Read Emos Chapter 3 Online
Read Emos Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Emos in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Emos and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Emos 3
Isi 3
1. Nurunu okwu a nke Jehova kwuworo megide unu, umu Israel, megide ab͕uru ahu nile nke M'mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, si,
2. Nání unu ka M'maworo n'etiti ab͕uru nile nke uwa: n'ihi nka ka M'gēji ajọ omume nile unu leta unu.
3. Màdu abua gāyikọta je ije, ma ọ buru na ha ezuteghi?
4. Ọdum, ọ̀ gāb͕ọ uja n'oké ọhia, mb͕e ọ dighi anu ọ nādọb͕u? nwa-ọdum, ọ̀ gēme ka olu-ya si n'ebe-obibi-ya da, ma ọ buru na o nwudeghi ihe?
5. Nnunu, ọ̀ gādabà n'ib͕udu di n'ala, ebe ọ nādighi ọnyà esiri ya? ib͕udu, ò gēsi n'ala kpọhiepu, ma o jideghi ihe ọ bula?
6. Àgāfù opì-ike n'obodo, ndi-ya aghara ima jijiji? ihe ọjọ, ọ̀ gādi n'obodo, ma Jehova emeghi ya?
7. N'ezie Onye-nwe-ayi Jehova agaghi-eme ihe, ma ọ buru na O kpugheghi ìzù nzuzo Ya nye ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma-Ya.
8. Ọdum ab͕ọwo uja, ọ̀ bu onye nāgaghi-atu egwu? Onye-nwe-ayi Jehova ekwuwo, ọ̀ bu onye nāgaghi-ebu amuma?
9. Menu ka anuru ya n'elu ulo-elu nile n'Ashdod, na n'elu ulo-elu nile n'ala Ijipt, si, Zukọtanu n'elu ugwu nile nke Sameria, hu ọb͕ub͕a-aghara di ọtutu nke di n'etiti ya, na nmeb͕u di iche iche nke di nime ya.
10. N'ihi na ha amaghi ime ihe ziri ezi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ndi nākpakọba ihe-ike na ipunara-madu-ihe n'ulo-elu nile ha.
11. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Onye-nkpab͕u gādi, ọbuná buruburu ala-gi: ọ gēme kwa ka ike-gi danari gi, agāluta kwa ulo-elu gi nile n'agha.
12. Otú a ka Jehova siri: Dika onye-ọzùzù-aturu si anaputa ọlu-ukwu abua, ma-ọbu iberibe nti, n'ọnu ọdum; otú a ka agānaputa umu Israel ndi nānọdu ala nime Sameria na nkuku ihe-ndina, na n'elu nkisi ọma nke ebe anēdina.
13. Nurunu, b͕anu àmà imegide ulo Jekob; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta.
14. N'ihi na n'ubọchi M'gēji njehie nile nke Israel leta ya, n'ubọchi ahu ka M'gēji kwa nmehie ebe-ichu-àjà nke Bet-el leta ha, agēbipu kwa mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu, ha ewe da n'ala.
15. M'gēti kwa ma ulo mb͕e oyi ma ulo mb͕e okpom-ọku ihe; ulo nile nke ejiri ọdu wu gāla kwa n'iyì, ọtutu ulo gāgwusi kwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
About Emos Chapter 3
Read Emos Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Emos in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Emos
Chapter: 3
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Emos. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Emos Chapter 3 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Emos Chapter 3?
Emos Chapter 3 is part of the Book of Emos in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Emos Chapter 3 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Emos Chapter 1
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Eklisiastis Chapter 2