Ọnu-Ọgugu Chapter 7

For English

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 7 Online

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 7 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ọnu-Ọgugu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ọnu-Ọgugu 7

Isi 7

1. O rue, n'ubọchi Moses guzosiri ebe-obibi ahu, te ya manu, do ya nsọ, na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, mb͕e ọ tesiri ha manu, do ha nsọ;

2. na ndi-isi Israel, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, wetara ihe nso; ndi ahu bu ndi-isi ebo nile, ndi ahu bu ndi nēguzo n'isi ndi agukọtara agukọta:

3. ha we weta onyinye-ha iji biaru nso n'iru Jehova, ugbala isi nwere ihe-okpukpu, na ehi iri na abua; otù ugbala diri ndi-isi abua, otù ehi di-kwa-ra otù onye: ha we weta ha nso n'iru ebe-obibi ahu.

4. Jehova we gwa Moses okwu, si,

5. Nara ha n'aka-ha, ka ha we buru ihe iji fè òfùfè nke ulo-ikwū nzute; i gēwere kwa ha nye ndi Livai, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di.

6. Moses we nara ugbala nile na ehi nile, nye ha ndi Livai.

7. Ugbala abua na ehi anọ ka o nyere umu Giashon, dika òfùfè-ha si di:

8. ugbala anọ na ehi asatọ ka o nye-kwa-ra umu Merari, dika òfùfè-ha si di, n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.

9. Ma ọ nyeghi umu Kohat: n'ihi na òfùfè nke ebe nsọ dikwasi ha; n'ubu ka ha nēbu ya.

10. Ndi-isi we weta nso onyinye irara ebe-ichu-àjà nye Chineke n'ubochi etere ya manu, ndi-isi ahu we weta nso onyinye-ha iji biaru nso n'iru ebe-ichu-àjà.

11. Jehova we si Moses, Otù onye-isi otù ubọchi, otù onye-isi otù ubọchi, ka ha gēweta nso onyinye-ha iji biaru nso, bayere ira ebe-ichu-àjà nye Chineke.

12. Onye nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso n'ubọchi mbu bu Nahshon nwa Aminadab, nke ebo Juda:

13. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

14. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ;

15. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

16. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

17. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Nahshon nwa Aminadab.

18. N'ubọchi nke-abua Netanel nwa Zua, onye-isi Isaka, wetara ihe-ya nso:

19. o wetara nso onyinye-ya iji biaru nso: otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

20. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

21. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

22. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

23. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Netanel nwa Zua.

24. N'ubọchi nke-atọ onye-isi umu Zebulun nwere, bú Eliab nwa Hilon, wetara ihe-ya nso;

25. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

26. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

27. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

28. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

29. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Eliab nwa Hilon.

30. N'ubọchi nke-anọ onye-isi umu Reuben nwere, bú Elizua nwa Shedeua, wetara ihe-ya nso:

31. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

32. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

33. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

34. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

35. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù, arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Elizua nwa Shedeua.

36. N'ubọchi nke-ise onye-isi umu Simeon nwere, bú Shelumiel nwa Zurishadai, wetara ihe-ya nso:

37. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

38. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

39. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

40. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

41. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Shelumiel nwa Zurishadai.

42. N'ubọchi nke-isi onye-isi umu Gad nwere, bú Eliasaf nwa Deuel, wetara ihe-ya nso:

43. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

44. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure- ọku nēsì ísì utọ;

45. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

46. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

47. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Eliasaf nwa Deuel.

48. N'ubọchi nke-asa onye-isi umu Efraim nwere, bú Elishama nwa Amihud, wetara ihe-ya nso:

49. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

50. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

51. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

52. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

53. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Elishama nwa Amihud.

54. N'ubọchi nke-asatọ onye-isi umu Manase nwere, bú Gameliel nwa Pedahzua, wetara ihe-ya nso:

55. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ iri na n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

56. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

57. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

58. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

59. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Gameliel nwa Pedahzua.

60. N'ubọchi nke-iteghete onye-isi umu Benjamin nwere, bú Abidan nwa Gideoni, wetara ihe-ya nso:

61. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

62. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ;

63. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure ọku;

64. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

65. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Abidan nwa Gideoni.

66. N'ubọchi nke-iri onye-isi umu Dan nwere, bú Ahieza nwa Amishadai, wetara ihe-ya nso:

67. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù- ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

68. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

69. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu; nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

70. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie:

71. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Ahieza nwa Amishadai.

72. N'ubọchi nke iri-na-otù onye-isi umu Asha nwere, bú Pagiel nwa Ọkran, wetara ihe-ya nso:

73. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọlaọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

74. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

75. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

76. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

77. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Pagiel nwa Ọkran.

78. N'ubọchi nke-iri-na-abua onye-isi umu Naftali nwere, bú Ahira nwa Inan, wetara ihe-ya nso:

79. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

80. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputura n'ihe-nsure-ọku; nēsì ísì utọ;

81. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

82. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

83. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Ahira nwa Inan.

84. Nka bu onyinye nke ira ebe-ichu-àjà nye Chineke, n'ubọchi etere ya manu, site n'aka ndi-isi Israel: afere ọla-ọcha iri na abua, na ọkwa-nwusa ọla-ọcha iri na abua, na ngaji ọla-edo iri na abua:

85. afere ọla-ọcha ọ bula di ọgu shekel isi na iri n'ọtùtù, ọkwa-nwusa ọ bula di kwa ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù: ọla-ọcha nile nke ihe nile di nnù shekel isi n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di;

86. ngaji ọla-edo iri na abua ahu, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ, ha di shekel iri shekel iri n'ọtùtù-ha, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ọla-edo nile nke ngaji di ọgu shekel isi n'ọtùtù-ha:

87. ehi nile iji chu àjà-nsure-ọku di oke-ehi iri na abua, ebulu-ya di iri na abua, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di iri na abua, na onyinye-inata-iru-ọma-ha: nkpi iji chu àjà-nmehie di iri na abua:

88. ehi nile nke ihe àjà nke àjà-udo di orú oke-ehi na anọ, ebulu-ya di ọgu atọ, nkpi-ya di ọgu atọ, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di ọgu atọ. Nka bu onyinye nke irara ebe-ichu-àjà nye Chineke, mb͕e etesiri ya manu.

89. Ma mb͕e Moses bara n'ulo-ikwū nzute ikpayere Ya uka, ọ we nu Olu ahu ka Ọ nāgwa ya okwu site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, site n'etiti cherubim abua ahu: O we gwa ya okwu.

About Ọnu-Ọgugu Chapter 7

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 7 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ọnu-Ọgugu
Chapter: 7
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ọnu-Ọgugu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ọnu-Ọgugu Chapter 7 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ọnu-Ọgugu Chapter 7?

Ọnu-Ọgugu Chapter 7 is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ọnu-Ọgugu Chapter 7 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from ọnu ọgugu

  1. Ọnu-Ọgugu Chapter 33
  2. Ọnu-Ọgugu Chapter 22
  3. Ọnu-Ọgugu Chapter 13
  4. Ọnu-Ọgugu Chapter 29
  5. Ọnu-Ọgugu Chapter 17
  6. Ọnu-Ọgugu Chapter 32
  7. Ọnu-Ọgugu Chapter 9

Related Chapters & Readings

  1. Eklisiastis Chapter 3
  2. Aisaia Chapter 23
  3. Abù Ọma Chapter 92
  4. Ọpupu Chapter 27
  5. II. Samuel Chapter 7
  6. Deuteronomi Chapter 17
  7. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 12
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *