Read Job Chapter 30 Online
Read Job Chapter 30 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Job 30
Isi 30
1. Ma ub͕u a ha achìwom ọchì, bú ndi bu nwata karim, Ndi m'juru ido ndi bu nna-ha n'etiti nkita nke ìgwè ewu na aturu nkem.
2. Ọzọ, ike aka-ha, gini ka ọ gābaram? Ndi ike nke agadi-ha laworo n'iyì.
3. N'ihi ihe-ukọ na n'ihi agu ha bu ndi nēnweghi ike imu nwa: Ha bu ndi nēwere ezé-ha kọ̀cha ala ọkpọ-nku, nke bu nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu na mb͕e gara aga.
4. Ndi nānyajipu mallow n'akuku umu-osisi; Nkpọrọgwu osisi broom bu kwa nri-ha.
5. Anēsi n'etiti madu chupu ha; Ha nētiso ha nkpu dika anētiso onye-ori.
6. N'ebe nākpata ima-jijiji nke ndagwurugwu ka ha nāghaghi ibi, Bú ọnu atùru n'ájá na n'oké nkume.
7. N'etiti umu-osisi ka ha nēti nkpu dika inyinya-ibu; N'okpuru akuba ka ha nējikọta onwe-ha.
8. Ha bu umu ndi-nzuzu, e, umu nke ndi nēnweghi aha; Apiapuwo ha n'ala.
9. Ma ub͕u a aghọwom abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara, M'bu-kwa-ra ha okwu ha nēkwughari.
10. Ha nākpọm ihe-árú, ha nọ n'ebe di anya site n'ebe m'nọ, Ha eb͕ochighi kwa onwe-ha n'ibu ọnu-miri n'irum.
11. N'ihi na Ọ tọpuwo udọ̀-Ya, we wedam n'ala, Ha achipuwo kwa bridle n'irum.
12. N'aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili; Ukwum abua ka ha nupuworo, We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem.
13. Ha emebiwo uzọm, Ha bara nmebim urù, Bú ndi nēnweghi onye nēyere ha aka.
14. Dika ọ bu na nitpú sara mbara, otú a ka ha nābia: N'okpuru ntikpọ ahu ka ha turuworo onwe-ha n'arum.
15. Ihe-egwu echighariwo imegidem, Ha nāchu ọkakam dika ifufe; Dika igwe-oji ka nzọputam gabigawo-kwa-ra.
16. Ma ub͕u a anāwusi nkpuru-obim nimem dika miri; Ubọchi nweda-n'ala nējidem.
17. N'abali ọkpukpum nēsiwasi nādapu n'arum, Ihe-nb͕u nke nārọm árú anọghi n'otù ebe.
18. Site n'iba-uba nke ike nke ọriam uwem nēnwoghari: Dika ọnu uwe-imem ka ọ nēkem buruburu.
19. Ọ tubàwom n'apiti, M'we yie ájá na ntu.
20. Anametiku Gi, ma I dighi-azam: Eguzorom ọtọ, I we lekwasim anya.
21. I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere: I nēji ume aka-Gi kpab͕uem.
22. I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya, I ne-atugharim n'elu ebili nmirì.
23. N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru, Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.
24. N'ezie ọ bughi ihe etikpọrọ etikpọ ka Ọ gēseti aka Ya imegide; Ọ buru na ọ di n'ọdida-ya, madu gētiku Chineke n'ihi ihe ndia.
25. Àkwaghm ákwá n'ihi onye ubọchi-ya siri ike? Ò wuteghi nkpuru-obim bayere ob͕eye?
26. Mb͕e m'lere anya ezi ihe, ihe ọjọ bia-kwa-ra; M'we chere ìhè, ma ọchichiri biara.
27. Ngiri-afọm nile nāb͕o ab͕ọ, ha anọghi jū; Ubọchi nweda-n'ala nile abiawo n'irum.
28. Ejeghariwom nēji nji, ọ bughi anyanwu mere ya: Ebiliwom ọtọ nime nkpọkọta madu, tikue Chineke.
29. M'ghọworo nkita-ọhia nwa-nne, Ghọ-kwa-ra enyi-nnunu eyì.
30. Akpukpọ-arum di oji, nādapu n'arum, Ọkpukpum erewo kwa ọku site n'ikpọ-nku.
31. Ubọ-akwaram we ghọ iru-újú, Ọ̀jàm ghọ-kwa-ra olu ndi nākwa ákwá.
About Job Chapter 30
Read Job Chapter 30 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Job
Chapter: 30
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Job Chapter 30 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Job Chapter 30?
Job Chapter 30 is part of the Book of Job in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Job Chapter 30 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Esta Chapter 1
- Aisaia Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Esta Chapter 5
- Esta Chapter 4
- Esta Chapter 2
- Esta Chapter 7