II. Ihe Emere Chapter 25

For English

Read II. Ihe Emere Chapter 25 Online

Read II. Ihe Emere Chapter 25 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ihe Emere in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Ihe Emere and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

II. Ihe Emere 25

Isi 25

1. Amazaia b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jehoadan nke Jerusalem.

2. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, nání na o weghi obi zuru okè me ya.

3. O rue, mb͕e ala-eze di ike n'ebe ọ nọ, na o b͕uru ndi-orú-ya ndi tib͕uru eze, bú nna-ya.

4. Ma o meghi ka umu-ha nwua, kama o mere dika ihe edeworo n'iwu n'akwukwọ Moses, nke Jehova nyere n'iwu, si, Ndi bu nna agaghi-anwu n'ọnọdu umu-ha, umu agaghi-anwu kwa n'ọnọdu ndi bu nna-ha; kama onye ọ bula gānwu nime nmehie nke aka ya.

5. Amazaia we chikọta Juda, guzo ha dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, nye ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, nye kwa ndi-isi usu ọgu ndikom ise, bú Juda na Benjamin nile: o we gukọta ha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, o we hu na ha di orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēji ube na ọta.

6. O we were ọgu talent ọla-ọcha ise go orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù iri, ha bu ndi-dike bu dìnkpà, site n'Israel.

7. Ma onye nke Chineke biakutere ya, si, Eze, ka usu-ndi-agha Israel ghara iso gi bia; n'ihi na Jehova anọyeghi Israel, bú umu nile nke Efraim.

8. Otú ọ di, gi onwe-gi bia, me ihe, di ike ibu agha: Chineke gēme ka i ghara iso ngọngọ n'iru onye-iro-gi; n'ihi na ike di nime Chineke iye aka na ime ka asu ngọngọ.

9. Amazaia we si onye nke Chineke ahu, Ma gini ka ayi gēme bayere ọgu talent ise ahu nke m'nyeworo usu ndi nāpunara madu ihe nke Israel? Onye nke Chineke we si, Jehova nwere ihe inye gi nke bara uba kari.

10. Amazaia we kewapu ha, bú usu ndi nāpunara madu ihe nke siri n'Efraim biakute ya, ka ha laghachi n'ebe-ha: iwe-ha we di ọku nke-uku megide Juda, ha we laghachi n'ebe-ha n'iwe di ọku.

11. Amazaia we me onwe-ya ka ọ di ike, o we duru ndi-ya, je Ndagwurugwu Nnù, tib͕ue umu Sia, orú nnù ndikom na nnù ise.

12. Ma orú nnù ndikom na nnù ise ọzọ ndi di ndu, umu Juda dọtara ha n'agha, me ka ha bia n'elu nkume di elu, ha we si n'elu nkume di elu ahu tuda ha, ewe tupia ha nile.

13. Ma ndikom nke usu ndi nāpunara madu ihe nke Amazaia zilagara, ka ha ghara iso ya je agha, madere n'obodo nile nke Juda, site na Sameria we rue Bet-horon, tib͕ue nnù madu asa na ọgu iri nime ha, luta ihe-nluta bara uba n'agha.

14. O rue, mb͕e Amazaia latara site na ntib͕u ndi Edom, na ọ chibatara chi nke umu Sia, guzoro ha onwe-ya ibu chi, we kpọ isi ala n'iru ha, surere ha ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ.

15. Iwe Jehova we di ọku imegide Amazaia, o we zigara ya onye-amuma, nke siri ya, N'ìhi gini ka i chọworo chi nke ndi ahu, ndi nānaputaghi ndi-ha n'aka-gi?

16. O rue, mb͕e ọ nāgwa ya okwu, na eze siri ya, Ọ̀ bu iburu eze onye nādu ọdu ka ayi meworo gi? ra aka; n'ìhi gini ka agētib͕u gi? Onye-amuma ahu we ra aka, si, Amawom na Chineke ezubewo ibibi gi, n'ihi na i mewo nka, i geghi kwa idu-ọdum nti.

17. Amazaia, bú eze Juda, we nara idu-ọdu, zigara Joash nwa Jehoahaz, nwa Jihu, bú eze Israel, ozi, si, Bia, ka ayi lerita onwe-ayi anya n'iru.

18. Joash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu.

19. I siwo, Le, i tib͕uwo Edom; obi-gi we bulie gi elu isọpuru onwe-gi: ub͕u a nọdu n'ulo-gi; n'ìhi gini ka i nākpali onwe-gi n'ihe ọjọ, ka i we da, gi onwe-gi, na Juda soro gi?

20. Ma Amazaia anughi; n'ihi na Chineke ka o sitere, ka O we nye ha n'aka ndi-iro-ha, n'ihi na ha chọrọ chi Edom.

21. Joash, bú eze Israel, we rigo; ya onwe-ya na Amazaia, bú eze Juda, we lerita onwe-ha anya n'iru na Bet-shemesh, nke Juda nwere.

22. Ewe tib͕ue Juda n'iru Israel; ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya.

23. Joash, bú eze Israel, we Jide Amazaia, bu eze Juda, nwa Joash nwa Jehoahaz, nime Bet-shemesh, me ka ọ biarue Jerusalem, we tipue mb͕idi Jerusalem site n'ọnu-uzọ-ama Efraim rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, nnù cubit.

24. Ọ chiri ọla-edo na ọla-ọcha nile, na ihe nile ahutara n'ulo Chineke n'aka Obed-edom, na àkù nile nke ulo eze, na ndi edoro na mbe, o we laghachi na Sameria.

25. Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, we di ndu mb͕e ọnwu Joash nwa Jehoahaz, bú eze Israel, gasiri, arọ iri na ise.

26. Ma ihe nile nke Amazaia mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel?

27. Ma site na mb͕e Amazaia siri n'iso Jehova wezuga onwe-ya ha kekọtara nkekọta-madu imegide ya nime Jerusalem; o we b͕alaga na Lekish: ha we ziga ichuso ya rue Lekish, me ka ọ nwua n'ebe ahu.

28. Ha we bute ya n'elu inyinya, lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Juda.

About II. Ihe Emere Chapter 25

Read II. Ihe Emere Chapter 25 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ihe Emere in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: II. Ihe Emere
Chapter: 25
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Ihe Emere. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading II. Ihe Emere Chapter 25 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is II. Ihe Emere Chapter 25?

II. Ihe Emere Chapter 25 is part of the Book of II. Ihe Emere in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete II. Ihe Emere Chapter 25 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from ii ihe emere

  1. II. Ihe Emere Chapter 10
  2. II. Ihe Emere Chapter 8
  3. II. Ihe Emere Chapter 12
  4. II. Ihe Emere Chapter 22
  5. II. Ihe Emere Chapter 21
  6. II. Ihe Emere Chapter 29
  7. II. Ihe Emere Chapter 6

Related Chapters & Readings

  1. Ezikiel Chapter 24
  2. I. Samuel Chapter 15
  3. II. Ndi Kọrint Chapter 1
  4. Abù Ọma Chapter 14
  5. Ọpupu Chapter 17
  6. Aisaia Chapter 50
  7. Ndi-Ikpe Chapter 12
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *