Read I. Ndi-Eze Chapter 19 Online
Read I. Ndi-Eze Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi-Eze in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of I. Ndi-Eze and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
I. Ndi-Eze 19
Isi 19
1. Ehab we gosi Jezebel ihe nile Elaija mere, na ihe nile otú o were mma-agha b͕ue ndi-amuma nile.
2. Jezebel we zigara Elaija onye-ozi, si, Ka chi me otú a, ka ha me kwa ihe ọzọ otú a, ma asi na emeghm ndu-gi ka ọ di ka ndu otù onye nime ha dika mb͕e a echi.
3. O we tua egwu, bilie, je n'ihi ndu-ya, biarue Bia-sheba, nke Juda nwere, o me ka nwa- okorọbia-ya nọdu n'ebe ahu.
4. Ma ya onwe-ya jere ije otù ubọchi n'ọzara, bia nọdu n'okpuru otù osisi broom: ọ riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, O zuwo; ub͕u a, Jehova, wepu ndum; n'ihi na mu onwem adighi nma kari nnam-hà.
5. O dina, raru ura n'okpuru otù osisi broom; ma, le, mọ-ozi nēmetu ya aka, si ya, Bilie, rie ihe.
6. O we legide anya, ma, le, ob͕e achicha, nke esiri n'elu nkume di ọku, na ite miri di n'akuku isi-ya. O rie, ṅu kwa, dina kwa ọzọ.
7. Mọ-ozi nke Jehova we biaghachi nke ub͕ò abua, metu ya aka, si, Bilie, rie ihe; n'ihi na ije riri nne kari ike-gi.
8. O we bilie, rie ihe, ṅu kwa miri, je n'ike ihe-oriri ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali rue ugwu Chineke, bú Horeb.
9. Ọ bia n'ebe ahu rue ọb͕à, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu; ma, le, okwu Jehova ruru ya nti, si ya, Gini ka i nēme n'ebe a, Elaija?
10. Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi: ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya.
11. Ọ si, Pua, guzo n'ugwu n'iru Jehova. Ma, le, Jehova nāgabiga, oké ifufe di ike nāb͕ọwa kwa ugwu nile, nētipia kwa nkume di elu nile n'iru Jehova; ma Jehova anọghi n'ifufe ahu: ma mb͕e ifufe gasiri ala-ọma-jijiji mara; ma Jehova anọghi n'ala-ọma-jijiji ahu:
12. ma mb͕e ala-ọma-jijiji gasiri ọku we di; ma Jehova anọghi n'ọku ahu: ma mb͕e ọku gasiri olu ntà nke di ezi nwayọ dara.
13. O rue, mb͕e Elaija nuru ya, na ọ huchiri iru-ya n'uwe-nwuda-ya, pua, guzo n'ọnu-uzọ ọb͕à ahu. Ma, le, olu ruru ya nti, si, Gini ka i nēme n'ebe a, Elaija?
14. Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke usu-ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi; ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya.
15. Jehova we si ya, Je, laghachi n'uzọ-gi rue ọzara Damaskọs: ma mb͕e i biara, i gēte Hazael manu ibu eze Siria:
16. i gēte kwa Jihu, bú nwa Nimshi, manu ibu eze Israel: i gēte kwa Elaisha, bú nwa Shefat, nke Ebel-mehola, ibu onye-amuma n'ọnọdu gi.
17. Ọ gēru kwa, na onye nēwepuga onwe-ya na mma-agha Hazael, Jihu gēme ka ọ nwua: onye nēwepuga kwa onwe-ya na mma-agha Jihu, Elaisha gēme ka ọ nwua.
18. Ma M'gēme ka nnù madu iri-na-asa na ọgu iri fọdu n'Israel, bú ikperè nile nke anēb͕ughi nye Beal, na ọnu ọ bula nke nēsutughi ya.
19. O si n'ebe ahu je, chọta Elaisha nwa Shefat, ma onye ahu nēme ka ehi-ya dọghari ihe eji gwu ala ubi, orú ehi na anọ ejikọrọ abua abua di n'iru ya, ya onwe-ya nọye-kwa-ra ehi abua nke-iri-na-abua: Elaija we gabiga jekuru ya, wusara ya uwe-nwuda-ya.
20. O we rapu ìgwè ehi-ya, b͕aso Elaija n'azu, si, Biko, ka m'sutu nnam na nnem ọnu, m'gējeso kwa gi. Ọ si ya, Laghachi; n'ihi na ọ̀ bu gini ka m'meworo gi?
21. O we si n'iso ya laghachi, were ehi abua ahu ejikọrọ n'otù, b͕ue ha, o were kwa ihe ehi ahu ji alu ọlu sie anu-ha, o nye ndi ahu, ha rie. O bilie, jeso Elaija, we jere ya ozi.
About I. Ndi-Eze Chapter 19
Read I. Ndi-Eze Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi-Eze in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: I. Ndi-Eze
Chapter: 19
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading I. Ndi-Eze. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading I. Ndi-Eze Chapter 19 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is I. Ndi-Eze Chapter 19?
I. Ndi-Eze Chapter 19 is part of the Book of I. Ndi-Eze in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete I. Ndi-Eze Chapter 19 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
Explore More from i-ndi-eze
- I. Ndi-Eze Chapter 12
- I. Ndi-Eze Chapter 11
- I. Ndi-Eze Chapter 8
- I. Ndi-Eze Chapter 13
- I. Ndi-Eze Chapter 3
- I. Ndi-Eze Chapter 7
- I. Ndi-Eze Chapter 9