Job Chapter 6

For English

Read Job Chapter 6 Online

Read Job Chapter 6 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Job 6

Isi 6

1. Job we za, si,

2. Biko, ka atùa nkpasu-iwem nke-ọma, Ka ha buli kwa nmebim n'ihe-ọtùtù n'otù!

3. N'ihi na ub͕u a ọ di arọ́ kari ájá oké osimiri nile: N'ihi ya ka okwum nile sihieworo uzọ.

4. N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem, Nke ńsí-ha ka mọm nāṅu Ihe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem.

5. Inyinya-ibu-ọhia, ò nēti nkpu n'elu ahihia ndu? Ma-ọbu ehi, ò nēti nkpu n'elu nri agwara agwara nye ya?

6. Ànēri ihe nke nādighi utọ n'ire, ma nnú adighi ya? Ma-ọbu ùtọ di na nke di ọcha nime àkwá?

7. Ihe nkpuru-obim nāju imetu, Ihe ndia di ka nrim nke mebiri emebi.

8. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na aririọm abia; Asi kwa na Chineke enyem olile-anyam!

9. Ọbuná ka Chineke kwe izọpiam; Ka Ọ tọpu aka-Ya, bipum.

10. Nkasi-obim we nādiru ub͕u a; M'we wulie elu n'ihe-nb͕u nke nādighi-enwe ọmiko: N'ihi na ezoghm okwu-ọnu nile nke Onye Nsọ.

11. Gini bu ikem na m'gēche? Gini bu kwa ọgwugwum, na m'gēme ka ndum di ogologo?

12. Ọ̀ bu ike nkume ka ikem bu? Ma-ọbu anu-arum, ọ̀ bu ọla?

13. Ọ̀ bughi na iye-akam adighi nimem? Na enupuwo kwa nzube-ihe n'ebe m'nọ?

14. Onye obi nālọ ya miri kwesiri inwe ebere site n'aka eyì-ya; Bú onye nārapu kwa egwu Onye Nke puru ime ihe nile.

15. Umu-nnem aghọb͕uwom dika miri-iyi, Dika ebe miri-iyi nke nērùbiga nērù;

16. Nke nēji nji n'ihi ice, Nke snow nēzó onwe-ya nime ha:

17. Na mb͕e anēme ka ha di ọku ha tọb͕ọro n'efu: Mb͕e ọ di ọku, ha tapuworo n'ọnọdu-ha.

18. Ndi-ije nke uzọ-ha nēchighari onwe-ha; Ha nārigo n'ebe tọb͕ọrọ n'efu, we la n'iyì.

19. Ndi-ije nke Tima legidere anya, Usu-ndi-ije nke Sheba lere anya ha.

20. Ihere mere ha n'ihi na ha tukwasiri ha obi; Ha biaruru ebe ahu, iru-ha we nwughari n'ihi ihere.

21. N'ihi na ub͕u a unu abughi ihe; Unu nāhu ihe-ujọ, we tua egwu.

22. Ọ̀ bu na m'siri, Nyenum ihe? Ma-ọbu, Nyenu ihe-iri-ngo n'ihim site n'àkù-unu?

23. Ma-ọbu, Wepuganum n'aka onye-nkpab͕u? Ma-ọbu, B͕aputanum n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji?

24. Zínum ihe, mu onwem gāb͕a kwa nkiti: Me-kwa-num ka m'ghọta ihe m'mehieworo n'amaghi-ama.

25. Le ka okwu-ọnu nke ziri ezi si di irè! Ma gini ka iba-nba nke si n'ọnu-unu puta nābara?

26. Ùnu nēchè na unu gābara okwu nba? Ebe okwu-ọnu nile nke onye nādighi-atukwasi obi-ya n'ihe di ka ifufe.

27. Ọzọ kwa, n'aru nwa-nb͕ei ka unu nēfekwasi nzà, Unu nēwere kwa eyì-unu zua ahia.

28. Ma ub͕u a kwenu ichem iru; Ọ̀ bu kwa n'iru unu ka m'gēkwu okwu-ugha?

29. Biko, chigharianu, ka ajọ omume ghara idi; E, chigharianu ọzọ, ezi omumem di nime ya.

30. Ọ̀ di ajọ omume di n'irem? Òkpo-ọnum agaghi-amata ihe anāchọsi ike?

About Job Chapter 6

Read Job Chapter 6 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Job
Chapter: 6
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Job Chapter 6 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Job Chapter 6?

Job Chapter 6 is part of the Book of Job in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Job Chapter 6 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 7
  6. Esta Chapter 4
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Job

  1. Jób Chapter 23
  2. Job Chapter 15
  3. Job Chapter 22
  4. Job Chapter 41
  5. Job Chapter 1
  6. Job Chapter 11
  7. Job Chapter 15

Related Chapters & Readings

  1. Aisaia Chapter 45
  2. Abù Ọma Chapter 90
  3. Job Chapter 38
  4. Abù Ọma Chapter 111
  5. I. Timọti Chapter 6
  6. Aisaia Chapter 32
  7. Jenesis Chapter 16
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *