Ilu Chapter 13

For English

Read Ilu Chapter 13 Online

Read Ilu Chapter 13 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ilu 13

Isi 13

1. Nwa nke mara ihe nānu idọ-aka-na-nti nna-ya: Ma onye nākwa emò anughi ibasi-nba-ike.

2. Site na nkpuru nke ọnu-ya ka onye ọ bula gēri ezi ihe: Ma nkpuru-obi ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēri ime-ihe-ike.

3. Onye nēche ọnu-ya nche nēdebe ndu-ya: Ma onye nāsaghepu eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, nbibi gādiri ya.

4. Ọ nāchọsi ike, ma ọ dighi ihe o nwere, bú nkpuru-obi onye-ume-ngwu: Ma nkpuru-obi nke ndi di nkọ, agēme ya ka ọ ma abuba.

5. Okwu-ugha ka onye ezi omume nākpọ asì: Ma onye nēmebi iwu nēsì ísì, we nwe iru-ihere.

6. Ezi omume nēchebe onye zuru okè n'uzọ: Ma nmebi-iwu nēme ka onye-nmehie kpùe iru.

7. O nwere onye nēme onwe-ya ọgaranya, ma ọ dighi ihe ọ bula o nwere: O nwere onye nēme onwe-ya ob͕eye, ma àkù-ya bara uba.

8. Ihe-nb͕aputa nke ndu onye ọ bula bu àkù-ya: Ma ob͕eye anughi ibasi-nba-ike.

9. Ìhè ndi ezi omume nāṅuri ọṅu: Ma oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.

10. Nání na nganga ka ilu-ọ̀gù nāputa: Ma n'aka ndi aduworo ọdu ka amam-ihe di.

11. Àkù nke sitere n'ihe-efu gēbilata: Ma onye ji aka-ya achikọta ihe gāba uba.

12. Nchere anēchere ogologo mb͕e di anya nēme ka obi nāria ọria: Ma osisi nke nēnye ndu ka ihe anāchọsi ike bu, mb͕e ọ biaruworo.

13. Onye nēleda okwu Chineke anya nēmebi onwe-ya: Ma onye nātu egwu ihe enyere n'iwu, onye ahu ka agākwughachi ugwọ.

14. Iwu onye mara ihe bu isi-iyi nke ndu, Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi.

15. Ezi uche nēnye amara: Ma uzọ ndi-nghọb͕u bu nání nkume.

16. Onye ọ bula nke nwere ezi uche ji ihe-ọmuma alu ọlu: Ma onye-nzuzu nāb͕asa uche b͕agọrọ ab͕agọ.

17. Onye-ozi nke nēmebi iwu nādabà n'ihe ọjọ: Ma ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi bu ihe nāgwọ madu.

18. Inọ-n'ob͕eye na nlelì gādiri onye nēzere idọ-aka-na-nti: Ma onye nāriba iba-nba ama ka agāsọpuru.

19. Mb͕e ihe anāchọsi ike mere ọ nātọ nkpuru-obi utọ: Ma ọ bu ihe-árú n'anya ndi-nzuzu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha.

20. Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe: Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ.

21. Ndi-nmehie ka ihe ọjọ nāchu: Ma ndi ezi omume ka agākwughachi ezi ihe.

22. Ezi madu nēme ka umu umu-ya keta ihe-ya; Ma ihe anākpakọbara onye ezi omume ka àkù onye-nmehie bu.

23. Ọtutu ihe-oriri di n'ubi ndi-ob͕eye: Ma o nwere nke anēkpochapu site n'ikpe nābughi ikpe.

24. Onye nēb͕ochi nkpa-n'aka-ya nākpọ nwa-ya asì: Ma onye nāhu ya n'anya nādọsi ya aka na nti ike.

25. Onye ezi omume nēri ihe rue mb͕e afọ juru nkpuru-obi-ya: Ma afọ ndi nēmebi iwu, ihe nākọ ya.

About Ilu Chapter 13

Read Ilu Chapter 13 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ilu
Chapter: 13
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ilu Chapter 13 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ilu Chapter 13?

Ilu Chapter 13 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ilu Chapter 13 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Eklisiastis Chapter 2

Explore More from Ilu

  1. Ilu Chapter 19
  2. Ilu Chapter 3
  3. Ilu Chapter 6
  4. Ilu Chapter 10
  5. Ilu Chapter 7
  6. Ilu Chapter 20
  7. Ilu Chapter 31

Related Chapters & Readings

  1. Ọpupu Chapter 40
  2. Luk Chapter 6
  3. Ezikiel Chapter 30
  4. Jọn Chapter 12
  5. I. Samuel Chapter 1
  6. Abù Ọma Chapter 62
  7. Jeremaia Chapter 8
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *