Read II. Ihe Emere Chapter 13 Online
Read II. Ihe Emere Chapter 13 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ihe Emere in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Ihe Emere and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
II. Ihe Emere 13
Isi 13
1. N'arọ nke iri-na-asatọ nke eze, bú Jeroboam, ka Abaija malitere ibu eze Juda.
2. Arọ atọ ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Maikaīa nwa-nwayi Uriel nke Gibea. Agha di kwa n'etiti Abaija na Jeroboam.
3. Abaija we were usu-ndi-agha, bú ndi-dike n'agha, bū agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ abua na uzọ iri, bú ndi arọputara arọputa: ma Jeroboam were orú nnù ndikom ọgu uzọ ise, bú ndi arọputara arọputa, do agha n'usoro imegide ya, ha bu ndi-dike bu dìnkpà.
4. Abaija we bilie n'elu ugwu Zemaraim, nke di n'ugwu Efraim, si, Nurunum, Jeroboam na Israel nile;
5. ọ̀ bughi ọlu-unu imara na Jehova, bú Chineke Israel, nyere Devid ala-eze ibu onye-isi Israel rue mb͕e ebighi-ebi, ọbuná ya na umu-ya, n'ọb͕ub͕a-ndu nnú?
6. Ma Jeroboam nwa Nebat, bú orù Solomon nwa Devid, ebiliwo, we nupu isi imegide onye-nwe-ya.
7. Ndikom efu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ, b͕a onwe-ha ume imegide Rehoboam nwa Solomon, ma Rehoboam bu nwata di kwa nrò n'obi, o meghi kwa onwe-ya ka ọ di ike n'iru ha.
8. Ma ub͕u a unu onwe-unu nāsi na unu gēme onwe-unu ka unu di ike n'iru ala-eze Jehova n'aka umu Devid; unu onwe-unu bu kwa ìgwè bara uba, n'etiti unu ka umu-ehi ọla-edo di kwa, bú nke Jeroboam mere nye unu ibu chi.
9. Ùnu akwapughi ndi-nchu-àjà Jehova, bú umu Eron, na ndi Livai, mere onwe-unu ndi-nchu-àjà dika ndi ala ọzọ nēme? onye ọ bula nke nābia iwere nwa oke-ehi na ebulu asa meju aka-ya, ọ gāghọ-kwa-ra ndi nābughi Chineke onye-nchu-àjà.
10. Ma ayi onwe-ayi, Jehova bu Chineke-ayi, ayi arapughi kwa Ya; ndi-nchu-àjà nēje-kwa-ra Jehova ozi, bú umu Eron, ndi Livai nọ kwa n'ije-ozi-ha:
11. ha nēsure-kwa-ra Jehova àjà-nsure-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ kwa-ututu kwa-anyasi, ya na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda di iche iche me: achicha edoro n'usoro di kwa n'elu table ahu di ọcha: ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo na oriọna-ya nile di kwa, inwu enwu kwa-anyasi: n'ihi na ayi onwe-ayi nēdebe ihe-ndebe Jehova, bú Chineke-ayi; ma unu onwe-unu arapuwo Ya.
12. Ma, le, Chineke nọyere ayi, dika onye-isi-ayi, Ya na ndi-nchu-àjà-Ya, ndi chiri opì ahu, bú nke eji fù ka ha we dasie udà ike, ifù ha ka ha we dasie uda ike megide unu. Umu Israel, unu ebusola Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, agha; n'ihi na ọ gaghi-agara unu nke-ọma.
13. Ma Jeroboam mere ka ndi nēru nbì b͕a buruburu ibia n'azu ha: ha we di n'iru Juda, ma ndi nēru nbì di n'azu ha.
14. Juda we le anya n'azu, ma, le, anēbuso ha agha n'iru na azu: ha we tikue Jehova nkpu, ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì.
15. Ndikom Juda we tie nkpu: o rue, mb͕e ndikom Juda tiri nkpu, na Chineke tib͕uru Jeroboam na Israel nile n'iru Abaija na Juda.
16. Umu Israel we si n'iru Juda b͕alaga: Chineke we nye ha n'aka-ha.
17. Abaija na ndi-ya we tib͕ue ha ọtutu ntib͕u: orú nnù ndi eb͕uru eb͕u ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, we dapu n'Israel.
18. Ewe weda umu Israel n'ala na mb͕e ahu, umu Juda we b͕a ume, n'ihi na ha dabere na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.
19. Abaija we chuso Jeroboam, nara ya obodo, bú Bet-el na umu-obodo-ya, na Jeshana na umu-obodo-ya, na Efron na umu-obodo-ya.
20. Jeroboam enweghi kwa ike ọzọ n'ubọchi Abaija: Jehova we tib͕ue ya, o we nwua.
21. Abaija we me onwe-ya ka ọ di ike, o we lutara onwe-ya ndinyom iri na anọ, mua orú umu-ndikom na abua, na umu-ndinyom iri na isi.
22. Ma ihe nile Abaija mere nke fọduru, na uzọ-ya nile, na okwu-ya nile, edewo ha n'akukọ Ido, bú onye-amuma.
About II. Ihe Emere Chapter 13
Read II. Ihe Emere Chapter 13 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ihe Emere in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: II. Ihe Emere
Chapter: 13
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Ihe Emere. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading II. Ihe Emere Chapter 13 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is II. Ihe Emere Chapter 13?
II. Ihe Emere Chapter 13 is part of the Book of II. Ihe Emere in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete II. Ihe Emere Chapter 13 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
Explore More from ii ihe emere
- II. Ihe Emere Chapter 9
- II. Ihe Emere Chapter 27
- II. Ihe Emere Chapter 32
- II. Ihe Emere Chapter 10
- II. Ihe Emere Chapter 17
- II. Ihe Emere Chapter 36
- II. Ihe Emere Chapter 15