Read Jeremaia Chapter 18 Online
Read Jeremaia Chapter 18 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jeremaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jeremaia and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Jeremaia 18
Isi 18
1. Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,
2. Bilie, rida n'ulo ọkpu-ite, ọ bu kwa n'ebe ahu ka M'gēme ka i nu okwum.
3. M'we rida n'ulo ọkpu-ite, ma, le, ọ nēje ozi-ya n'elu wheel-ya abua.
4. Ewe bibie ihe onye ahu ji urọ akpu n'aka ọkpu-ite ahu, o we kpu kwa ya ọzọ ihe di iche, dika o ziri ezi n'anya ọkpu-ite ahu ikpu ya.
5. Okwu Jehova we ruem nti, si,
6. Àpughm ime unu dika ọkpu-ite a mere, unu ulo Israel? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Le, dika urọ si di n'aka ọkpu-ite a, otú a ka unu onwe-unu di n'akam, unu ulo Israel.
7. N'otù ntabi-anya ahu mb͕e M'nēkwu okwu bayere mba ọ bula, iropu ya na ikwada ya na ime ka ọ la n'iyì;
8. ọ buru na mba ahu nke M'kwuworo okwu bayere ya esi n'ihe ọjọ ya chigharia, M'gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke M'chère ime ya.
9. Ọzọ, n'otù ntabi-anya ahu mb͕e M'nēkwu okwu bayere mba ọ bula, baye-kwa-ra ala-eze ọ bula, iwu ya dika ulo na iku ya dika osisi;
10. ọ buru na o me ihe jọrọ njọ n'anyam, we ghara ige nti n'olum, M'gēchèghari kwa n'ezi ihe ahu, nke M'siri na M'gēji me ya nma.
11. Ma ub͕u a, biko, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu onwem nākpu ihe ọjọ megide unu, nēchè kwa èchìchè megide unu: biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me kwa ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma.
12. Ma ha siri, Ntukwasi-obi adigh: n'ihi na èchìchè nile nke ayi ka ayi nējeso, ayi nēme kwa, onye ọ bula ihe isi-ike nke obi ọjọ ya.
13. N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Biko, juanu n'etiti mba nile, si, Ònye nuworo ihe di ka ndia? ihe jọb͕uru onwe-ya nke-uku ka nwa-ab͕ọghọ Israel nke nāmaghi nwoke meworo.
14. Snow nke Lebanon, ọ̀ gārapu oké nkume nke ọhia? ma-ọbu miri oyi nke si n'ala ọzọ erù, ọ̀ gātada?
15. N'ihi na ndim echezọwom, ihe-efu ka ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye; ha we me ka ha su ngọngọ n'uzọ nile ha, bú uzọ-ije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, ije ije n'okporo-uzọ di iche iche, bú uzọ anātulighi atuli;
16. ime ka ala-ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ mb͕e ebighi-ebi; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, o gēfufe kwa isi-ya.
17. Dika ifufe Iru-anyanwu ka M'gāchusa ha n'iru onye-iro; azu, ọ bughi iru, ka M'gēme ka hu ha n'ubọchi nhuju-anya-ha.
18. Ha we si, Bianu, ka ayi chè èchìchè megide Jeremaia; n'ihi na iwu agaghi-esi n'ebe onye-nchu-àjà nọ la n'iyì, ndum-ọdu agaghi-esi kwa n'ebe onye mara ihe nọ, okwu agaghi-esi kwa n'ebe onye-amuma nọ. Bianu, ka ayi were ire-ayi tib͕ue ya, ma ka ayi ghara iṅa nti n'okwu-ya nile.
19. Ṅam nti, Jehova, ge kwa nti olu ndi nālusom ọ̀gù.
20. Àgākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe? n'ihi na ha egwuworo nkpuru-obim olùlù. Cheta nguzo m'guzoro n'iru Gi ikwu ezi ihe bayere ha, ime ka ọnuma-Gi si n'aru ha laghachi.
21. N'ihi nka were umu-ha nye oké unwu, rara kwa ha nye n'aka mma-agha; ka ndinyom-ha ghọ kwa ndi b͕ara aka nwa na ndi di-ha nwuru; ka ndikom-ha ghọ kwa ndi ọnwu b͕uru, ka umu-okorọbia-ha ghọ ndi etib͕uru na mma-agha n'agha.
22. Ka anuru iti-nkpu nke gēsite n'ulo nile ha, mb͕e I gēme ka usu ndi nāpunara madu ihe biakwasi ha na mberebe: n'ihi na ha egwuwo olùlù inwudem, ha ezobewo-kwa-ra ukwum abua ib͕udu di iche iche.
23. Ma Gi onwe-gi, Jehova, amawo ndum-ọdu nile ha imegidem ime ka m'nwua; ekpuchila ajọ omume-ha, ehichapu-kwa-la nmehie-ha n'iru Gi: ma ka ha ghọ ndi emeworo ka ha su ngọngọ n'iru Gi; meso ha na mb͕e iwe-Gi.
About Jeremaia Chapter 18
Read Jeremaia Chapter 18 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jeremaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Jeremaia
Chapter: 18
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jeremaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Jeremaia Chapter 18 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Jeremaia Chapter 18?
Jeremaia Chapter 18 is part of the Book of Jeremaia in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Jeremaia Chapter 18 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from Jeremaia
- Jeremaia Chapter 41
- Jeremaia Chapter 45
- Jeremaia Chapter 28
- Jeremaia Chapter 29
- Jeremaia Chapter 1
- Jeremaia Chapter 15
- Jeremaia Chapter 46