Ilu Chapter 3

For English

Read Ilu Chapter 3 Online

Read Ilu Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ilu 3

Isi 3

1. Nwam, echezọla iwum; Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu:

2. N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu, Na udo, ka ha gātukwasiri gi.

3. Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n'olu-gi; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi:

4. Chọta kwa amara na ezi uche N'anya Chineke na madu.

5. Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi:

6. N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.

7. Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi; Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi:

8. Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi, Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile.

9. Sọpuru Jehova site n'àkù-gi, Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile:

10. Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ, Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu.

11. Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova: Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya:

12. N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba; Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.

13. Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu, Ya na madu nke nēnweputa nghọta.

14. N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha, Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma.

15. Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby: Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya.

16. Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya; N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di.

17. Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ, Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo.

18. Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka: E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.

19. Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa; O doziri elu-igwe site na nghọta.

20. Ejiri ihe-ọmuma-Ya kewa ob͕u-miri nile, Mbara-ígwé nile ji kwa ya atuda igirigi.

21. Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Chebe nzube-ihe na ìzùzù;

22. Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu, Bu-kwa-ra olu-gi amara.

23. Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi, I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi,

24. Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu: E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.

25. Atula egwu site n'oké egwu mberede, Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia:

26. N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi, Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya.

27. Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri, Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya.

28. Asila madu-ibe-gi, Je, lata, Echi ka m'gēnye gi; Mb͕e ọ di n'aka-gi.

29. Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi, Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi.

30. Gi na madu esela okwu n'efu, Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ.

31. Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo, Arọputa-kwa-la otù efu n'uzọ-ya nile.

32. N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu: Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di.

33. Ọbubu-ọnu Jehova di n'ulo onye nēmebi iwu; Ma ebe-obibi ndi ezi omume ka Ọ nāgọzi.

34. Ọ buru na ọ bu ndi nākwa emò ka Ya onwe-ya nākwa emò, Ma ọ bu ndi di ume-ala n'obi ka Ọ nēnye amara.

35. Nsọpuru ka ndi mara ihe gēketa; Ma ndi-nzuzu nēbuli nlelì.

About Ilu Chapter 3

Read Ilu Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ilu
Chapter: 3
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ilu Chapter 3 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ilu Chapter 3?

Ilu Chapter 3 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ilu Chapter 3 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Eklisiastis Chapter 2

Explore More from Ilu

  1. Ilu Chapter 5
  2. Ilu Chapter 29
  3. Ilu Chapter 9
  4. Ilu Chapter 7
  5. Ilu Chapter 4
  6. Ilu Chapter 31
  7. Ilu Chapter 17

Related Chapters & Readings

  1. Abù Ọma Chapter 84
  2. I. Ihe Emere Chapter 8
  3. Esta Chapter 8
  4. Jọn Chapter 5
  5. Ọpupu Chapter 27
  6. Deuteronomi Chapter 27
  7. Abù Ọma Chapter 45
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *