Aisaia Chapter 43

For English

Read Aisaia Chapter 43 Online

Read Aisaia Chapter 43 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Aisaia and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Aisaia 43

Isi 43

1. Ma ub͕u a, otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Jekob, Nke kpuwo-kwa-ra gi, Israel: Atula egwu, n'ihi na ab͕aputawom i; akpọwom i n'aha-gi, nkem ka i bu.

2. Mb͕e i nāgabiga nime miri, gi ka M'gānọyere; mb͕e i nāgabiga nime osimiri, ha agaghi-erùchapu gi: mb͕e i nēje ije n'ọku, ọku agaghi-aru gi; ire-ọku agaghi-ere kwa gi ọku.

3. N'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, na Onye Nsọ nke Israel, na onye-nzọputa-gi; enyewom Ijipt ka ọ buru ihe-nb͕aputa-gi, enyewom Etiopia na Seba n'ọnọdu gi.

4. Ebe i ghọworo ihe di oké ọnu-ahia n'anyam, ebe asọpuruwo-kwa-ra gi, ebe Mu onwem huwokwara gi n'anya; ya mere M'gēnye madu n'ọnọdu gi, nye kwa ndi di iche iche n'ọnọdu ndu-gi.

5. Atula egwu; n'ihi na gi ka M'nọyere: M'gēme ka nkpuru-gi si n'Ọwuwa-anyanwu bia, M'gēsi kwa n'Ọdida-anyanwu chikọta gi;

6. M'gāsi Ugwu, Nye; si kwa Ndida, Eb͕ochila: me ka umum ndikom si n'ebe di anya bia, gi me kwa ka umum ndinyom si na nsọtu uwa bia;

7. onye ọ bula nke anākpọ n'aham, nke M'kèwo-kwa-ra nye nsọpurum; akpuwom ya; e, emewom ya.

8. Me ka ndi kpuru ìsì nwere anya abua puta, ha na ndi nti chiri ma ha nwere nti.

9. Achikọtawo mba nile n'otù, kpọkọta kwa ndi nile di iche iche: ònye n'etiti ha gēgosi nka, me ka ayi nuru ihe mbu nile? Ka ha weputa ndi-àmà-ha, ka ewe gua ha na ndi ezi omume: ma-ọbu ka ha nuru, si, Ezi-okwu.

10. Unu onwe-unu bu ndi-àmàm, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na orùm nke M'rọputara: ka unu we mara, kwerem, ghọta na Mu onwem bu Onye ahu: ọ dighi chi ọzọ eburu Mu onwem uzọ kpu, ma ọ bu nke gēsom n'azu.

11. Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Jehova; ọ dighi kwa onye-nzọputa di ma-ọbughi náním.

12. Mu onwem egosiwo, zọputa kwa, me kwa ka anuru, ọ dighi kwa chi ala ọzọ di n'etiti unu: unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Mu onwem bu kwa Chineke.

13. Ọzọ, site n'ubọchi ta Mu onwem bu Ya; ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam: anamalu ọlu, ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu?

14. Otú a ka Jehova siri, bú onye-nb͕aputa-unu na Onye Nsọ nke Israel: n'ihi unu ka M'ga-eziga ozi na Babilon, M'gēme kwa ka ha rida dika ndi-ọ̀só, ha nile, ọbuná ndi Kaldea, n'ugbọ nile nke iti-nkpu-ọṅù-ha.

15. Mu onwem bu Jehova, Onye Nsọ unu, na Onye kèworo Israel, na Eze-unu.

16. Otú a ka Jehova siri, bú Onye ahu Nke nākwa uzọ n'oké osimiri na okporo-uzọ nime miri di ike;

17. Nke nēme ka ub͕ọ-ala na inyinya na usu-ndi-agha na dìnkpà puta; n'otù ka ha nēdinakọta, ha agaghi-ebili; ha anyu a, dika ogho-oriọna ka emenyuworo ha emenyu:

18. Unu echetala ihe mbu nile, unu atughari-kwa-la ihe nile nke mb͕e ochie n'obi.

19. Le, anameme ihe ọhu; ub͕u a ka ọ gēpú; ùnu agaghi-ama ya? e, M'gēme ka uzọ di n'ọzara, me kwa ka osimiri di iche iche di n'ala tọb͕ọrọ n'efu.

20. Anu ọhia gāsọpurum, bú nkita-ọhia na enyi-nnunu: n'ihi na enyewom miri n'ọzara na osimiri di iche iche n'ala tọb͕ọrọ n'efu, ime ka ndim ṅua, bú ndi M'rọputara:

21. ndi M'kpuworo nye Onwem, akukọ otutom ka ha gākọ.

22. Ma ọ bughi Mu ka i kpọkuworo, Jekob; kama ikem agwuwo gi, Israel.

23. I kpughi aturu nke àjà-nsure-ọku-gi nile biakutem; i jighi kwa àjà-gi nile sọpurum. Ejighm onyinye-inata-iru-ọma me ka i fè òfùfè, ejighkwam frankincense me ka ike gwu gi.

24. I jighi ego zutaram uda calamus, i jighi kwa abuba nke àjà-gi nile me ka afọ jubigam ókè: kama i jiwo nmehie-gi nile me ka M'fè òfùfè, i jiwo ajọ omume-gi nile me ka ike gwum.

25. Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu Nke nēchichapu njehie-gi nile n'ihi Mu onwem; M'gaghi-echeta kwa nmehie-gi nile.

26. Chetaram; ka ayi kpekọ ikpe: gi onwe-gi kọ akukọ-gi, ka ewe gua gi n'onye ezi omume.

27. Nna-gi mbu mehiere, ndi-nsughari-gi ejehiewo kwa megidem.

28. M'gēme kwa ndi-isi di nsọ ka ha ghara idi nsọ, nye kwa Jekob ka ọ buru ihe ewezugara ka ebibie ya, nye kwa Israel ka ọ buru ihe-nkwulu.

About Aisaia Chapter 43

Read Aisaia Chapter 43 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Aisaia
Chapter: 43
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Aisaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Aisaia Chapter 43 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Aisaia Chapter 43?

Aisaia Chapter 43 is part of the Book of Aisaia in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Aisaia Chapter 43 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from Aisaia

  1. Aisaia Chapter 15
  2. Aisaia Chapter 50
  3. Aisaia Chapter 45
  4. Aisaia Chapter 48
  5. Aisaia Chapter 6
  6. Aisaia Chapter 30
  7. Aisaia Chapter 4

Related Chapters & Readings

  1. Levitikọs Chapter 8
  2. Ezra Chapter 5
  3. Abù Ọma Chapter 60
  4. Ezikiel Chapter 14
  5. Mak Chapter 3
  6. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 15
  7. II. Pita Chapter 2
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *