgide n'ulo-nche.

About Jeremaia Chapter 37

Read Jeremaia Chapter 37 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jeremaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Jeremaia
Chapter: 37
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jeremaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Jeremaia Chapter 37 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Jeremaia Chapter 37?

Jeremaia Chapter 37 is part of the Book of Jeremaia in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Jeremaia Chapter 37 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from Jeremaia

  1. Jeremaia Chapter 27
  2. Jeremaia Chapter 22
  3. Jeremaia Chapter 16
  4. Jeremaia Chapter 13
  5. Jeremaia Chapter 38
  6. Jeremaia Chapter 3
  7. Jeremaia Chapter 16

Related Chapters & Readings

  1. Ọnu-Ọgugu Chapter 15
  2. Ndi-Ikpe Chapter 16
  3. Ọpupu Chapter 13
  4. Ndi-Ikpe Chapter 8
  5. Joshua Chapter 14
  6. Mak Chapter 3
  7. Jeremaia Chapter 6
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *